Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ịnyịnya kamel

Nkọwa ndị na-eju anya

Ịnyịnya kamel nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (26), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • A gaghị eri anụ ịnyịnya kamelLev 11:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 11:4“ ‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.
  • Ebram, Jekọb na Job gụnyere ịnyịnya kamel nʼakụ haJen 12:16, Jen 30:43, Job 1:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 12:16Fero mesoro Ebram mmeso ọma nʼihi nwunye ya. Ebram nwetara igwe atụrụ, na ehi, na nne ịnyịnya ibu, oke na nwunye, na ndị ohu ndị nwoke na ndị nwanyị, na ịnyịnya kamel.
    Jen 30:43Site nʼụzọ dị otu a, Jekọb ghọrọ onye nwere akụ hie nne. O nwekwara ọtụtụ igwe anụ ụlọ na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi nwoke na nwanyị, na ọtụtụ ịnyịnya kamel, na ọtụtụ ịnyịnya ibu ndị ọzọ.
    Job 1:3O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ.
  • Job nwere ịnyịnya kamel 3,000, e mesịa 6,000Job 1:3, Job 42:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 1:3O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ.
    Job 42:12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu.
  • Obil onye Ishmel na-elekọta ịnyịnya kamel Devid1Ih 27:30
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ih 27:30Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze. Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu.

Nʼime akụkọ ndị ahụ

  • Ohu Ebraham duuru ịnyịnya kamel iri gaa ịchọtara Aịzik nwunyeJen 24:10
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 24:10Emesịa, ohu a duuru ịnyịnya kamel iri nʼime ndị nna ya ukwu nwere pụọ. O sitekwara nʼaka nna ya ukwu were ihe ọma dị iche iche maka njem a, gawa Aram Naharaim, rute nʼobodo Nahọ.
  • O mere ka ịnyịnya kamel ndị ahụ makpuru ala nʼakụkụ olulu mmiri nʼanyasịJen 24:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 24:11O mere ka ịnyịnya kamel ndị ahụ makpuru ala nʼakụkụ olulu mmiri dị nʼazụ obodo ahụ. Ọ bụ nʼoge anyasị, oge ụmụ nwanyị ji apụta iseta mmiri nʼebe ahụ.
  • Ribeka kutere mmiri nye ịnyịnya kamel ya niileJen 24:14, Jen 24:19–20
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 24:14Kwere ka o si otu a dịrị na nwaagbọghọ nke m ga-asị, ‘Biko, zie ite gị ka m ṅụrụ mmiri.’ Ọ bụrụ na onye ahụ asị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel gị ga-aṅụ,’ ka onye ahụ bụrụ onye ị họpụtara ohu gị Aịzik. Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi mata na i gosila nna m ukwu obi ebere.”
    Jen 24:19–20Mgbe o nyechara ya mmiri, ọ sịrị, “Aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.” Ngwangwa, ọ wụpụrụ mmiri dị nʼite ya nʼime ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri, gbara ọsọ gaa kute mmiri ọzọ na-agbanye nʼime ihe ahụ. O kugidere mmiri tutu ruo mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụjuchara afọ.
  • Ribeka nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel gaa izute AịzikJen 24:61, Jen 24:64
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 24:61Ribeka biliri, ya na ndị inyom na-ejere ya ozi, ha rigoro nʼelu ịnyịnya kamel ndị ahụ, soro nwoke ahụ. Ya mere, ohu ahụ duuru Ribeka laa.
    Jen 24:64Ribeka nʼonwe ya lepụkwara anya hụ Aịzik. O sitere nʼelu ịnyịnya kamel rịdata,
  • Rechel zoro arụsị Leban nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel, nọkwasị haJen 31:34
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 31:34Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
  • Onyinye Jekọb nyere Ịsọ gụnyere nne ịnyịnya kamel 30 na ụmụ haJen 32:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 32:15Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10).
  • Ịnyịnya kamel ndị Ishmel bu ụda gaa IjiptJen 37:25
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 37:25Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga.
  • Ịnyịnya kamel ndị Midia dị ọtụtụ dịka ajaNkp 7:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 7:12Ma lee, usuu ndị agha Midia, na ndị Amalek, na ndị obodo ndị ọzọ ahụ si nʼọwụwa anyanwụ bịa jupụtara na ndagwurugwu ahụ dị ka igurube. Nʼezie, ịnyịnya kamel ha dị ọtụtụ, dịka aja dị nʼakụkụ oke osimiri.
  • Gidiọn weere ihe ịchọ mma ọnwa site nʼolu ịnyịnya kamel ndị ezeNkp 8:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 8:21Zeba na Zalmuna, gwara Gidiọn okwu sị, “Jiri aka gị gbuo anyị. ‘A hụ dimkpa, a hụ ike ya.’ ” Nʼihi nke a, Gidiọn were aka ya gbuo ha, chịkọrọkwa ihe olu niile ha nyakwasịrị ịnyịnya kamel ha nʼolu.
  • Narị ndị Amalek anọ gbapụrụ Devid nʼelu ịnyịnya kamel1Sa 30:17
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 30:17Devid na ndị agha ya bịakwasịrị ha na mberede gbuo ha site nʼabalị ahụ ruo anyasị echi ya. Ọ dịkwaghị otu nwoke nʼime ha fọdụrụ ndụ ma ọ bụghị narị ndị ikom anọ makwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel ha gbalaga.
  • Eze nwanyị Sheba bịara ya na ịnyịnya kamel bu ụda na ọlaedo1Ez 10:2
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 10:2Ọ bịarutere Jerusalem, ya na ọtụtụ ndị ozi nʼebe ha bara ụba, ndị so ya, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi.
  • Hazael wetaara Ịlaisha onyinye ịnyịnya kamel iri anọ bu2Ez 8:9
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 8:9Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs, wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ”
  • Ndị Kaldịa na-apụnara mmadụ ihe kpụrụ ịnyịnya kamel JobJob 1:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 1:17Mgbe onye nke ahụ nọ na-ekwu okwu, onyeozi ọzọ batara kwuokwa sị, “Ndị agha ndị Kaldịa kere onwe ha ụzọ atọ bịakwasị ịnyịnya kamel gị niile, dọta ha nʼagha, kpụrụ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ohu gị niile gbalaa. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
  • Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel meeMat 3:4, Mak 1:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 3:4Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
    Mak 1:6Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.

Okwu Jisọs

  • Ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịgaMat 19:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 19:24Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
  • Unu na-azapụ ijiji, ma unu na-eloda ịnyịnya kamelMat 23:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 23:24Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda ịnyịnya kamel.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.