Nyochaa › Isiokwu › Aghụghọ na ngbanwe ọdịdị
Nkọwa ndị na-eju anya
Aghụghọ na ngbanwe ọdịdị nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (45), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Nʼime Jenesis
- Agwọ gwara nwanyị ahụ: “Unu agaghị anwụ”Jen 3:4
Amaokwu ndị ahụ
Jen 3:4Agwọ gwara nwanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ.
- Ebram rịọrọ Serai ka ọ sị na ya bụ nwanne ya nwanyịJen 12:13
Amaokwu ndị ahụ
Jen 12:13Gwa ha na ị bụ nwanne m nwanyị, ka ha meso m mmeso ọma nʼihi gị. Ha ga-echebekwa m ndụ nʼihi gị.”
- Na Gera, Ebraham kwuru ọzọ banyere Sera: “Ọ bụ nwanne m nwanyị”Jen 20:2
Amaokwu ndị ahụ
Jen 20:2Nʼebe ahụ, Ebraham kwuru maka Sera, nwunye ya, sị “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Abimelek, eze Gera, ziri ozi kpọrọ Sera.
- Aịzik kwuru na Ribeka bụ nwanne ya nwanyị, nʼihi egwu na ndị ikom ahụ ga-egbu yaJen 26:7
Amaokwu ndị ahụ
Jen 26:7Mgbe ndị obodo ahụ jụrụ ya banyere nwunye ya, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Ọ tụrụ ụjọ ị sị ha, “Nwunye m ka ọ bụ,” O chere nʼobi ya sị, “Ndị ikom obodo a nwere ike gbuo m nʼihi Ribeka. Nʼihi na Ribeka nʼonwe ya mara mma ile anya.”
- Ribeka yikwasịrị Jekọb uwe Ịsọ na akpụkpọ ewuJen 27:15–16
Amaokwu ndị ahụ
Jen 27:15–16Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb. O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.
- Jekọb gwara nna ya, onye anya ya adịghị ahụ ụzọ: “Abụ m Ịsọ, ọkpara gị”Jen 27:1, Jen 27:19
Amaokwu ndị ahụ
Jen 27:1Mgbe Aịzik ghọrọ agadi, nʼoge anya ya na-adịghị ahụzi ụzọ nke ọma, ọ kpọrọ Ịsọ ọkpara ya, sị ya, “Nwa m nwoke.” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.”
Jen 27:19Jekọb zara nna ya sị ya, “Abụ m Ịsọ, ọkpara gị. Emeela m ihe ị sị m mee. Biko bilie ka i rie anụ m gbutere nʼọhịa, ka gị onwe gị gọzie m.”
- Leban nyere Lịa nʼọnọdụ Rechel; Jekọb: “Gịnị mere i ji ghọgbuo m?”Jen 29:23, Jen 29:25
- Jekọb gbapụrụ na nzuzo site nʼebe Leban nọ na-agwaghị yaJen 31:20
Amaokwu ndị ahụ
Jen 31:20Jekọb ghọkwara Leban onye Aram aghụghọ nʼihi na ọ gwaghị ya na ọ na-agbapụ ọsọ.
- Rechel zoro arụsị ezinaụlọ Leban nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu kamel, nọkwasị haJen 31:34–35
Amaokwu ndị ahụ
Jen 31:34–35Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ. Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
- Ụmụ Jekọb rịọrọ ndị ikom Shekem ka e bie ha ugwu, emesịa busoo obodo ahụ aghaJen 34:13, Jen 34:15, Jen 34:25
Amaokwu ndị ahụ
Jen 34:13Ma ụmụ Jekọb jiri aghụghọ zaa Shekem na Hamọ nna ya mgbe ha na-agwa ha okwu, nʼihi na e merụrụ Daịna nwanne ha nwanyị.
Jen 34:15Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu.
Jen 34:25O ruo nʼụbọchị nke atọ, mgbe ọnya ugwu ha na-egbu ha mgbu, ụmụ ndị ikom Jekọb abụọ, Simiọn na Livayị, ụmụnne Daịna, jiri mma agha ha pụkwuru ndị bi nʼobodo ahụ na-atụghị anya na ihe dị otu a ga-eme, gbuo ndị ikom niile nọ nʼobodo ahụ.
- Ụmụnne ahụ bịanyere uwe Josef nʼọbara ewu, gosi Jekọb yaJen 37:31–33
Amaokwu ndị ahụ
Jen 37:31–33Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya. Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.” Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.”
- Tama kpuchiri onwe ya, Juda wee chee na ọ bụ nwanyị akwụnaJen 38:14–15
Amaokwu ndị ahụ
Jen 38:14–15O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya.
