Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Snoo

Nkọwa ndị na-eju anya

Snoo nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (17), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, Benaya gburu ọdụm nʼime olulu2Sa 23:20
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 23:20Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
  • O nweela mgbe mmiri oyi kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn?Jer 18:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 18:14O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn? O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi, nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?
  • Iyi na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi na-agbazeJob 6:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 6:16nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi, nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.
  • Chineke gwara snoo, “Daa nʼelu ala”Job 37:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 37:6Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’ na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’
  • Ị banyela nʼụlọ ebe a na-achịkọba snoo?Job 38:22
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 38:22“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,
  • Ọ na-atụsa snoo dịka ajị anụAbụ 147:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 147:16Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.
  • Mmiri na mkpụrụ mmiri si nʼeluigwe na-ede ala mmiri, mee ka ihe ubi pupụtaAịz 55:10
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 55:10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri.
  • Dịka snoo dara nʼelu ZalmonAbụ 68:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 68:14Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a, ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon.

Okwu nʼIlu

  • Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi dịka mmiri oyi nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubiIlu 25:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 25:13Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.
  • Dịka mkpụrụ mmiri nʼoge ọkọchị, nsọpụrụ ekwesighị onye nzuzuIlu 26:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 26:1Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.
  • Oge oke oyi adịghị eche ya uche; ndị ezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyiIlu 31:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 31:21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.

Ọcha dịka snoo

  • Aka Mosis, Miriam na Gehazi: ekpenta, na-acha ezi ọchaỌpụ 4:6, Ọnụ 12:10, 2Ez 5:27
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 4:6Onyenwe anyị gwara ya okwu ọzọ sị, “Tinye aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mgbe Mosis tinyere aka ya wepụta ya, ọ chọpụtara na ekpenta jupụtara nʼaka ahụ nke na-enwu ezi ọcha.
    Ọnụ 12:10Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta,
    2Ez 5:27Nʼihi nke a, ekpenta ahụ dị Neeman ga-abịakwasị gị, na ụmụ ụmụ gị, ruo mgbe ebighị ebi.” Ya mere, Gehazi ghọrọ onye ekpenta si nʼihu ya pụọ. Anụ ahụ ya bidokwara ịcha ọcha dịka ogho ọcha.
  • Job: a sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ mJob 9:30
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 9:30A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,
  • Ekpere Devid: saa m, aga m adị ọcha karịa snooAbụ 51:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 51:7Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
  • Mmụọ ozi nʼili: uwe na-acha ọcha dịka akụmmiri igweMat 28:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 28:3Ihu ya na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka akụmmiri igwe.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.