Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Awa na nche abalị

Nkọwa ndị na-eju anya

Awa na nche abalị nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (49), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • “Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ”Jen 1:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 1:5Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ.
  • Jisọs: “Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị?”Jọn 11:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 11:9Jisọs zara, “Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na ọ na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ.
  • Ije otu ụbọchị: Ịlaịja jere ruo ebe ahụ nʼọzara1Ez 19:4
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 19:4Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m Onyenwe anyị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.”
  • Njem otu ụbọchị izuike: site nʼUgwu Oliv ruo JerusalemỌrụ 1:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 1:12Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem.
  • Ụbọchị Nkwadebe: ụbọchị tupu Ụbọchị IzuikeMak 15:42, Jọn 19:31
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 15:42Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe,
    Jọn 19:31Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha.
  • Nehemaya mechiri ọnụ ụzọ ama mgbe uhuruchi na-abịa tupu Ụbọchị IzuikeNeh 13:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Neh 13:19Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike.
  • Onyinyo ahụ laghachiri azụ ihe nrigo iri nʼihe nrigo Ehaz2Ez 20:9–11
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 20:9–11Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama Onyenwe anyị nye gị na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?” Hezekaya zara sị, “Ọ dị mfe ka onyinyo gaa nʼihu nzọ ụkwụ iri. Ma mee ka onyinyo a laa azụ ihe nrigo iri.” Mgbe ahụ, Aịzaya, onye amụma rịọrọ Onyenwe anyị ka o meere Hezekaya nke a. Onyenwe anyị mekwara ka onyinyo laghachi azụ ihe nrigo iri dịka o si gbada nʼihe nrigo ụlọ Ehaz.

Nche abalị

  • Abụ Akwa: “kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị”Akw 2:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Akw 2:19Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.
  • Gidiọn bịara mgbe etiti abalị gabigasịrị, mgbe ha ka gbanwere ndị ncheNkp 7:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 7:19Nʼabalị ahụ, mgbe etiti abalị ahụ gabigasịrị, Gidiọn na narị ndị agha ya gbeere egbere ruo na mpụta ebe ndị agha Midia mara ụlọ ikwu ha. Nʼoge a, ha ka gbanwere ndị agha na-eche nche.
  • Nʼisi ụtụtụ, ọgbaaghara batara nʼogige ndị IjiptỌpụ 14:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 14:24Nʼisi ụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha.
  • Sọl busoro ogige ndị Amọn agha nʼisi ụtụtụ1Sa 11:11
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 11:11Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara.
  • Jisọs jere ije nʼelu osimiri nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụMat 14:25, Mak 6:48
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 14:25Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri.
    Mak 6:48Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.
  • Onyenwe ụlọ nwere ike ịlọta nʼetiti abalị maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụLuk 12:38
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 12:38Ngọzị ga-adịrị ndị ohu ahụ onye nwe ha ga-ahụ ka ha nọ na njikere, ọ bụladị ma ọ lọghachiri nʼetiti abalị, maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụ.
  • Nʼuhuruchi, nʼetiti abalị, mgbe oke ọkpa kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụMak 13:35
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 13:35“Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ.
  • Onye ọbụ abụ na-atụgharị uche ogologo abalị niileAbụ 63:6, Abụ 119:148
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 63:6Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.
    Abụ 119:148Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.

