Nyochaa › Isiokwu › Igodo, akara na mgbaaka akara
Nkọwa ndị na-eju anya
Igodo, akara na mgbaaka akara nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (27), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Igodo na ihe mkpọchi
- Ehud kpọchiri ọnụ ụzọ ọnụụlọ elu eze Eglọn mgbe ọ pụrụNkp 3:23
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 3:23Ya mere, Ehud pụrụ nʼezi, mechibido ya ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼọnụụlọ elu ahụ, kpọchie ha.
- Ndị ozi eze chere, emesịa were igodo meghee ọnụ ụzọNkp 3:24–25
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 3:24–25Mgbe ọ pụchara, ndị na-ejere eze ozi bịara chọọ ịbanye nʼụlọ ahụ. Ma mgbe ha hụrụ na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ ahụ akpọchi, ha kwuru nʼonwe ha sị, “Ọ ga-abụ na ọ na-anyụ nsị nʼụlọ mposi.” Ma mgbe oge dị anya gasịrị ma eze apụtaghị, ha enweghị ike ijide onwe ha ọzọ. Ha weere ọtụghe ụzọ tụghee ọnụ ụzọ ahụ, hụ ebe eze ha tọgbọrọ nʼala, nwụọ.
- Ndị Livayị na-eche ụlọ Chineke nche nʼabalị, na-emeghe ya kwa ụtụtụ1Ih 9:27
Amaokwu ndị ahụ
1Ih 9:27Ha na-eche nche gburugburu ụlọnsọ Chineke abalị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka ọ dị nʼaka iche ya nche. Ọ bụkwa ha ka e nyefere ọrụ imeghe ya ụtụtụ niile.
- E wughachiri ọnụ ụzọ ama Jerusalem ya na ibo ọnụ ụzọ, ihe mkpọchi na ihe ntụchiNeh 3:3
Amaokwu ndị ahụ
Neh 3:3Ụmụ ndị ikom Hasena wuru Ọnụ Ụzọ ama Azụ, dobe osisi ya, kwụba ọnụ ụzọ ya, kpụọkwa ihe mkpọchi ya niile, na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
Akara na mgbaaka akara
- Juda hapụrụ Tama mgbaaka akara ya, eriri ya na mkpanaka ya dịka ihe akaebeJen 38:18
Amaokwu ndị ahụ
Jen 38:18Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime.
- Tama: “mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a” — onye nwe ha?Jen 38:25
Amaokwu ndị ahụ
Jen 38:25Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.”
- Fero gbanyere Josef mgbaaka eze ya nʼakaJen 41:42
Amaokwu ndị ahụ
Jen 41:42Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ.
- Jezebel dere akwụkwọ ozi nʼaha Ehab, were akara ya kaa ha1Ez 21:8
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 21:8Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi.
- Ahasuerọs nyere Heman ọlaaka ikike yaEst 3:10
Amaokwu ndị ahụ
Est 3:10Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu
- E dere iwu Heman nʼaha eze, were ọlaaka ahụ kaa ya akaraEst 3:12
Amaokwu ndị ahụ
Est 3:12Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa mbụ, a kpọkọrọ ndị ode akwụkwọ eze niile. Ha depụtara nʼakwụkwọ isi obodo dị iche iche, nakwa nʼasụsụ ndị ọbụla, ihe niile Heman nyere nʼiwu nye ndị nnọchị anya eze niile, ndị ọchịchị nke ala niile ha na-achị, na ndịisi nke ndị ọbụla nọ nʼime alaeze a. E ji aha Ahasuerọs dee akwụkwọ ndị ahụ, werekwa mgbaaka eze nʼonwe ya kaa ya akara.
- E nyere Mọdekai ọlaaka ahụ a napụrụ HemanEst 8:2
Amaokwu ndị ahụ
Est 8:2Mgbe ahụ, eze wepụtara ọlaaka ikike ya, nke a gbapụtara site nʼaka Heman nye ya Mọdekai. Esta mekwara Mọdekai onye nlekọta akụnụba Heman.
- Iwu e ji ọlaaka eze kaa akara, a pụghị ịkagbu yaEst 8:8
Amaokwu ndị ahụ
Est 8:8Ugbu a, deenụ akwụkwọ ozi banyere ndị Juu niile, dee ihe ọbụla dị mma nʼanya unu nʼaha eze. Werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, nʼihi na ọ dịghị akwụkwọ ọbụla e dere nʼaha eze, kaakwa ya akara mgbaaka eze nke a pụrụ imegharị.”
