Nyochaa › Isiokwu › Ndị na-arara mmadụ nye
Nkọwa ndị na-eju anya
Ndị na-arara mmadụ nye nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (26), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Judas
- Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị iri na abụọ, “onye raara ya nye”Luk 6:16
Amaokwu ndị ahụ
Luk 6:16Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye.
- Dịka onye na-ejide akpa ego, ọ na-ezu ego si na yaJọn 12:6
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 12:6O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego.
- Ọ jụrụ ndịisi nchụaja ihe ha ga-enye ya: iri mkpụrụ ọlaọcha atọMat 26:14–15
Amaokwu ndị ahụ
Mat 26:14–15Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja. Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ.
- Site nʼoge ahụ, ọ na-achọ ohere, mgbe igwe mmadụ na-anọghịMat 26:16, Mak 14:11, Luk 22:6
Amaokwu ndị ahụ
Mat 26:16Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha.
Mak 14:11Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha.
Luk 22:6O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ.
- Nʼoge nri anyasị, Jisọs kwuru: “otu onye nʼime unu ga-arara m nye”Mat 26:21
Amaokwu ndị ahụ
Mat 26:21Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”
- Judas: “Onye ozizi ọ bụ m?”Mat 26:25
Amaokwu ndị ahụ
Mat 26:25Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.”
- Jisọs nyere Judas iberibe achịcha o sunyere, Judas wee pụọ nʼabalịJọn 13:26, Jọn 13:30
- Judas maara ogige ahụ, nʼihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-anọ nʼebe ahụ mgbe mgbeJọn 18:2
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 18:2Judas, onye rara ya nye matakwara ebe ahụ. Nʼihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-anọ nʼebe ahụ ọtụtụ oge.
- Ọ bịara ya na ndị agha bu oriọna, ọwaọkụ na ngwa aghaJọn 18:3
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 18:3Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha.
- Ihe ịrịbama ahụ: “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ”Mat 26:48–49, Mak 14:44–45
Amaokwu ndị ahụ
Mat 26:48–49Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!” Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
Mak 14:44–45Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.” Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
- “Judas, ọ bụ site nʼisutu ọnụ ka i ji arara Nwa nke Mmadụ nye?”Luk 22:47–48
Amaokwu ndị ahụ
Luk 22:47–48Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe mmadụ bịara, onye du ha bụ onye a na-akpọ Judas, bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya. Ọ bịaruru Jisọs nso, isutu ya ọnụ. Ma Jisọs sịrị ya, “Judas, ọ bụ site nʼisutu ọnụ ka i ji arara Nwa nke Mmadụ nye?”
- O chegharịrị, weghachi ọlaọcha ahụ, kwụgbuo onwe yaMat 27:3–5
Amaokwu ndị ahụ
Mat 27:3–5Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.” Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ.
- E ji ego ahụ zụta ala ọkpụ ite, a na-akpọ ya “Ala Ọbara”Mat 27:7–8
Amaokwu ndị ahụ
Mat 27:7–8Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa. Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa.
- Nʼime Ọrụ Ndị Ozi, a na-akpọ ala ahụ AkeldamaỌrụ 1:18–19
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 1:18–19Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa. Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara.
Ndị ọzọ
- Otu nwoke Betel gosiri ndị nnyopụta ụzọ ịbanye; a hapụrụ ezinaụlọ ya ndụNkp 1:23–25
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 1:23–25Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz, ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.” Ya mere, nwoke ahụ gosiri ha ụzọ, ha ji mma agha gbuo mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ, ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinaụlọ ya ndụ.
- Onye ọbụla nʼime ndị eze Filistia kwere Delaịla ọlaọcha maka ihe nzuzo nke ike SamsinNkp 16:5
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 16:5Ndị eze ndị Filistia, bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.”
- Mgbe Samsin gwara ya ihe nzuzo ya, o ziri ozi kpọọ ha, ha wetara ego ahụNkp 16:18
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 16:18Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha.
- Doeg onye Edọm gwara Sọl na onye nchụaja na Nob nyeere Devid aka1Sa 22:9–10
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 22:9–10Ma Doeg onye Edọm, onye so ndị ozi Sọl guzo nʼebe ahụ kwuru sị, “Ahụrụ m mgbe nwa Jesi bịakwutere Ahimelek, nwa Ahitub na Nob. Ahimelek jụtaara ya ase site nʼaka Onyenwe anyị, ma nyekwa ya ihe oriri na mma agha Golaịat onye Filistia.”
- Devid matara na ndị nwe Keila ga-arara ya nye nʼaka Sọl1Sa 23:12
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 23:12Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?” Onyenwe anyị sịrị, “Ha ga-eme otu a.”
- Ahitofel, onye ndụmọdụ Devid, sonyere nʼizuzu Absalọm2Sa 15:12, 2Sa 15:31
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 15:12Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa.
2Sa 15:31Mgbe a gwara Devid na Ahitofel onye na-adụ ya ọdụ dịnyere Absalọm, Devid kpere ekpere sị, “O Onyenwe anyị, biko, tụgharịa ndụmọdụ Ahitofel ka ọ bụrụ ndụmọdụ nzuzu.”
- Mgbe e meghị ndụmọdụ ya, Ahitofel laa nʼụlọ ya, kwụgbuo onwe ya2Sa 17:23
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 17:23Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.