- Josef mere ka e zoo iko ọlaọcha ya nʼakpa BenjaminJen 44:1–2
Amaokwu ndị ahụ
Jen 44:1–2Mgbe ahụ Josef nyere odibo nọ nʼụlọ ya iwu sị, “Gbajuo akpa ndị ikom ndị a nri. Tinyere ha nri nke onye ọbụla nʼime ha nwere ike ibu, tinyekwa ego nke onye ọbụla nʼime ha kwụrụ nʼọnụ akpa ya. Ma tinye iko ọlaọcha m nʼime ọnụ akpa onye nke nta nʼime ha. Tinyekwa ego ọ kwụrụ nʼihi nri ọ zụrụ nʼime akpa ya.” Odibo a mere dịka Josef gwara ya.
Ndị ikpe na ndị eze
- Ndị Gibiọn bu akpa mere ochie na achịcha kpụrụ akpụ, na-asị na ha si ala dị anyaJos 9:4–6
Amaokwu ndị ahụ
Jos 9:4–6ha sitere nʼaghụghọ chọọ ụzọ ha ga-esi zọpụta onwe ha. Ha zipụrụ ndị ozi, ndị bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa mere ochie, na karama akpụkpọ mere ochie, nke a duchiri ebe dị iche iche nʼahụ ha. Ndị ahụ yikwasịrị nʼụkwụ ha akpụkpọụkwụ kara nka nke a kwachiri akwachi, na uwe mere nnọọ ochie. Achịcha niile ha ji bụ nri ha, kpọrọ nkụ maakwa ebu. Mgbe ha bịaruru nʼebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal, ha jekwuuru Joshua, gwa ya na ndị Izrel okwu sị ha, “Anyị si nʼala dị anya bịa. Ugbu a, biko anyị chọrọ ka anyị na unu gbaa ndụ.”
- Ụbọchị atọ mgbe e mesịrị ọgbụgba ndụ ahụ, Izrel matara na ha bụ ndị agbataobiJos 9:16
Amaokwu ndị ahụ
Jos 9:16Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site na mgbe ụmụ Izrel na ndị Gibiọn gbara ndụ, ndị Izrel nụrụ na ndị Gibiọn bụ ndị agbataobi ha, ndị bi ha nso.
- Jael kpọbatara Sisera, nye ya mmiri ara, emesịa gbuo ya mgbe ọ na-arahụ ụraNkp 4:18–21
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 4:18–21Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya. Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Akpịrị na-akpọ m nkụ, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” O meghere karama akpụkpọ mmiri ara ehi, nye ya ihe ọṅụṅụ, jirikwa akwa ahụ sachie ya. Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’ ” Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ.
- Mikal tọgbọrọ arụsị nwere ajị ewu nʼihe ndina Devid: “Ahụ esighị ya ike”1Sa 19:13–16
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 19:13–16Emesịa, Mikal kwagharịrị ihe ndina Devid, were ihe a kpụrụ akpụ tụkwasị nʼelu ya, werekwa akwa kpuchie ya, tinye ihe ajị ewu nʼebe isi ya. Mgbe ndị agha ahụ bịaruru ijide Devid na ịkpụgara ya Sọl, Mikal gwara ha sị, “Ahụ esighị ya ike.” Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.” Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ.
- Devid gwara onye nchụaja na Nob na ya na-arụ ọrụ nzuzo nke eze1Sa 21:1–2
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 21:1–2Devid jere nʼobodo Nob ịhụ Ahimelek, onye nchụaja. Ahimelek mara jijiji mgbe ọ hụrụ Devid. Ọ sịrị Devid, “Gịnị mere naanị gị ji bịa? Gịnị mere o nweghị onye so gị?” Devid zara Ahimelek, onye nchụaja sị, “Eze ziri m ozi dị mkpa, ma sị m, ‘Ka onye ọbụla ghara ịma ihe ọbụla banyere ozi a m na-eziga gị.’ Ma banyere ụmụ okorobịa m, agwala m ha ebe ha ga-ezute m.
- Devid busoro ndị Geshua agha, ma gwa Akish na ọ busoro Negev Juda agha1Sa 27:8, 1Sa 27:10
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 27:8Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt)
1Sa 27:10Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”
- Amnọn mere ka ọ na-arịa ọrịa ka Tama bịakwute ya2Sa 13:6
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 13:6Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.”
- Joab zigara otu nwanyị maara ihe si Tekoa ka o mee ka onye na-eru ụjụ2Sa 14:2–3
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 14:2–3Joab zigara ozi na Tekoa, si nʼebe ahụ kpọta otu nwanyị maara ihe. Mgbe nwanyị ahụ bịaruru, Joab gwara ya sị, “Mee onwe gị dịka onye na-eru ụjụ. Yiri akwa mkpe, etekwala mmanụ otite. Kpaa agwa dịka nwanyị nọ nʼiru ụjụ ogologo oge. Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya.
- Absalọm rịọrọ ka ọ gaa Hebrọn mezuo nkwa, malite nnupu isi nʼebe ahụ2Sa 15:7, 2Sa 15:10
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 15:7Mgbe afọ anọ gasịrị, Absalọm bịakwutere eze rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m jee Hebrọn mezuoro Onyenwe anyị nkwa m kwere ya.
