Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Mgbaasị na ihe ama

Nkọwa ndị na-eju anya

Mgbaasị na ihe ama nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (32), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Nʼime Iwu

  • A machibidoro ịgba afa, ịchọ ihe ama, mgbaasị, ịjụ mmụọ ase na ịjụ ndị nwụrụ anwụ aseLev 19:26, Lev 19:31, Dit 18:10–11
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 19:26“ ‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “ ‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
    Lev 19:31“ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
    Dit 18:10–11Ka a hapụ ịchọta onye ọbụla nʼetiti gị nke na-ewere nwa ya nwoke maọbụ nwanyị nye ka a kpọọ ya ọkụ nʼihi ịchụrụ chi ndị mba ọzọ aja. Ka onye Izrel ọbụla ghara ịbụ onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ onye mgbaasị maọbụ na-agba aja, maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ.
  • A gaghị ahapụ nwanyị mgbaasị ndụỌpụ 22:18
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 22:18“E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ.
  • A ga-eji nkume tugbuo onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ dibịa afaLev 20:27
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 20:27“ ‘A ga-eji nkume tugbuo nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nke na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa nọ nʼetiti unu ka ọ nwụọ. Ọbara ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”

Ndị mere ya

  • Leban: “esi m nʼịgba afa chọpụta”Jen 30:27
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 30:27Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụrụ na m achọtala amara nʼihu gị biko nọdụ, nʼihi na esi m nʼịgba afa chọpụta na Onyenwe anyị agọziela m nʼihi gị.”
  • Iko ọlaọcha Josef, nke e kwuru na o ji ajụ aseJen 44:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 44:5Gịnị mere unu ji zuru iko ọlaọcha nna m ukwu, iko o ji aṅụ ihe ọṅụṅụ na nke o ji ajụ ase? Unu emeela ihe ọjọọ nʼihi ihe a unu mere.’ ”
  • Ndị majiki Fero ji ihe nzuzo ha mee ihe ịrịbama ndị ahụ, ma ọ bụghị ụmụ ahụhụ nta ahụỌpụ 7:11, Ọpụ 7:22, Ọpụ 8:7, Ọpụ 8:18
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 7:11Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha.
    Ọpụ 7:22Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ka mmiri chaa ọbara ọbara. Nke a mere ka Fero nyịchie obi ya. Ọ ṅaghị Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị gwara ha na ọ ga-eme.
    Ọpụ 8:7Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ Mosis na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile.
    Ọpụ 8:18Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile.
  • Ndị okenye Moab bu ego ịjụta ase gakwuru BelamỌnụ 22:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọnụ 22:7Ndị ozi o zigara bụ ndị okenye obodo Moab na Midia. Ha ji ego ịjụta ase nʼaka ha. Mgbe ha ruru, ha ziri Belam ozi Balak ziri.
  • Sọl chụpụrụ ndị na-ajụ mmụọ ase, emesịa o zoro onwe ya gaa jụta otu nʼime ha ase nʼEndoa1Sa 28:3, 1Sa 28:7–8
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 28:3Nʼoge a Samuel anwụọla, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, lie ya nʼobodo ya bụ Rema. Sọl achụpụsịakwala ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase na ndị dibịa afa site nʼala ahụ.
    1Sa 28:7–8Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.” Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.” Ya mere, Sọl nwogharịrị onwe ya, yiri uwe ọzọ, o ruo nʼabalị, ya na ndị ikom abụọ gakwuru nwanyị ahụ. Ọ sịrị, “Jụtara m mmụọ ase, kpọlitekwara m onye m ga-akpọ aha ya.”
  • Nwanyị ahụ hụrụ Samuel, mata Sọl1Sa 28:11–14
