Nyochaa › Isiokwu › Ịsa ụkwụ na ịkwọ aka
Nkọwa ndị na-eju anya
Ịsa ụkwụ na ịkwọ aka nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (27), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- Ebraham nyere ndị ọbịa ya mmiri ka ha saa ụkwụ ha, zuru ikeJen 18:4
Amaokwu ndị ahụ
Jen 18:4Biko, ka ekutere unu mmiri ntakịrị, ka unu sachaa ụkwụ unu, zurukwa ike nʼokpuru osisi a.
- Lọt: “Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị”Jen 19:2
Amaokwu ndị ahụ
Jen 19:2Ọ sịrị, “Ndị nwe m, batanụ nʼụlọ ohu unu. Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị. Chi bọọ, unu nwere ike ibilikwa bido ịga nʼihu nʼije unu.” Ha zara sị, “Ee, anyị ga-edina nʼama.”
- Ndị ụlọ Leban nyere ohu Ebraham na ndị ikom so ya mmiri maka ụkwụ haJen 24:32
Amaokwu ndị ahụ
Jen 24:32Ya mere, nwoke ahụ gara nʼụlọ, ebe Leban nyere aka butukwaara ya ibu nke ịnyịnya kamel ndị ahụ bu. E wetara nri nye ịnyịnya kamel ndị ahụ, wetara ya mmiri nke ya na ndị ikom so ya ji saa ụkwụ ha.
- Odibo Josef nyere ụmụnne ahụ mmiri ka ha saa ụkwụ haJen 43:24
Amaokwu ndị ahụ
Jen 43:24Nʼoge ahụ, odibo ahụ duuru ndị ikom ndị ahụ bata nʼụlọ Josef, nye ha mmiri ha ji saa ụkwụ ha. O nyekwara ịnyịnya ibu ha nri.
- Nʼụlọ agadi nwoke ahụ na Gibea, ha sara ụkwụ ha, rie, ṅụọNkp 19:21
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 19:21Nʼihi nke a, ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya. O duuru ịnyịnya ibu ha, nye ha ihe oriri. Emesịa, ha sara ụkwụ ha mmiri, nọdụ ala rie ma ṅụọkwa.
- Abigel: adị m njikere ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi1Sa 25:41
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 25:41Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.”
- Devid gwara Ụraya: “Laa nʼụlọ gị gaa saa ụkwụ gị”2Sa 11:8
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 11:8Devid sịrị Ụraya, “Laa nʼụlọ gị gaa saa ụkwụ gị.” Ụraya si nʼụlọeze pụọ. E zipụkwara onyinye nke ndị na-ejere eze ozi ji sochie ya azụ.
- Mefiboshet asaghị ụkwụ ya mgbe Devid nọ nʼebe ọzọ2Sa 19:24
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 19:24Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo.
- Abụ nke Abụ: “Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?”Abụk 5:3
Amaokwu ndị ahụ
Abụk 5:3Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?
Nʼime Oziọma
- Jisọs gwara Saimọn: i kunyeghị m mmiri maka ụkwụ mLuk 7:44
Amaokwu ndị ahụ
Luk 7:44Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.
- Otu nwanyị ji anya mmiri ya mee ka ụkwụ ya dee, were agịrị isi ya hichaa haLuk 7:38
Amaokwu ndị ahụ
Luk 7:38Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha.
- Meri ji mmanụ naad tee ụkwụ Jisọs, were agịrị isi ya hichaa haJọn 12:3
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 12:3Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ.
- Nʼoge nri anyasị, Jisọs kere akwa ehicha ahụ nʼukwu ya, saa ụkwụ ndị na-eso ụzọ yaJọn 13:4–5
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 13:4–5Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya. Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha.
- Pita: “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị”Jọn 13:8
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 13:8Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.”
- Jisọs: onye sara ahụ chọrọ naanị ịsa ụkwụ yaJọn 13:10
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 13:10Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile.”
- “unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu”Jọn 13:14
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 13:14Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu.
- Nwanyị di ya nwụrụ a ma ama maka ịsa ụkwụ ndị nsọ1Tm 5:10
Amaokwu ndị ahụ
1Tm 5:10Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma.
Ịkwọ aka
- Ndị nchụaja na-akwọ aka na ụkwụ ha nʼefere ukwu bronz tupu ha eje oziỌpụ 30:18–21, Ọpụ 40:31
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 30:18–21“Jiri bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya, maka ịsa ihe. Wụnye mmiri nʼime ya, dọsa ya nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja. Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa ụkwụ na aka ha site na ya. Mgbe ọbụla ha na-aba nʼụlọ nzute ahụ, ha ga-eji mmiri saa onwe ka ha ghara ịnwụ. Ọzọkwa, mgbe ha na-abịaru nso nʼebe ịchụ aja, maka ije ozi iche onyinye nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ, ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha, ka ha ghara ịnwụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
Ọpụ 40:31Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha.
- Mgbe e gburu mmadụ, a maghị onye gburu ya, ndị okenye na-akwọ aka ha nʼelu nwa nne ehiDit 21:1, Dit 21:6
Amaokwu ndị ahụ
Dit 21:1Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, biri nʼime ya, ọ bụrụ na ị hụ otu onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ nʼime ọhịa, ma ị maghị onye gburu ya,
Dit 21:6Mgbe ahụ, ndị okenye niile nke obodo ndị ahụ dịkarịsịrị ozu ahụ nso, ga-akwọ aka ha nʼelu nwaagbọghọ ehi ahụ, nke ahụ a gbajiri olu nʼime ndagwurugwu ahụ.
- Pailet kwọrọ aka ya nʼihu igwe mmadụ: “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị”Mat 27:24
Amaokwu ndị ahụ
Mat 27:24Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.”
- Ndị Farisii anaghị eri nri na-akwọghị aka, dịka omenala ndị okenye si dịMak 7:3–4
Amaokwu ndị ahụ
Mak 7:3–4Ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri nri ma ọ bụrụ na ha akwọghị aka, nʼihi na ha na-ejigidesi aka ike nʼozizi na omenaala nke ndị okenye. Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ.
- Ha jụrụ ihe mere ndị na-eso ụzọ Jisọs ji eri nri na-akwọghị akaMat 15:2, Mak 7:5
- O juru otu onye Farisii anya na Jisọs akwọghị aka tupu nriLuk 11:38
Amaokwu ndị ahụ
Luk 11:38O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe ọ bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupu ya ebido.
- Ite nkume isii na Kena ji mmiri maka omenala ime onwe ka ọ dị ọchaJọn 2:6
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 2:6A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.