Nyochaa › Isiokwu › Ndị nnyopụta
Nkọwa ndị na-eju anya
Ndị nnyopụta nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (34), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Ndị nnyopụta iri na abụọ
- Mosis zipụrụ otu onyendu site nʼebo ọbụla ka ha ledo KenanỌnụ 13:2, Dit 1:23
- Iwu e nyere ha: hụ ma ndị mmadụ dị ike maọbụ adịghị ike, dị ole ma ọ bụ ọtụtụỌnụ 13:17–18
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 13:17–18Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu. Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole.
- Ha si nʼọzara Zin ruo RehobỌnụ 13:21
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 13:21Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.
- Na Eshkọl, mmadụ abụọ ji osisi buru otu ụyọkọ mkpụrụ vaịnịỌnụ 13:23
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 13:23Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.
- Ha lọghachiri mgbe iri ụbọchị anọ gasịrịỌnụ 13:25
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 13:25Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.
- Akụkọ ha: ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ma obodo ya e wusiri ikeỌnụ 13:27–28
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 13:27–28Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ. Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ.
- Kaleb: “anyị nwere ike imeri ha” Ndị ọzọ ekwenyeghịỌnụ 13:30–31
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 13:30–31Ma Kaleb kwuru okwu mere ka obi sie ndị Izrel ike nʼoge a ha guzoro nʼihu Mosis sị ha, “Ka anyị gaanụ otu ihu nweta ala ahụ. Nʼihi na anyị nwere ike imeri ha.” Ma ndị nledo ahụ soro ya gaa zara sị, “Anyị enweghị ike ibu agha megide ndị a; ha dị ike karịa anyị.”
- “Nʼanya anyị, anyị dịka ụkpana”Ọnụ 13:33
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 13:33Anyị hụrụ ndị Nefilim nʼebe ahụ (ndị bụ ụmụ ụmụ Anak, ndị sitere na ndị Nefilim). Nʼanya anyị, anyị dịka ụkpana nʼebe ha nọ, otu a ka anyị dịkwa nʼanya ha.”
- Iri ụbọchị anọ nke nnyopụta ghọrọ iri afọ anọ nʼọzara, otu afọ maka otu ụbọchịỌnụ 14:34
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 14:34Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya.
- Nʼime ndị nnyopụta ahụ, naanị Joshua na Kaleb fọdụrụ ndụỌnụ 14:36–38
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 14:36–38Ya mere ndị ahụ Mosis zipụrụ iledo ala ahụ, ndị ahụ lọtara mee ka ọgbakọ ụmụ Izrel tamuo ntamu nʼihi akụkọ ọjọọ ha gbasara. Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị. Nʼime ndị ikom gara ledoo ala ahụ anya, ọ bụ naanị Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune fọdụrụ ndụ.
Jeriko na Rehab
- Joshua zipụrụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo site na Shitim; ha nọrọ nʼụlọ RehabJos 2:1
Amaokwu ndị ahụ
Jos 2:1Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ.
- Rehab zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi nʼelu ụlọ yaJos 2:4–6
Amaokwu ndị ahụ
Jos 2:4–6Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa. Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.” (Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)
- O ji ụdọ wedata ha site nʼụlọ ya dị nʼime mgbidi obodoJos 2:15
Amaokwu ndị ahụ
Jos 2:15Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ.
- Ihe ama ha kwekọrịtara: ụdọ uhie a kenyere na oghereikukuJos 2:18
Amaokwu ndị ahụ
Jos 2:18ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile.
- Ha zoro onwe ha ụbọchị atọ nʼala ugwu, emesịa kọọrọ JoshuaJos 2:16, Jos 2:22–23
Amaokwu ndị ahụ
Jos 2:16Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.”
Jos 2:22–23Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha. Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha.