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 28:11–14Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.” Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!” Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi ka o si nʼala na-arịgopụta.” Sọl jụrụ, “Gịnị ka onye ahụ yiri nʼọdịdị?” Ọ sịrị, “Ọ bụ agadi nwoke na-arịgota, e ji uwe mwụda kpuchie ahụ ya.” Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ Samuel. O kpuru ihu nʼala, kpọọkwa isiala.
  • Ihe E Mere: Sọl nwụrụ, nʼetiti ihe ndị ọzọ, nʼihi na ọ jụrụ onye na-ajụ mmụọ ase1Ih 10:13
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ih 10:13Sọl nwụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị, o debeghị okwu Onyenwe anyị, karịsịa, ọ gara na nke onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, nʼihi ịjụta ya ase,
  • Jehu kwuru maka ọtụtụ mgbaasị Jezebel2Ez 9:22
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 9:22Mgbe Joram hụrụ Jehu, ọ jụrụ, “Ị bịara nʼudo? Udo ọ dịkwa, Jehu?” Jehu zara, “Olee otu udo ga-esi dịrị, ebe ọ bụ na ihe ọjọọ niile nke ikpere arụsị na mgbaasị nke Jezebel nne gị, jupụtara nʼebe niile.”
  • Eze Manase mere mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ase2Ez 21:6, 2Ih 33:6
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 21:6O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.
    2Ih 33:6O jikwa ụmụ ya chụọ aja nʼime ọkụ na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ọ gbara aja, taa amụsụ, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo iwe ya.
  • Eze Josaya kpochapụrụ ndị na-ajụ mmụọ ase na ndị dibịa afa2Ez 23:24
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 23:24Ọzọkwa, Josaya gara nʼihu kpochapụ ndị niile na-ajụta mmụọ ọjọọ ase, na ndị dibịa afa, na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, na arụsị a pịrị apị, na ihe arụ niile nke a hụrụ nʼime Juda na Jerusalem niile. O mere nke a ka e mezuo ihe niile e dere nʼime akwụkwọ ahụ Hilkaya onye nchụaja chọtara nʼụlọ Onyenwe anyị.
  • Eze Babilọn chọrọ ihe ama: àkụ, arụsị, imejuIzk 21:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Izk 21:21Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ, nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ.
  • Ndị Babilọn na-enyocha kpakpando, na-ebu amụma kwa ọnwaAịz 47:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 47:13Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka. Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso. Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ. Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.
  • Ndị majiki, ndị mgbaasị na ndị na-enyocha kpakpando nke Nebukadneza enweghị ike ịkọwa nrọ yaDan 2:2, Dan 2:10, Dan 4:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 2:2Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị majiki, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, ndị mgbaasị na ndị ihe banyere ngagharị nke kpakpando doro anya ka ha bịa gwa ya ihe ahụ ọ rọrọ na nrọ. Mgbe ha bịara, guzo nʼihu eze,
    Dan 2:10Ndị Kaldịa zara eze, “Ọ dịghị mmadụ ọbụla nʼelu ụwa a nke nwere ike ime ihe a eze na-achọ. Ọ dịghịkwa eze, nʼagbanyeghị ịdị ukwuu ya na ịdị ike ya, nke jụtụrụla ụdị ihe dị otu a eze na-ajụ nʼaka ndị mgbaasị, ndị na-agba aja ya, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, na ndị Kaldịa.
    Dan 4:7Ma mgbe ndị mgbaasị, ndị dibịa, ndị Kaldịa na ndị na-agba afa bịara, a kọọrọ m ha nrọ ahụ m rọrọ, ma ha enweghị ike ịgwa m nkọwa ya.
