Nyochaa › Isiokwu › Nkume ịkwọ nri, ekwu na ime achịcha
Nkọwa ndị na-eju anya
Nkume ịkwọ nri, ekwu na ime achịcha nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (32), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Nkume ịkwọ nri na ịkwọ ọka
- A gaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe nʼihi ụgwọDit 24:6
Amaokwu ndị ahụ
Dit 24:6Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya.
- NʼIjipt, ohu nwanyị kachasị nta na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nriỌpụ 11:5
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 11:5Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ.
- A na-akwọ mánà na nkume maọbụ sụọ ya nʼikweỌnụ 11:8
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 11:8Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ha. Emesịa, ha na-eji nkume e ji akwọ nri na-akwọri ha. Oge ụfọdụ, ha na-eji ikwe nri sụọ ya. Emesịa, ha na-esi ya esi, maọbụ ghee ya eghe. Ọ na-atọ dịka ihe e ji mmanụ oliv ghee.
- Na Tebez, otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi AbimelekNkp 9:53, 2Sa 11:21
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 9:53otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya.
2Sa 11:21Onye gburu Abimelek nwa Jeru-Beshet? Ọ bụghị na mgbidi obodo ka nwanyị nọ tụdaa aka nkume dagburu ya na Tebez? Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ nso?’ Ọ bụrụ na ọ jụọ gị ihe dị otu a, gwa ya, ‘Ohu gị bụ Ụraya, onye Het anwụọkwala.’ ”
- Samsin, onye e ghụpụrụ anya, e kee ya agbụ, na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ na GazaNkp 16:21
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 16:21Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya.
- Jisọs kwuru maka ndị inyom abụọ na-akwọkọ ọkaMat 24:41, Luk 17:35
- Jisọs: ọ ka mma ka e kedo nkume igwe nri nʼolu mmadụ, mikpuo yaMat 18:6
Amaokwu ndị ahụ
Mat 18:6“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya.
- Jeremaya kpọrọ ụda nkume ịkwọ nri na olu nwanyị a na-alụ na onye na-alụ yaJer 25:10
Amaokwu ndị ahụ
Jer 25:10Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.
- Abụ Akwa: ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nriAkw 5:13
Amaokwu ndị ahụ
Akw 5:13Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri, ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.
Ekwu na ime achịcha
- Awọ ga-abata nʼekwu na efere ịgwakọta ụtụ ọka nke IjiptỌpụ 8:3
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 8:3Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka.
- E nwere ike ime onyinye mkpụrụ ọka nʼekwu maọbụ ghee ya nʼiteLev 2:4, Lev 7:9
Amaokwu ndị ahụ
Lev 2:4“ ‘Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha eghere nʼite e ji eghe ihe, ọ ga-abụ nke e ji ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma mee. Ọ ga-abụ ogbe achịcha agwara mmanụ oliv nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, maọbụ achịcha mbadamba e tere mmanụ nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
Lev 7:9A ga-ebunye onye nchụaja chụrụ aja mkpụrụ ọka nke e ji ụtụ ọka chụọ, ụtụ ọka fọdụrụ. Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼaja achịcha ọbụla a nụrụ anụ, maọbụ nke e siri esi, maọbụ nke e ghere eghe. Ihe ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ.
- Ekwu ozu rụrụ arụ metụrụ aka ka a ga-etiwaLev 11:35
Amaokwu ndị ahụ
Lev 11:35Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ.
- Ọbụbụ ọnụ nʼIwu: ndị inyom iri ga-eme achịcha nʼotu ekwuLev 26:26
Amaokwu ndị ahụ
Lev 26:26Aga m eme ka unu hapụ inwe ihe oriri ga-ezuru unu. Otu ite nri naanị ka ndị inyom iri ga-eji sie nri ha nwere. Ha ga-eji ihe ọtụtụ tụọ ya mgbe ha na-eke ya. Unu ga-eri ya, ma afọ agaghị eju unu.