Awa nke ụbọchị

  • Pita: “ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ”Ọrụ 2:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 2:15Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ.
  • Ndị ọrụ e goro nʼelekere itoolu nke ụtụtụ, nʼelekere iri na abụọ, nʼelekere atọ na nʼelekere iseMat 20:3, Mat 20:5–6
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 20:3“Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ.
    Mat 20:5–6Ya mere ha gara. “Ọ pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ. Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?’
  • Mgbe anyasị ruru, a kwụrụ mmadụ niile ụgwọ, ndị ikpeazụ e goro buru ụzọMat 20:8–9
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 20:8–9“Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.’ “Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị.
  • Ọ bụ nʼelekere itoolu nke ụtụtụ ka a kpọgidere Jisọs nʼobeMak 15:25
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 15:25Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ.
  • Ọchịchịrị site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọMat 27:45, Mak 15:33, Luk 23:44
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 27:45Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile.
    Mak 15:33Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie.
    Luk 23:44Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie.
  • Pailet: “Leenụ eze unu!” Ọ bụ ihe dịka nʼoge ehihieJọn 19:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 19:14Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!”
  • Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ nwa onye ọrụ ụlọeze nʼelekere mbụ nke ehihieJọn 4:52
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 4:52Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.”
  • Ndị na-eso ụzọ abụọ sooro Jisọs ihe dị ka elekere anọ nke mgbedeJọn 1:39
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 1:39Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede.
  • Pita na Jọn gara nʼụlọnsọ nʼoge ekpere, nʼelekere atọ nke ehihieỌrụ 3:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 3:1Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie.
  • Kọnelịọs na-ekpe ekpere nʼihe dịka elekere atọ nke ehihieỌrụ 10:3, Ọrụ 10:30
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 10:3Otu ụbọchị, nʼihe dịka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ ebe otu mmụọ ozi nke Chineke bịakwutere ya sị ya, “Kọnelịọs!”
    Ọrụ 10:30Kọnelịọs sịrị, “Nʼụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nʼoge ehihie nʼụlọ m, nʼihe dịka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m nwoke yi uwe na-enwu ọcha ka o guzoro nʼihu m.
  • Pita rigooro nʼelu ụlọ ikpe ekpere nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihieỌrụ 10:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 10:9Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere.
  • Ndị agha pụrụ gaa Sizaria nʼelekere itoolu nke abalịỌrụ 23:23
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 23:23Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a.

Ụtụtụ, ehihie na etiti abalị

  • Daniel na-ekpe ekpere ugboro atọ kwa ụbọchị, oghereikuku ya meghere chee ihu JerusalemDan 6:10
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 6:10Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ.
  • Abụ ọma: “Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị”Abụ 55:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 55:17Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị, ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya ma ọ na-anụkwa olu m.
  • Ebraham nọdụrụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ya nʼoke okpomọkụ ehihieJen 18:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 18:1Onyenwe anyị gosiri Ebraham onwe ya nʼakụkụ osisi ukwu dị na Mamre, mgbe Ebraham nọdụrụ ala nʼihu ụlọ ikwu ya, nʼetiti ehihie.
  • Aịzik pụrụ nʼọhịa nʼuhuruchiJen 24:63
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 24:63Aịzik pụtara ịtụgharị uche nʼọhịa nʼoge uhuruchi. Ọ lepụrụ anya hụ ọtụtụ ịnyịnya kamel na-abịanụ.
  • A na-egbu atụrụ Ngabiga nʼabalịỌpụ 12:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 12:6Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya.
  • Ịlaịja kpere ekpere nʼoge aja anyasị1Ez 18:36
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 18:36Mgbe oge e ji achụ aja anyasị ruru, Ịlaịja, onye amụma bịara ebe ịchụ aja ahụ nso kpee ekpere sị, “O, Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Izrel, biko gosi taa na ọ bụ gị onwe gị bụ naanị Chineke nʼIzrel, na mụ onwe m bụkwa ohu gị. Gosikwa na m bụ onyeozi gị, na ọ bụ ihe i nyere m nʼiwu ka m mere oge ndị a niile.
  • Ndị ikom Nehemaya ji ube site nʼìhè mbụ nke ụtụtụ ruo mgbe kpakpando pụtaraNeh 4:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Neh 4:21Ya mere, anyị nọgidere nʼọrụ anyị site nʼìhè mbụ nke ụtụtụ rụọ mgbe kpakpando pụtara. Ọkara nʼime ndị ọrụ jikwa ùbe nọrọ na nche.
  • Nʼetiti abalị, Samsin foro ibo ọnụ ụzọ ama obodo GazaNkp 16:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 16:3Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu.
  • Nʼetiti abalị, Boaz tetara hụ nwanyị dina nʼala ala ụkwụ yaRut 3:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Rut 3:8Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.
  • Ihe dị ka etiti abalị, Pọl na Saịlas kpere ekpere, bụọ abụỌrụ 16:25
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 16:25Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị.
  • Pọl kwuru okwu ruo etiti abalị, Yutikọs si na windo daaỌrụ 20:7, Ọrụ 20:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 20:7Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị.
    Ọrụ 20:9Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ.
  • Oke ọkpa kwara akwa nke ugboro abụọ, Pita echetaMak 14:30, Mak 14:72
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 14:30Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
    Mak 14:72Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa.
  • Nʼisi ụtụtụ nke ụbọchị mbụ, mgbe anyanwụ wara, ha gara nʼiliMak 16:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 16:2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.