Nyochaa › Isiokwu › Ọnụọgụgụ iri anọ
Nkọwa ndị na-eju anya
Ọnụọgụgụ iri anọ nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (31), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Iri ụbọchị anọ
- Mmiri ozuzo zoro nʼụwa iri ụbọchị anọ ehihie na abalịJen 7:4, Jen 7:12, Jen 7:17
Amaokwu ndị ahụ
Jen 7:4Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.”
Jen 7:12Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
Jen 7:17Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.
- Mgbe iri ụbọchị anọ gasịrị, Noa meghere oghereikuku ụgbọ ahụJen 8:6
Amaokwu ndị ahụ
Jen 8:6Mgbe iri ụbọchị anọ gafere, Noa meghere oghereikuku ọ rụnyere nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ,
- Ịgbasi ozu Jekọb were iri ụbọchị anọJen 50:3
Amaokwu ndị ahụ
Jen 50:3O were ha iri ụbọchị anọ ịgbasi ozu, nʼihi na nke a bụ oge o kwesiri iwe ha ime ya. Mgbe nke a gasịrị, a kwara ya nʼala Ijipt iri ụbọchị asaa.
- Mosis nọrọ nʼelu ugwu iri ụbọchị anọ ehihie na abalịỌpụ 24:18, Ọpụ 34:28, Dit 9:9
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 24:18Mosis banyere nʼime igwe ojii ahụ mgbe ọ na-arịgo ugwu ahụ. Ọ nọgidere nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
Ọpụ 34:28Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ.
Dit 9:9Mgbe m rigooro nʼelu ugwu ahụ ịnata mbadamba nkume ndị ahụ bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na unu, anọrọ m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, ọ dịghị nri m riri, ọ dịghịkwa mmiri m ṅụrụ.
- Ndị nnyopụta lọghachiri mgbe iri ụbọchị anọ gasịrịỌnụ 13:25
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 13:25Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.
- Golaịat na-apụta iri ụbọchị anọ, ụtụtụ na uhuruchi1Sa 17:16
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 17:16Golaịat, onye Filistia na-abịaru nso ụtụtụ na uhuruchi, na-eguzo onwe ya otu a iri ụbọchị anọ.
- Ịlaịja jere ije iri ụbọchị anọ ehihie na abalị ruo Horeb1Ez 19:8
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 19:8Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke.
- Jona: iri ụbọchị anọ ọzọ, a ga-akwatu NiniveJona 3:4
Amaokwu ndị ahụ
Jona 3:4Jona malitere ịba nʼobodo ahụ, ma mgbe ọ gara ije otu ụbọchị, o kwusara sị, “Iri ụbọchị anọ ka ọ fọdụrụ tupu alaa Ninive nʼiyi.”
- Jisọs buru ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalịMat 4:2
Amaokwu ndị ahụ
Mat 4:2Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
- Mgbe o sitere nʼọnwụ bilie, Jisọs gosiri onwe ya nʼime iri ụbọchị anọỌrụ 1:3
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 1:3Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke.
Iri afọ anọ
- Izrel riri mánà iri afọ anọ nʼọzaraỌpụ 16:35
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 16:35Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan.
- Iri afọ anọ nke iwagharị, otu afọ maka ụbọchị ọbụla nke nnyopụtaỌnụ 14:34
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 14:34Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya.
- Aịzik lụrụ Ribeka mgbe ọ gbara iri afọ anọJen 25:20
Amaokwu ndị ahụ
Jen 25:20Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram.
- Mosis gbara iri afọ anọ mgbe ọ gara ileta ndị ya; iri afọ anọ e mesịrị, osisi ahụ na-ere ọkụỌrụ 7:23, Ọrụ 7:30
- Nʼokpuru ọtụtụ ndị ikpe, ala ahụ zuru ike iri afọ anọNkp 3:11, Nkp 5:31, Nkp 8:28
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 3:11Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, udo dịịrị nʼala niile iri afọ anọ, mgbe Otniel na-ekpe Izrel ikpe. Nʼikpeazụ, Otniel, nwa Kenaz nwụrụ.
Nkp 5:31“ Onyenwe anyị, biko, ka ndị iro gị niile si otu a laa nʼiyi. Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nwupụta ihe dịka anyanwụ mgbe o biliri nʼike.” E nwere izuike nʼala ahụ iri afọ anọ.
Nkp 8:28Otu a ka Midia si ghọọ ndị Izrel meriri emeri. Midia eweliteghị isi ya ọzọ. Nʼihi nke a, Izrel biri nʼudo iri afọ anọ, nʼụbọchị niile Gidiọn dị ndụ.
- Ndị Filistia chịrị Izrel iri afọ anọNkp 13:1
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 13:1Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu onyenwe anyị. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ.
- Elayị kpere Izrel ikpe iri afọ anọ1Sa 4:18
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 4:18Mgbe onyeozi ahụ kwutere maka igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Elayị sitere nʼoche ya dalaa azụ nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dajie olu ya, nwụọ! Nʼihi na o meela nnọọ agadi. Ọ bụkwa onye buru ibu. Ya onwe ya kpekwara ụmụ Izrel ikpe iri afọ anọ.
- Iri afọ anọ nʼokpuru Sọl, ka Pọl kwuruỌrụ 13:21
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 13:21Mgbe ahụ ha rịọrọ ka enye ha eze, Chineke nyekwara ha Sọl, nwa Kish, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta, onye chịrị iri afọ anọ.
- Devid chịrị iri afọ anọ: asaa na Hebrọn, iri atọ na atọ na Jerusalem2Sa 5:4, 1Ez 2:11
- Solomọn chịrị iri afọ anọ1Ez 11:42
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 11:42Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem.
- Joash chịrị na Jerusalem iri afọ anọ2Ez 12:1
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 12:1Nʼafọ nke asaa, nke ọchịchị Jehu nʼIzrel, ka Joash malitere ịbụ eze na Juda. Iri afọ anọ ka ọ chịrị dịka eze na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba.
Ụtarị iri anọ
- Iwu ekweghị ka a pịa mmadụ karịa ụtarị iri anọDit 25:3
Amaokwu ndị ahụ
Dit 25:3ma agaghị eti ya karịa ọnụ ụtarị iri anọ. Ọ bụrụ na e tie onye ahụ ikpe mara ọnụ ụtarị karịrị nke a, ọ ga-abụ onye e leliri anya nʼihu ndị Izrel ibe ya.
- Ugboro ise ka Pọl natara ụtarị iri anọ e wepụrụ otu2Kọ 11:24
Amaokwu ndị ahụ
2Kọ 11:24Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.