  • Ndị amamihe Belshaza enweghị ike ịgụ ihe e dere na mgbidiDan 5:7–8, Dan 5:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 5:7–8Eze kpọrọ mkpu ka a kpọbata ndị dibịa niile na ndị Kaldịa, na ndị na-akọwa maka njegharị nke kpakpando. Mgbe ahụ eze sịrị ndị ikom amamihe nke Babilọn, “Onye ọbụla nwere ike gụọ ihe ahụ e dere, nke nwekwara ike ịkọwara m ihe ọ pụtara, ka a ga-eyikwasị uwe odo odo nke ndị eze. A ga-anyakwasị ya ihe olu ọlaedo. A ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze a.” Mgbe ahụ, ndị amamihe eze batara, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha pụrụ ịgụta, maọbụ ịkọwara eze ihe ọ pụtara.
    Dan 5:15Ndị amamihe m, na ndị na-enyocha kpakpando abịala nʼihu m ịgụ ihe ahụ e dere nʼaja ụlọ ma ha enweghị ike ịgụta ya maọbụ ịkọwa ihe ọ bụ.
  • Saimọn onye Sameria ji mgbaasị ya mee ka ihe tụọ ndị mmadụ nʼanyaỌrụ 8:9–11
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 8:9–11Ugbu a, kemgbe ọtụtụ oge gara aga, otu nwoke aha ya bụ Saimọn bụ onye mgbaasị. O jirila mgbaasị ya mee ọtụtụ ihe tụrụ ndị niile bi nʼobodo Sameria nʼanya. Ọ na-anyakwa isi na ya bụ onye dị ukwu. Onye ọbụla, ma onye ukwu ma onye nta, na-ege ya ntị na-asịkwa “Nwoke a bụ ike Chineke ahụ a na-akpọ Ike dị ukwuu.” Ha na-ege ya ntị oge niile nʼihi na ọ na-eji ike mgbaasị ya na-eme ihe juru ha anya.
  • Elimas, maọbụ Ba-Jisọs, onye mgbaasị na PafọsỌrụ 13:6–8
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 13:6–8Mgbe ha gazuchara obodo niile ndị ahụ mmiri gbara gburugburu ruo Pafọs, ha zutere otu onye mgbaasị, onye Juu bụ onye amụma ụgha a na-akpọ Ba-Jisọs. Ya na otu onye ọchịchị obodo, aha ya bụ Sajiọs Pọlọs nọ. Ọ bụ nwoke nwere ọgụgụisi nʼebe ọ dị ukwuu, ọ kpọrọ Banabas na Sọl ka ha gwa ya okwu nke Chineke. Ma onye mgbaasị ahụ, onye aha ya bụkwa Elimas (nʼihi nke a bụ aha ya ma asụgharịa ya) malitere igbochi ha site nʼimegharị onyeisi ahụ anya ka ọ ghara ịnabata okwukwe ahụ.
  • Otu nwaagbọghọ ohu na Filipai ji ịgba afa wetara ndị nwe ya egoỌrụ 16:16–19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 16:16–19Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga nʼụlọ ekpere, anyị zutere otu nwaagbọghọ bụ ohu, onye nwere mmụọ ịgba afa. Ọ na-ewetara ndị nwe ya ezigbo ego site nʼịgba afa. Ma o sogidere anyị na Pọl ebe ọbụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-asị, “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ha bịara ikwupụtara unu ihe banyere ụzọ nzọpụta.” O mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nʼoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nʼime ya pụta!” Otu mgbe ahụ o siri nʼime ya pụta. Mgbe ndị nwe ya hụrụ nʼolileanya ha iji inweta ego akwụsịla, ha jidere Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndịisi obodo nʼọma ahịa.
  • Ụmụ asaa nke Skiva nwara ịchụpụ mmụọ ọjọọỌrụ 19:13–16
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 19:13–16Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nʼaha Onyenwe anyị Jisọs na-asị, “E ji m aha Jisọs, onye Pọl na-ekwusa na-enye unu iwu ka unu site nʼime ya pụta.” Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa nke Skiva, onyeisi nchụaja, bụ onye Juu. Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?” Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị makwasịrị ha, tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbara ọtọ gbapụ nʼụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ.
  • Na Efesọs, a kpọrọ akwụkwọ mgbaasị ruru puku ọlaọcha iri ise ọkụỌrụ 19:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 19:19Ọtụtụ nʼime ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị bupụtara akwụkwọ niile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nʼihu mmadụ niile. Akwụkwọ niile a kpọrọ ọkụ nʼụbọchị ahụ ga-eru ego ruru puku ọlaọcha iri ise.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.