Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ụbọchị ọmụmụ

Nkọwa ndị na-eju anya

Ụbọchị ọmụmụ nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (8), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Nʼụbọchị ncheta ọmụmụ Fero, ọ kpọrọ ndị ozi ya oririJen 40:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 40:20Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri.
  • Nʼụbọchị ahụ, o weghachiri onyeisi ndị na-ebu iko nʼọrụ ya, kwụgbuo onyeisi ndị na-esi nriJen 40:21–22
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 40:21–22O nyeghachiri onyeisi ndị na-ebu iko ya ọrụ ya, weghachi ya nʼọnọdụ ya. Nwoke a bunyekwara Fero iko ya dịka o si eme na mbụ. Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka Josef si kọwaa nrọ ha.
  • Nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya, Herọd kpọrọ ndị ndu Galili oririMak 6:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 6:21Nʼikpeazụ, ohere bịara mgbe Herọd kpọrọ oriri nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya nye ndị ọkwa ha dị elu nʼokpuru ọchịchị ya, ndịisi ndị ọchịagha na ndị bụ ndị ndu nʼobodo Galili.
  • Ada Herodịas tere egwu, rịọọ isi JọnMat 14:6–8
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 14:6–8Ma mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herodịas tere egwu nʼihu Herọd, na nʼihu ndị ọbịa bịara nʼụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu. Nke a mere o ji ṅụọ iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ. Ma dị ka nne ya si haziere ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, “Nye m isi Jọn omee baptizim nʼefere ugbu a.”
  • Job bụrụ ụbọchị a mụrụ ya ọnụJob 3:1–3
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 3:1–3Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ. Job sịrị: “Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi; ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’
  • Jeremaya: ka ụbọchị a mụrụ m bụrụ ihe a bụrụ ọnụJer 20:14, Jer 20:18
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 20:14Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ. Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị.
    Jer 20:18Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute, na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?
  • Ezi aha ka mmanụ isi ụtọ mma, ụbọchị ọnwụ ka ụbọchị ọmụmụ mmaEkl 7:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 7:1Ezi aha ka mma karịa mmanụ isi ụtọ. Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.