Nyochaa › Isiokwu › Agịrị isi na afụọnụ
Nkọwa ndị na-eju anya
Agịrị isi na afụọnụ nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (36), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- A gụọla ọ bụladị agịrị isi niile dị unu nʼisiMat 10:30, Luk 12:7
- Ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị ojiMat 5:36
Amaokwu ndị ahụ
Mat 5:36Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji.
- Pọl: agịrị isi ogologo bụ ihere nye nwoke, ebube nye nwanyị1Kọ 11:14–15
Amaokwu ndị ahụ
1Kọ 11:14–15Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo. Ma ọ bụrụ na nwanyị enwee agịrị isi dị ogologo ọ bụ ihe otuto nye ya nʼihi na e nyere ya agịrị isi dị ogologo ka ọ bụrụ ihe mkpuchi.
- Isi a kpara akpa abụghị ebe ịma mma kwesiri isi1Tm 2:9, 1Pt 3:3
Amaokwu ndị ahụ
1Tm 2:9Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. Ọ bụghị isi a kpara akpa, ma ọ bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi.
1Pt 3:3Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma.
Nʼime Iwu
- Akpụchala agịrị isi dị nʼakụkụ isi, maọbụ bie ọnụ ọnụ afụọnụLev 19:27
Amaokwu ndị ahụ
Lev 19:27“ ‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu.
- Ndị nchụaja agaghị akpụcha isi ha, maọbụ akụkụ afụọnụ haLev 21:5
Amaokwu ndị ahụ
Lev 21:5“ ‘Ndị nchụaja ekwesighị ịkpụcha isi ha, maọbụ kpụchapụ akụkụ afụọnụ ha, maọbụ kaa ihe ọbụla nʼakpụkpọ ahụ ha.
- Akpụchala agịrị isi dị nʼegedege ihu nʼihi onye nwụrụ anwụDit 14:1
Amaokwu ndị ahụ
Dit 14:1Unu onwe unu bụ ụmụ Onyenwe anyị Chineke unu, ya mere unu egbula onwe unu mma, maọbụ kpụchapụ agịrị isi dị nso nso egedege ihu unu nʼihi onye nwụrụ anwụ.
- Nwoke agịrị isi ya na-agwụ ka dị ọchaLev 13:40–41
Amaokwu ndị ahụ
Lev 13:40–41“Mgbe ajị na-adịghịkwa nwoke nʼisi, ọ bụ isi nkwọcha, onye ahụ dị ọcha. Otu aka ahụ, ọ bụrụ na isi ya esite nʼegedege ihu ya kwọchasịa, ọ bụghị ekpenta, onye dị ọcha ka ọ bụ.
- Onye Nazirait na-ahapụ agịrị isi ya ka o too, kpọọ ya ọkụ mgbe nkwa ya gwụrụỌnụ 6:5, Ọnụ 6:18
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 6:5“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.
Ọnụ 6:18“ ‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ.
Ihe atụ
- Josef kpụrụ afụọnụ tupu ọ banye nʼihu FeroJen 41:14
Amaokwu ndị ahụ
Jen 41:14Ya mere Fero ziri ozi ka a kpọọ Josef. E mere ngwangwa wepụta ya site nʼụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ọ kpụchara afụọnụ ya, gbanwee uwe ya, ọ bịakwara nʼihu Fero.
- Agụba agaghị aba nʼisi SamsinNkp 13:5, Nkp 16:17
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 13:5Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.”
Nkp 16:17Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.”
- Delaịla mere ka a kpụchaa ya isi; emesịa agịrị isi ya bidoro itoliteNkp 16:19, Nkp 16:22
- Devid mere ka ọnụ mmiri na-agụsasị nʼafụọnụ ya, na-eme ka onye ara1Sa 21:13
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 21:13Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.
- Hanọn kpụchapụrụ ọkara afụọnụ ndị ozi Devid2Sa 10:4
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 10:4Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.
- Devid: nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere2Sa 10:5
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 10:5Mgbe a gwara Devid ihe mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa zute ndị ikom ahụ, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”
- Agịrị isi Absalọm na-akpụ kwa afọ dị arọ narị shekel abụọ2Sa 14:26
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 14:26Mgbe ọbụla ọ kpụchara ntutu isi ya, nʼihi na ọ bụ otu ugboro nʼafọ ka ọ na-akpụcha agịrị isi mgbe o bidoro ịnyị ya arọ. Ọ na-atụ agịrị isi a na-akpụchapụta ya nʼisi, ịdị arọ ya na-eru narị shekel abụọ ma a tụọ ya nʼihe ọtụtụ eze.