- Sera ga-agwọ sịa atọ nke ọka a kwọrọ nke ọma, mee achịchaJen 18:6
Amaokwu ndị ahụ
Jen 18:6Ya mere, Ebraham mere ngwangwa banyekwuru Sera nʼụlọ ikwu ya sị ya, “Mee ngwa, mapụta ihe ọtụtụ sịa atọ site na ọka a kwọrọ nke ọma jiri meta achịcha.”
- Lọt ghere achịcha na-ekoghị eko nye ndị ọbịa yaJen 19:3
Amaokwu ndị ahụ
Jen 19:3Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya.
- Onyeisi ndị na-esi nri Fero rọrọ nrọ nkata achịcha atọ nʼisi yaJen 40:16–17
Amaokwu ndị ahụ
Jen 40:16–17Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi. Nkata nke dị nʼelu jupụtara na achịcha dị iche iche e gheere eze, bụ Fero. Ma ụmụ nnụnụ bịara na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata m bụ nʼisi.”
- Mgbe ha si Ijipt pụọ, Izrel mere achịcha na-ekoghị eko site nʼụtụ ọka ha buruỌpụ 12:34, Ọpụ 12:39
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 12:34Ya mere, ụmụ Izrel buuru ụtụ ọka e ji eme achịcha na-ekoghị eko, nke ha tinyere nʼefere e ji agwakọta ya. Ha ji akwa kechie ha, bukwasị ha nʼubu ha.
Ọpụ 12:39Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri.
- Tupu Ụbọchị Izuike: “sienụ ihe niile unu nwere isi taa”Ọpụ 16:23
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 16:23Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’ ”
- E mere ogbe achịcha iri na abụọ maka tebụl ọlaedo nʼihu Onyenwe anyịLev 24:5–6
Amaokwu ndị ahụ
Lev 24:5–6“Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla. Doo achịcha ndị a nʼahịrị abụọ nʼelu tebul ahụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị. Ogbe achịcha isii ga-adị nʼotu ahịrị.
- Samuel: eze ga-eme ụmụ unu ndị inyom ndị na-esi nri na ndị na-eme achịcha1Sa 8:13
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 8:13Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị inyom mee ka ha bụrụ ndị na-esiri ya mmanụ otite na-esi isi ụtọ, na ndị na-esiri ya nri, na ndị na-eghere ya ihe oghịghe.
- Nwanyị ahụ na Endoa gwọrọ ụtụ ọka, mee achịcha na-ekoghị eko nye Sọl1Sa 28:24
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 28:24Nwanyị ahụ mere ngwangwa gbuo nwa ehi gbara abụba o nwere nʼụlọ ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha nke etinyeghị ihe na-eko achịcha nʼime ya,
- Tama gwọrọ ụtụ ọka, gheere Amnọn achịcha2Sa 13:8
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 13:8Tama gara nʼụlọ Amnọn, banyekwa nʼime ụlọ ebe o dinaa, ka Amnọn na-ele ya anya mgbe ọ na-agwọgharị ụtụ ọka. Emesịa, Tama gheere ya achịcha mara mma.
- Ịlaịja tetara hụ ogbe achịcha a hụrụ nʼicheku ọkụ1Ez 19:6
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 19:6Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ.
- Aịzaya: e ji ụfọdụ nkụ ahụ ghee achịcha, nke fọdụrụ ghọọ arụsịAịz 44:15, Aịz 44:19
Amaokwu ndị ahụ
Aịz 44:15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.
Aịz 44:19Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche, ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị, “Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ, Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya, ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara. M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ? Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”
- Jeremaya na-anata otu ogbe achịcha kwa ụbọchị site nʼokporoụzọ ndị na-eme achịchaJer 37:21
Amaokwu ndị ahụ
Jer 37:21Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche.
- Mgbidi Jerusalem nwere Ụlọ Elu ỌkụNeh 3:11, Neh 12:38
Amaokwu ndị ahụ
Neh 3:11Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ.
Neh 12:38Ndị ọbụ abụ nke ọzọ bụ ndị na-enye ekele gara ụzọ aka ekpe. Mụ onwe m sooro ha nʼelu mgbidi ahụ, tinyere ọkara ndị mmadụ ahụ, gafee Ụlọ elu Ite Ọkụ jeruo Mgbidi Sara Mbara.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.