Nkọwa ndị na-eju anya
Aha ọhụrụ nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (16), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Ihe atụ
- Ebram ghọrọ EbrahamJen 17:5
Amaokwu ndị ahụ
Jen 17:5Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.
- Serai ghọrọ SeraJen 17:15
Amaokwu ndị ahụ
Jen 17:15Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera.
- Jekọb ghọrọ IzrelJen 32:28
Amaokwu ndị ahụ
Jen 32:28Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.”
- Rechel gụrụ nwa ya Ben-Oni; nna ya kpọrọ ya BenjaminJen 35:18
Amaokwu ndị ahụ
Jen 35:18Ma tupu Rechel ekuo ume ikpeazụ, nʼihi na ọ na-anwụ, ọ kpọrọ aha nwa ọhụrụ ahụ Ben-Oni, ma nna ya kpọrọ ya Benjamin.
- Fero gụrụ Josef aha Zafenat-PaniaJen 41:45
Amaokwu ndị ahụ
Jen 41:45Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania. Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On, ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt.
- Mosis gụrụ Hoshea nwa Nun aha JoshuaỌnụ 13:16
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 13:16Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.)
- Naomi: akpọla m Naomi, kpọọ m MaraRut 1:20
Amaokwu ndị ahụ
Rut 1:20Ma Naomi zara ha sị, “Unu akpọkwala m Naomi, kama kpọọnụ m Mara, nʼihi na Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ndụ m jupụta nʼihe ilu.
- A gụkwara Solomọn Jedidaya2Sa 12:24–25
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 12:24–25Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma Onyenwe anyị hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya. O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi Onyenwe anyị.
- Fero Neko gụgharịrị Eliakịm aha Jehoiakim2Ez 23:34
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 23:34Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ.
- Eze Babilọn gụgharịrị Matanaya aha Zedekaya2Ez 24:17
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 24:17O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya.
- Daniel, Hananaya, Mishael, Azaraya: Belteshaza, Shedrak, Mishak, AbednegoDan 1:7
Amaokwu ndị ahụ
Dan 1:7Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.
- A kpọrọ Saimọn Sefas, ya bụ PitaJọn 1:42
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 1:42Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).
- A gụrụ Jemis na Jọn Boanajis, ụmụ egbe eluigweMak 3:17
Amaokwu ndị ahụ
Mak 3:17Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya (ndị ọ gụgharịrị aha Boanajis, nke pụtara “ụmụ egbe eluigwe”),
- A kpọrọ Josef onye Saiprọs Banabas, nwa nke nkasiobiỌrụ 4:36
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 4:36Josef onye ikwu Livayị, onye sitere na Saiprọs, onye ndị ozi na-akpọ Banabas (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”).
- Sọl, onye a na-akpọkwa PọlỌrụ 13:9
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 13:9Ma Sọl, onye aha ya bụkwa Pọl, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, legidere ya anya
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.