Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ara, nke ezi na nke e mere ka ọ dị

Nkọwa ndị na-eju anya

Ara, nke ezi na nke e mere ka ọ dị nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (22), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Ilu: onye na-aghọgbu ibe ya ma sị “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu” dị ka onye araIlu 26:18–19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 26:18–19Dịka onye ara na-agba àkụ na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ, ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.”

Devid na Gat

  • Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ, bịakwute Akish eze Gat1Sa 21:10
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 21:10Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat.
  • Ndị ozi Akish matara ya, ụjọ tụkwara Devid nke ukwuu1Sa 21:11–12
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 21:11–12Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị: “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?” Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya.
  • O mere ka onye ara, na-akaka akara nʼibo ọnụ ụzọ, ọnụ mmiri na-agụsasị nʼafụọnụ ya1Sa 21:13
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 21:13Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.
  • Akish: “Ndị na-ayị ara ha kọrọ m”1Sa 21:14–15
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 21:14–15Akish gwara ndị ozi ya okwu sị ha, “Leenụ nwoke a! Ọ bụ onyeisi mebiri! Gịnị mere unu ji kpọtara m ya? Ndị na-ayị ara ha kọrọ m, nke mere unu ji kpọtara m nwoke a nʼebe a ka ọ bịa na-eme ka onye na-ayị ara nʼihu m? O kwesiri ka onye dị otu a bata nʼụlọ m?”
  • Okwu mmalite Abụ Ọma 34 na-echeta ya: o mere ka onye na-ayị araAbụ 34:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 34:1Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.

