Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ịgbasi ozu na ụda olili

Nkọwa ndị na-eju anya

Ịgbasi ozu na ụda olili nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (18), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Josef mere ka ndị dibịa ya gbasie ozu Jekọb nna yaJen 50:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 50:2Josef nyere iwu, ka ndị dibịa na-ejere ya ozi gbasie ozu nna ya. Ya mere, ndị dibịa ahụ gbasikwara Izrel.
  • Ịgbasi ozu ahụ were iri ụbọchị anọ; ndị Ijipt ruru ụjụ iri ụbọchị asaaJen 50:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 50:3O were ha iri ụbọchị anọ ịgbasi ozu, nʼihi na nke a bụ oge o kwesiri iwe ha ime ya. Mgbe nke a gasịrị, a kwara ya nʼala Ijipt iri ụbọchị asaa.
  • Josef nwụrụ mgbe ọ gbara afọ 110, e gbasie ozu ya, tinye ya nʼigbe ozu nʼIjiptJen 50:26
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 50:26Josef nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri. Ha gbasiri ozu ya, tinye ya nʼime igbe ozu, nʼala Ijipt.
  • Mosis buuru ọkpụkpụ Josef site nʼIjipt, dịka Josef rịọrọỌpụ 13:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 13:19Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.”
  • E liri ọkpụkpụ ya na Shekem, nʼala Jekọb zụrụJos 24:32
    Amaokwu ndị ahụ
    Jos 24:32Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef.

Ụda na akwa linin

  • E tọgbọrọ eze Asa nʼelu ihe ịdọba ozu jupụtara nʼụda na mmanụ isi ụtọ a gwọkọtara2Ih 16:14
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ih 16:14Ha liri ya nʼili nke ọ waara onwe ya nʼobodo Devid. Ha dobere ya nʼelu ihe ịdọba ozu nke jupụtara na ụda dị iche iche, na mmanụ na-esi isi ụtọ nke a gwọkọtara nke ọma, surekwara ya ihe nsure ọkụ nʼebe ọ dị ukwuu iji kwanyere ya ugwu.
  • E mere nnukwu ọkụ iji sọpụrụ Asa; e meghị nke ọbụla maka Jehoram2Ih 16:14, 2Ih 21:19
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ih 16:14Ha liri ya nʼili nke ọ waara onwe ya nʼobodo Devid. Ha dobere ya nʼelu ihe ịdọba ozu nke jupụtara na ụda dị iche iche, na mmanụ na-esi isi ụtọ nke a gwọkọtara nke ọma, surekwara ya ihe nsure ọkụ nʼebe ọ dị ukwuu iji kwanyere ya ugwu.
    2Ih 21:19Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.
  • Mata: “ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ”Jọn 11:39
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 11:39Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”
  • Lazarọs pụtara, e ji akwa ozu kee ya, were akwa ịchafu kechie ihu yaJọn 11:44
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 11:44Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”
  • Jisọs: o tere ahụ m mmanụ tupu oge iji kwado ya maka oliliMak 14:8, Jọn 12:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 14:8O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya.
    Jọn 12:7Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m.
  • Nikọdimọs wetara ọtụtụ máá na aloosJọn 19:39
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 19:39Nikọdimọs, onye ahụ bịakwutere Jisọs nʼabalị na mbụ, bịakwara. O wetara máá na aloos a gwakọtara agwakọta, nke ọtụtụ ya ruru ihe dịka kilogram iri atọ na anọ.
  • E ji akwa linin na ụda fụchie ahụ Jisọs, dịka omenala olili ndị JuuJọn 19:40
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 19:40Ha buuru ahụ Jisọs, tee ya ụda ndị ahụ, fụchikwaa ya nʼakwa ọcha linin dịka omenaala olili ozu nke ndị Juu si dị.
  • Ndị inyom kwadoro ụda na mmanụ isi ụtọ, emesịa zuru ike nʼụbọchị izuikeLuk 23:55–56
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 23:55–56Ndị nwanyị ahụ sitere Galili soro ya hụrụ ili ahụ, hụkwa otu e si nibe ahụ ya nʼime ya. Emesịa ha laghachiri ga kwadoo mmanụ otite nke e tinyere ọtụtụ ụda. Nʼụbọchị izuike ha zukwara ike dịka ọ dị nʼiwu.
  • Mgbe ụbọchị izuike gafere, ha zụtara ụda iji tee ahụ ya mmanụMak 16:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 16:1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ.
  • Nʼisi ụtụtụ nke ụbọchị mbụ, ha bu ụda ahụ gaa nʼiliLuk 24:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 24:1Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ.
  • Pita hụrụ akwa ozu ahụ, na akwa e ji kechie isi ka a fụkọtara icheJọn 20:6–7
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 20:6–7Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.