- Mefiboshet akpụghị afụọnụ ya mgbe Devid nọ nʼebe ọzọ2Sa 19:24
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 19:24Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo.
- Joab jidere Amasa nʼafụọnụ dịka ọ chọrọ isutu ya ọnụ2Sa 20:9
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 20:9Joab kelere Amasa sị ya, “Kedụ ka ị dị nwanna m.” Mgbe ahụ, Joab ji aka nri ya jide Amasa nʼahụọnụ isutu ya ọnụ,
- Ịlaịja bụ nwoke ajị jupụtara, kere ihe okike akpụkpọ anụ nʼukwu2Ez 1:8
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 1:8Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ nwoke yi uwe e ji ajị anụ kpaa; o kere ihe okike akpụkpọ anụ nʼukwu ya.” Eze sịrị, “Ọ bụ Ịlaịja, onye amụma si Tishbe!”
- Ụmụ okorobịa nta kwara Ịlaisha emo: “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!”2Ez 2:23
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 2:23Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!”
- Afụọnụ Erọn na mmanụ dị oke ọnụahịa na-asọda na yaAbụ 133:2
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 133:2Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ, e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn, ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.
- Job kpụchara agịrị isi ya nʼihi mwuteJob 1:20
Amaokwu ndị ahụ
Job 1:20Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala,
- Ezra dọpụrụ agịrị isi ya na afụọnụ ya nʼihi ụjọEzr 9:3
Amaokwu ndị ahụ
Ezr 9:3Ma mgbe m nụrụ nke a, adọwara m uwe ahụ m na uwe mwụda m, dọpụkwa ụfọdụ agịrị isi nke isi m, na ajị afụọnụ m, nọdụkwa ala nʼọnọdụ mgbagwoju anya.
- Ndị iri asatọ na-eru ụjụ kpụchara afụọnụ ha bịa nʼụlọ Onyenwe anyịJer 41:5
Amaokwu ndị ahụ
Jer 41:5o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo Shekem, na Shaịlo na Sameria buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
- Agịrị isi Nebukadneza tolitere dịka nku ugoDan 4:33
Amaokwu ndị ahụ
Dan 4:33Nʼotu oge ahụ kwa, okwu ndị a e kwuru banyere Nebukadneza mezuru. E sitere nʼetiti ụmụ mmadụ chụpụ ya, ọ gakwara nʼọhịa taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ ya ruo mgbe ajị dị ya nʼahụ toro ogologo dịka nku ugo, mbọ ụkwụ na aka ya dịkwa ka mbọ ụmụ nnụnụ.
- Otu nwanyị ji agịrị isi ya hichaa ụkwụ JisọsLuk 7:38, Jọn 12:3
Amaokwu ndị ahụ
Luk 7:38Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha.
Jọn 12:3Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ.
- Pọl kpụchara agịrị isi ya na Senkria nʼihi nkwaỌrụ 18:18
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 18:18Mgbe ọ nọsịrị nʼebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, Pọl sịrị ndị kwere ekwe nọ nʼebe ahụ ka ha nọdụnụ nke ọma, ma si nʼebe ahụ banye nʼụgbọ mmiri ruo Siria. Prisila na Akwila sokwaara ya gaa. Nʼobodo a na-akpọ Senkria, ọ kpụchara agịrị isi ya, nʼihi nkwa o kwere.
Nʼoge iru ụjụ
- Isi a kpụchara akpụcha na afụọnụ e bipụrụ dịka ihe ngosi iru ụjụAịz 15:2, Jer 48:37, Mai 1:16
Amaokwu ndị ahụ
Aịz 15:2Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.
Jer 48:37A kpụchapụla agịrị isi niile, kpachakwa afụọnụ ha niile. E bipụkwala aka ha niile. Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile.
Mai 1:16Kpachaanụ isi unu nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi ụmụntakịrị ndị ahụ ihe ha masịrị unu, meenụ ka isi unu kwọchaa dịka isi udele, nʼihi na a ga-achụpụ ha site nʼebe unu nọ gaa mba ọzọ.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.