2Sa 15:10Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’ ”
- Hushaị, enyi Devid, kelere Absalọm: “Ka eze dị ogologo ndụ”2Sa 16:16
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 16:16Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.”
- Absalọm họọrọ ndụmọdụ Hushaị karịa nke Ahitofel2Sa 17:14
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 17:14Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma Onyenwe anyị ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ.
- Otu agadi onye amụma ghara ụgha ka o kpọlata onye nke Chineke nʼụlọ ya1Ez 13:18
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 13:18Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’ ” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.)
- Nwunye Jeroboam gbanwere ọdịdị ya; Ahija, onye anya ya adịghị ahụ ụzọ, kpọrọ ya aha1Ez 14:2, 1Ez 14:4, 1Ez 14:6
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 14:2Nʼihi ya, Jeroboam sịrị nwunye ya, “Gaa, jikwaa onwe gị nʼụzọ mmadụ na-enweghị ike ịmata na ị bụ nwunye Jeroboam. Ị ga-ejekwa Shaịlo, Ahija onye amụma nọ nʼebe ahụ, bụ nwoke ahụ gwara m okwu na m ga-abụ eze ndị nke a.
1Ez 14:4Nwunye Jeroboam mere ihe o kwuru, o biliri jee nʼụlọ Ahija na Shaịlo. Ahija bụ agadi nwoke nʼoge a. Ọ naghị ahụkwa ụzọ nʼihi nka ọ kara.
1Ez 14:6Mgbe Ahija nụrụ ụda nzọ ụkwụ ya ka ọ na-abata nʼọnụ ụzọ, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Bata, nwunye Jeroboam. Gịnị mere i ji jie ejiji dịka onye ọzọ? Enwere m akụkọ ọjọọ m ga-akọrọ gị
- Gehazi chepụtara ozi Ịlaisha ka o nweta ọlaọcha site nʼaka Neeman2Ez 5:22, 2Ez 5:25
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 5:22“E, udo dị,” ka Gehazi zara, “Onyenwe m zitere m ka m gwa gị, ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ nʼetiti ndị amụma si nʼugwu Ifrem bịakwute m. Biko nye ha otu talenti ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.’ ”
2Ez 5:25Mgbe ọ batara nʼụlọ guzo nʼihu nna ya ukwu, Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i si na-abịa Gehazi?” Ọ zara, “Ohu gị ejeghị ebe ọbụla.”
- Jehu kpọsara oke aja maka Baal iji kpọkọta ndị na-efe ya2Ez 10:19
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 10:19Ugbu a, kpọkọtaanụ ndị amụma Baal niile, ndị niile na-efe ya, na ndị nchụaja ya niile. Hụnụ na onye ọbụla nʼime ha bịara, nʼihi na a ga-eme oke mmemme ịchụ aja nye Baal. Onye ọbụla e lere anya ya nʼebe ahụ, ma a hụghị ya, agaghị adị ndụ.” Ma Jehu ji aghụghọ nʼihi ka ọ laa ndị a na-efe Baal nʼiyi.
- Sanbalat kpọrọ Nehemaya ka ọ bịa na ndagwurugwu Ono, na-achọ imerụ ya ahụNeh 6:2
Amaokwu ndị ahụ
Neh 6:2Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.” Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ.
- Otu nwoke e goro ego gbara Nehemaya ume ka o zoo nʼụlọnsọNeh 6:10, Neh 6:12
Amaokwu ndị ahụ
Neh 6:10Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.”
Neh 6:12Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya.
Nʼime Agba Ọhụrụ
- Herọd gwara ndị amamihe na ya onwe ya chọkwara ịbịa kpọọ isiala nye Nwatakịrị ahụMat 2:8
Amaokwu ndị ahụ
Mat 2:8O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.”
- Ndịisi nchụaja chọrọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide JisọsMak 14:1
Amaokwu ndị ahụ
Mak 14:1Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya.
- A kwụrụ ndị agha ụgwọ ka ha sị na ndị na-eso ụzọ zuru ozu yaMat 28:12–13
Amaokwu ndị ahụ
Mat 28:12–13Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego, sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’
- Ananayas na Safaịra debere ụfọdụ nʼego ala ha rereỌrụ 5:1–2, Ọrụ 5:8
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 5:1–2Ma otu nwoke a na-akpọ Ananayas na nwunye ya bụ Safaịra rekwara ala nke ha. Na nkwekọrịta ya na nwunye ya, o zoro ụfọdụ ego site nʼego ha retara nʼala ha ahụ, weta nke fọdụrụ bịa tọgbọ nʼụkwụ ndị ozi.
Ọrụ 5:8Pita jụrụ ya, gwa m, “ọ bụ ego ole a ka gị na di gị retara ala ahụ?” Ọ sịrị, “E, ọ bụ ego ole ahụ ka anyị retara ya.”
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.