Nkọwa ndị na-eju anya
Mmanụ aṅụ nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (22), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na yaỌpụ 3:8, Lev 20:24
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 3:8Ya mere, agbadatala m ịnapụta ha site nʼaka ndị Ijipt na ịkpọpụta ha site nʼala ahụ, idubata ha nʼala ọma ahụ, nke sara mbara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ala ebe ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi.
Lev 20:24Ma agwala m unu sị, “Unu ga-eketa ala ha. Aga m enye ya unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kewapụtara unu doo unu iche site na mba ndị ọzọ niile.
- Ala mmanụ oliv na mmanụ aṅụDit 8:8
Amaokwu ndị ahụ
Dit 8:8ọ bụ ala na-epu ọka wiiti na ọka balị, na osisi vaịnị, na osisi fiig, na osisi pomegranet, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ.
- Mánà na-atọ ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ meeỌpụ 16:31
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 16:31Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee.
- A gaghị akpọ mmanụ aṅụ ọkụ dịka onyinyeLev 2:11
Amaokwu ndị ahụ
Lev 2:11“ ‘Unu etinyela ihe na-eko ọka ọbụla nʼonyinye mkpụrụ ọka unu na-enye Onyenwe anyị, nʼihi na unu ekwesighị ịkpọ ihe na-eko achịcha maọbụ mmanụ aṅụ ọkụ nʼonyinye nsure ọkụ unu na-enye Onyenwe anyị.
- Mmanụ aṅụ si na nkumeDit 32:13, Abụ 81:16
Amaokwu ndị ahụ
Dit 32:13O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ, jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya. O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya, ya na mmanụ si nʼoke nkume,
Abụ 81:16Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”
Nʼime akụkọ ndị ahụ
- Jekọb zigara mmanụ aṅụ nta dịka onyinye nʼIjiptJen 43:11
Amaokwu ndị ahụ
Jen 43:11Mgbe ahụ nna ha Izrel gwara ha sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-adịrịrị otu a, gịnị ọzọ ka anyị ga-eme. Kama mgbe unu na-aga, werenụ nʼakpa unu onyinye ịnata ihuọma nke bụ ihe niile kachasị mma nke si nʼala a welaara nwoke a. Werenụ nwantịntị mmanụ otite, na nwantịntị mmanụ aṅụ, ha na ụda dị iche iche, na eso osisi máá, na akụ, na alụmọnd.
- Samsin riri mmanụ aṅụ site nʼozu ọdụmNkp 14:8–9
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 14:8–9Ọ laghachiri mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị ka ọ kpọrọ ya. Ma mgbe ọ tụgharịrị ka ọ hụ ozu ọdụm ahụ, ọ hụrụ na igwe aṅụ bizi nʼime ozu ọdụm ahụ, na-emepụtakwa mmanụ aṅụ. Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm.
- Jonatan detụrụ mmanụ aṅụ ire nʼọhịa, megide iyi Sọl ṅụrụ1Sa 14:25–27, 1Sa 14:43
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 14:25–27Ndị agha ahụ niile banyere nʼọhịa ebe mmanụ aṅụ dị nʼala. Mgbe ha banyere nʼọhịa, ha hụrụ mmanụ aṅụ ebe ọ na-asọpụta, ma o nweghị onye metụrụ aka nʼọnụ ya, nʼihi na ha tụrụ egwu iyi ahụ ha ṅụrụ. Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi, ya mere, o setịpụrụ ọnụ ọnụ mkpanaka dị ya nʼaka rụta mmanụ aṅụ na ugbugbo ya, tinye nʼọnụ ya rachaa. Nke a mere ka ike ya laghachite.
1Sa 14:43Sọl gwara Jonatan okwu sị ya, “Gwa m ihe i mere.” Jonatan zara sị ya, “Ọ bụ naanị mmanụ aṅụ ntakịrị ka m ji ọnụ mkpanaka m rụrụ rachaa. Ọ pụtara na m ga-anwụ nʼihi ya?”
- Anya ya nwụkwara mgbe ọ detụrụ mmanụ aṅụ nta ire1Sa 14:29
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 14:29Jonatan zara sị, “Nna m esitela nʼiwu dị otu a wetara ala anyị nsogbu. Lee ka m si nweta ike site na mmanụ aṅụ nta m rachara.
- Ndị enyi wetaara ndị ikom Devid agụụ na-agụ mmanụ aṅụ2Sa 17:29
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 17:29O wetakwara mmanụ aṅụ, na bọta, atụrụ na chiizi nke sitere na mmiri ara ehi nye Devid na ndị so ya ka ha rie. Nʼihi na ha sịrị, “Ike agwụla ndị mmadụ, agụụ na-agụ ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, nʼime ọzara.”
- Nwunye Jeroboam bu karama mmanụ aṅụ gakwuru onye amụma1Ez 14:3
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 14:3Chịrịkwa ogbe achịcha iri, na achịcha nta ole na ole, na otu karama mmanụ aṅụ, jekwuru ya. Ọ ga-agwa gị ihe ga-eme banyere nwantakịrị a.”
- Juda zụrụ ahịa mmanụ aṅụ na TaịaIzk 27:17
Amaokwu ndị ahụ
Izk 27:17“ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
- Jọn riri igurube na mmanụ aṅụ ọhịaMat 3:4
Amaokwu ndị ahụ
Mat 3:4Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
Okwu
- Nwa m nwoke, rie mmanụ aṅụ, nʼihi na ọ dị mmaIlu 24:13
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 24:13Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.
- Ọ bụrụ na ị chọta mmanụ aṅụ, rie naanị nke ga-ezuru gịIlu 25:16, Ilu 25:27
- Onye rijuru afọ na-asọ mmanụ aṅụ oyi; nye onye agụụ na-agụ, ihe ilu na-atọ ụtọIlu 27:7
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 27:7Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
- Ọ dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụAbụ 19:10
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 19:10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
- Egbugbere ọnụ gị, nwunye ọhụrụ m, na-atọ ụtọ dịka ụbụbọ mmanụ aṅụAbụk 4:11
Amaokwu ndị ahụ
Abụk 4:11Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.