Ndị ọzọ

  • Sọl, mmụọ nsogbu na-esogbu, nwere ahụ iru ala site nʼụbọ Devid1Sa 16:14–16, 1Sa 16:23
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 16:14–16Ugbu a, Mmụọ Onyenwe anyị esitela nʼime Sọl pụọ, Onyenwe anyị zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl. Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu. Biko, ka onyenwe anyị nye ndị ohu ya nọ nʼebe a ike, ka ha gaa chọta onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ ga-akpọ ụbọ akwara mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa bịakwasịrị gị, ime ka ahụ dị gị mma.”
    1Sa 16:23Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ si nʼebe Chineke nọ bịa malitere inye Sọl nsogbu, Devid na-akpọ ụbọ akwara ya. Ahụ Sọl na-adajụkwa, mmụọ ọjọọ ahụ na-esitekwa nʼebe ọ nọ wezuga onwe ya.
  • E mesịa, mgbe Devid na-akpọ ụbọ, Sọl tụrụ ya ube1Sa 18:10–11
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 18:10–11Nʼechi ya, mmụọ ọjọọ Chineke zitere bịara dakwasị Sọl, ọ malitekwara ibu amụma nʼụlọ ya. Ma Devid kpọrọ ụbọ akwara dịka ọ na-eme mgbe ọbụla. Ma nʼoge a, o nwere ùbe dị Sọl nʼaka. Ọ tụrụ ùbe ahụ, kwuo nʼobi ya sị, “Aga m atụgide Devid nʼaja ụlọ ahụ.” Ma Devid wezugara onwe ya, ugboro abụọ ndị a.
  • Nebukadneza tara ahịhịa dịka ehi; agịrị isi ya tolitere dịka nku ugoDan 4:33
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 4:33Nʼotu oge ahụ kwa, okwu ndị a e kwuru banyere Nebukadneza mezuru. E sitere nʼetiti ụmụ mmadụ chụpụ ya, ọ gakwara nʼọhịa taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ ya ruo mgbe ajị dị ya nʼahụ toro ogologo dịka nku ugo, mbọ ụkwụ na aka ya dịkwa ka mbọ ụmụ nnụnụ.
  • Uche ya lọghachitere, e nyeghachikwa ya ocheeze yaDan 4:34, Dan 4:36
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 4:34Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye ọchịchị ya na-adịghị agwụ agwụ, onye alaeze ya na-adị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
    Dan 4:36Mgbe uche m laghachiri dịka mmadụ, enwetaghachikwara m ugwu na nsọpụrụ na alaeze m. Ndị na-adụ m ọdụ laghachikwara bịakwute m, ha na ndị na-ejere m ozi. E mekwara ka m bụrụkwa eze ọzọ nʼalaeze m. Ugwu na nsọpụrụ m nwere ugbu a karịrị ugwu na nsọpụrụ m nwere nʼoge gara aga.
  • Onye nche: ọ na-agba ịnyịnya dịka Jehu, dịka onye ara!2Ez 9:20
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 9:20Onye ahụ nọ na-eche nche sịrị, “Ọ garuola ha nso, ma ọ dịghị alọghachitekwa azụ. Ma ọgbụgba ịnyịnya dịka ọ bụ Jehu nwa Nimshi, nʼihi na ọ na-agba ịnyịnya ya dịka onye na-ayị ara.”
  • Ndịisi agha ibe Jehu kpọrọ onye amụma nta ahụ “onye ara ahụ”2Ez 9:11
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 9:11Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”
  • Akwụkwọ ozi: a ga-etinye onye ara ọbụla na-eme ka onye amụma nʼosisi mkpọrọJer 29:26
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 29:26‘ Onyenwe anyị ahọpụtala gị mee gị onye nchụaja ga-anọchi anya Jehoiada. Nʼihi ya, ị bụrụla onyeisi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya mere, o kwesiri ka i jide onye ara ọbụla na-akpọ onwe ya onye amụma, manye ya agbụ igwe nʼụkwụ, na nʼolu ya.
  • Otu nwoke bi nʼetiti ili na-agbaji agbụ ya, were nkume na-egbu onwe yaMak 5:3–5
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 5:3–5Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya. Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya. Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ.
  • E mesịa, ndị mmadụ hụrụ ya ka o yi uwe, uche ya zuruokeMak 5:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 5:15Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha.
  • Ezinaụlọ Jisọs bịara ịkpọrọ ya: “Isi adịghị ya mma”Mak 3:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 3:21Mgbe ndị ikwu ya nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nʼụlọ ha, nʼihi na ndị mmadụ na-asị, “Isi adịghị ya mma.”
  • Ụfọdụ kwuru banyere Jisọs: “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri”Jọn 10:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 10:20Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu, “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri. Ọ bara uru ige ya ntị?”
  • Roda kwuru na Pita nọ nʼọnụ ụzọ ama; ha sịrị na uche ya ezughị okeỌrụ 12:13–15
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 12:13–15Mgbe ọ kụrụ aka nʼọnụ ụzọ ama, otu odibo nwanyị aha ya bụ Roda bịara ka o zaa ya. Mgbe ọ nụrụ olu Pita, ọṅụ juru ya obi nke mere na ọ gbaara ọsọ laghachi azụ nʼemegheghị ụzọ. Ọ gara tisaa, “Ọ bụ Pita nọ nʼọnụ ụzọ!” Ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dịka onye uche ya na-ezughị oke. Mgbe ọ nọgidesịrị ike na-ekwu otu ihe ahụ, ha sịrị, “Ọ ghaghị ị bụ mmụọ ozi ya.”
  • Festọs: “Pọl, ị bụ onye isi mebiri!” Pọl: “Isi emebighị m”Ọrụ 26:24–25
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 26:24–25Mgbe ọ na-agọpụ onwe ya, Festọs tiri mkpu, “Pọl, ị bụ onye isi mebiri! Oke mmụta gị emebiela gị isi.” Ma Pọl sịrị, “Isi emebighị m, ezigbo nna anyị Festọs. Ihe m na-ekwu nʼanya udo bụ naanị eziokwu.
  • Pọl: ọ bụrụ na mmadụ niile asụ olu dị iche iche, ndị ọbịa ga-asị “isi emebiela ndị a”1Kọ 14:23
    Amaokwu ndị ahụ
    1Kọ 14:23Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a?

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.