- Ndị nnyopụta abụọ ahụ kpọpụtara Rehab na ezinaụlọ ya niileJos 6:22–23
Amaokwu ndị ahụ
Jos 6:22–23Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị ikom abụọ ahụ buru ụzọ gaa nnyochapụta obodo ahụ anya sị ha, “Mezuonụ nkwa unu kwere. Gaanụ nʼụlọ nwanyị akwụna, kpọpụta ya na ndị niile dị nʼụlọ ya.” Ya mere, ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị mere nledo ala ahụ, bara nʼụlọ ahụ, kpọpụta Rehab na nna ya na nne ya na ụmụnne ya na ndị ikwu ya niile. Ha kpọpụtara ndị ezinaụlọ ya niile debe ha nʼotu ebe nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel.
- Akwụkwọ Ndị Hibru na Jemis chetara Rehab maka ịnabata ndị nnyopụtaHib 11:31, Jem 2:25
Amaokwu ndị ahụ
Hib 11:31Site nʼokwukwe, Rehab nwanyị akwụna esoghị ndị nnupu isi laa nʼiyi nʼihi na ọ nabatara ndị bịara inyochapụta obodo ahụ nʼudo.
Jem 2:25Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche?
Ndị nnyopụta ndị ọzọ
- Mgbe ndị nnyopụta gara Jeza, Izrel weere obodo nta yaỌnụ 21:32
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 21:32Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
- Ndị nnyopụta e zigara Ai kọrọ: puku mmadụ abụọ maọbụ atọ ezuolaJos 7:2–3
Amaokwu ndị ahụ
Jos 7:2–3Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai. Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.”
- Ndị Dan ise ledoro Laish: ndị bi nʼudo na-enweghị onye inyeakaNkp 18:2, Nkp 18:7
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 18:2Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya. Mgbe ndị ahụ jeruru obodo ugwu ugwu Ifrem, ha gara nọdụ ọdụ abalị nʼụlọ Maịka.
Nkp 18:7Ya mere, ndị ikom ise ndị ahụ biliri ije bịaruo nʼobodo Laish, ebe ha hụrụ na ndị ahụ na-ebi nʼudo, na-enweghị nsogbu ọbụla. Ha dịka ndị obodo Saịdọn, ndị onwe ha juru afọ, ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha bụ ndị bara ụba, ebe ọ dịghị ihe ọbụla kọrọ ụkọ nʼala ahụ. Ọzọ, ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo ndị Saịdọn. Ọ dịkwaghị ihe ha na mmadụ ọbụla nwekọrọ.
- Devid zipụrụ ndị nledo ka ha mata na Sọl abịala nʼezie1Sa 26:4
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 26:4Devid zipụrụ ndị nledo, matakwa na Sọl bịara nʼezie.
- Ndịisi ndị Amọn chere na ndị Devid zitere ịkasi obi bụ ndị nnyopụta2Sa 10:3
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 10:3ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?”
- Absalọm zipụrụ ndị ozi na nzuzo nʼebo niile: mgbe opi dara, sịnụ “Absalọm abụrụla eze”2Sa 15:10
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 15:10Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’ ”
- Ahimaaz na Jonatan, ụmụ ndị nchụaja, ga-ebugara Devid ozi2Sa 15:35–36
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 15:35–36Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze. Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.”
- Otu nwaagbọghọ na-eje ozi wetaara ha ozi na En-Rogel; ha zoro nʼolulu mmiri2Sa 17:17–19
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 17:17–19Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid. Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ Nwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya. Ọ dịghị onye maara maka ya.
- Ndị nnyopụta mere onwe ha dịka ndị ezi omume ka ha jide Jisọs nʼokwu yaLuk 20:20
Amaokwu ndị ahụ
Luk 20:20Ya mere, ha chere ya nche nke ọma, ma zipụ ndị nnyopụta, ndị mere onwe ha dịka ndị ezi omume, ka ha chọpụta ma o nwere ụzọ ha ga-esi jide ya site nʼihe ọ ga-ekwu, ka ha site na nke a nyefee ya nʼaka ọchịchị na ike onyeisi ala.
- Pọl: ụmụnna ụgha batara na nzuzo inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyịGal 2:4
Amaokwu ndị ahụ
Gal 2:4Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.