- Mọdekai kara akwụkwọ ozi akara, ziga ha site nʼaka ndị ozi na-agba ịnyịnyaEst 8:10
Amaokwu ndị ahụ
Est 8:10Mọdekai dere akwụkwọ ahụ nʼaha eze, bụ Ahasuerọs, werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, zipụ akwụkwọ ndị a site nʼaka ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu, bụ ndị na-agba ịnyịnya ụkwụ ọsọ nke e leziri anya nke ọma zụọ maka ije ozi dịrị eze.
- E ji mgbaaka eze na mgbaaka ndịisi ya kaa olulu ọdụm akaraDan 6:17
Amaokwu ndị ahụ
Dan 6:17E wetara nkume dị ukwuu jiri mechie ọnụ olulu ọdụm ahụ. Eze jikwa mgbaaka akara ya na mgbaaka ndịisi ọzọ kaa akara e ji nyachie ọnụ olulu ahụ. E mere nke a ka ọnọdụ Daniel hapụ ịgbanwe.
- Ọgbụgba ndụ e dere ede, ndịisi, ndị Livayị na ndị nchụaja tinyere aha ha nʼime yaNeh 9:38, Neh 10:1
- Jeremaya binyere aka nʼakwụkwọ ire ala, kaa ya akara: otu nke e nyachiri, otu nke a na-anyachighịJer 32:10–11
Amaokwu ndị ahụ
Jer 32:10–11Emesịa, etinyere m aka m nʼakwụkwọ ire ala ahụ, kaa ya akara, nyachie ya, nʼihu ndị akaebe. Atụkwara m ọlaọcha ahụ nʼihe ọtụtụ. Eweere m akwụkwọ ịzụta ala ahụ a kara akara, nke a nyachikwara anyachi, ebe e dere ihe banyere ọzụzụ na orire nke ala ahụ, werekwa ụdị akwụkwọ ahụ nke a na-anyachighị anyachi,
- E tinyere akwụkwọ ndị ahụ nʼite ụrọ ka ha dịgide ogologo ogeJer 32:14
Amaokwu ndị ahụ
Jer 32:14‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Were akwụkwọ ndị a, ma nke a nyachiri anyachi, ma nke a na-anyachighị anyachi, tinye ha nʼime ite e ji ụrọ kpụọ, ebe ha ga-adị ogologo oge.
- E ji ịka nkume ahụ akara na idebe ndị nche mechizie ili JisọsMat 27:66
Amaokwu ndị ahụ
Mat 27:66Ya mere, ha kpọrọ ndị agha gaa mechizie ọnụ ili ahụ. Ha kakwara akara nʼelu nkume ahụ.
A kpụrụ dịka akara
- Nkume ọniks abụọ, e gbunyere aha ụmụ Izrel dịka akaraỌpụ 28:9, Ọpụ 28:11, Ọpụ 39:6
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 28:9“Were nkume ọniks abụọ, gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu ya,
Ọpụ 28:11Gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu nkume abụọ ndị ahụ, dịka onye ǹka si egbunye akara na nkume. Mgbe ahụ, hịọnye nkume ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo ahụ a kpara akpa,
Ọpụ 39:6Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara.
- Nkume iri na abụọ nke uwe obi, nke ọbụla e gbunyere aha ebo dịka akaraỌpụ 28:21, Ọpụ 39:14
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 28:21Ha niile ga-adị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
Ọpụ 39:14Ha dị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
- Efere ọlaedo e gbunyere dịka akara: IHE NSỌ DỊRỊ ONYENWE ANYỊỌpụ 28:36, Ọpụ 39:30
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 28:36“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee efere ntakịrị, gbunye akara dị otu a nʼelu ya: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
Ọpụ 39:30Ha mere efere, bụ okpu nsọ ahụ, site nʼọlaedo a nụchara anụcha, gbunyekwa akara nʼelu ya, dịka ihe e dere nʼelu mgbaaka akara: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
- Okwu nʼAbụ nke Abụ: “Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi”Abụk 8:6
Amaokwu ndị ahụ
Abụk 8:6Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.