Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Akpụkpọ, ite na karama

Nkọwa ndị na-eju anya

Akpụkpọ, ite na karama nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (31), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Akpụkpọ maka mmiri, mmanya na mmiri ara

  • Ebraham nyere Hega achịcha na karama akpụkpọ mmiriJen 21:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 21:14Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba.
  • Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ gwụrụ, ọ hụrụ olulu mmiri, kujuo yaJen 21:15, Jen 21:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 21:15Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa.
    Jen 21:19Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ.
  • Jael nyere Sisera ihe ọṅụṅụ site na karama akpụkpọ mmiri araNkp 4:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 4:19Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Akpịrị na-akpọ m nkụ, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” O meghere karama akpụkpọ mmiri ara ehi, nye ya ihe ọṅụṅụ, jirikwa akwa ahụ sachie ya.
  • Ndị Gibiọn gosiri karama akpụkpọ mmanya ochie, gbawara agbawa, e duchiri eduJos 9:4, Jos 9:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Jos 9:4ha sitere nʼaghụghọ chọọ ụzọ ha ga-esi zọpụta onwe ha. Ha zipụrụ ndị ozi, ndị bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa mere ochie, na karama akpụkpọ mere ochie, nke a duchiri ebe dị iche iche nʼahụ ha.
    Jos 9:13A gbajuru karama akpụkpọ anyị ndị a mmanya ọhụrụ mgbe anyị hapụrụ, ma ugbu a, karama ndị a adọwaala. Uwe anyị, na akpụkpọụkwụ anyị, emeela ochie nʼihi ịga ije dị anya.”
  • Hana duuru Samuel gaa Shaịlo ya na oke ehi, ụtụ ọka na karama mmanya1Sa 1:24
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 1:24Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo.
  • Ndị ikom atọ na-aga Betel: ụmụ ewu, ogbe achịcha atọ na karama mmanya1Sa 10:3
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 10:3“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya.
  • Jesi zigara Devid nʼebe Sọl nọ ya na achịcha, karama akpụkpọ mmanya na nwa ewu1Sa 16:20
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 16:20Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl.
  • Abigel wetaara Devid karama akpụkpọ mmanya abụọ na ọtụtụ nri1Sa 25:18
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 25:18Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu.
  • Ziba zutere Devid ya na ịnyịnya ibu bu ibu na karama akpụkpọ mmanya2Sa 16:1
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 16:1Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya.
  • Jisọs: ọ dịghị onye na-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochieMat 9:17, Mak 2:22, Luk 5:37–38
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 9:17Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie, nʼihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-echekwa ha abụọ nke ọma.”
    Mak 2:22Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”
    Luk 5:37–38Nʼụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị agbanye mmanya ọhụrụ dị ike nʼime karama akpụkpọ ochie. Nʼihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama ahụ a laa nʼiyi. Ma ọ dị mma ịgbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.
  • Elihu: afọ m dị njikere ịgbawa dịka karama akpụkpọ ọhụrụJob 32:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 32:19Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.
  • Onye ọbụ abụ: dịka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụAbụ 119:83
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 119:83Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile.
  • Onye ọbụ abụ: “chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị”Abụ 56:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 56:8Depụta akwa arịrị m; chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị. Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?

Ite na karama

  • Ribeka pụtara, ite ya dị nʼubu yaJen 24:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 24:15Tupu o kpechaa ekpere a, lekwa Ribeka ada Betuel, nwa nwoke Milka, onye bụ nwunye Nahọ, nwanne Ebraham. Ọ na-apụta bukwasị ite nʼubu ya.
  • Ndị ikom Gidiọn tinyere iheọkụ nʼime ite aja, kụwaa haNkp 7:16, Nkp 7:19–20
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 7:16O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, nyekwa onye ọbụla nʼime ha opi ike, na ite aja nke iheọkụ dị nʼime ya.
    Nkp 7:19–20Nʼabalị ahụ, mgbe etiti abalị ahụ gabigasịrị, Gidiọn na narị ndị agha ya gbeere egbere ruo na mpụta ebe ndị agha Midia mara ụlọ ikwu ha. Nʼoge a, ha ka gbanwere ndị agha na-eche nche. Ụzọ ndị agha Gidiọn atọ ahụ fụrụ opi ike ha, tiwakwaa ite aja ha. Ha ji ọwaọkụ ndị ahụ nʼaka ekpe ha na opi ike ha gaje igbu nʼaka nri ha, ha tiri mkpu sị, “Mma agha Onyenwe anyị, na mma agha Gidiọn!”
  • Samuel wụkwasịrị karama mmanụ nʼisi Sọl1Sa 10:1
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 10:1Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya?
  • Devid weere ube na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl mgbe ọ na-arahụ ụra1Sa 26:12
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 26:12Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ha daba nʼoke ụra.
  • Nwanyị di ya nwụrụ na Zarefat nwere otu njuaka ụtụ ọka nʼite na mmanụ ntakịrị1Ez 17:12
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 17:12Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.”
  • Otu nwanyị di ya nwụrụ wụpụrụ mmanụ ruo mgbe ite ọzọ adịghị2Ez 4:2–6
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 4:2–6Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?” Nwanyị ahụ zara sị, “O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ.” Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole. Mgbe ahụ, baa nʼime ụlọ, gị na ụmụ gị, mechibido onwe unu ụzọ. Malite ịgbanye mmanụ ahụ nʼime ite ahụ niile, mgbe nke ọbụla juru, bupụ ya nʼotu akụkụ.” Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha. Mgbe ọ gbajuru ite ndị ahụ niile, ọ sịrị nwa ya, “Butere m ite ọzọ.” Ma ọ zara, “O nweghị ite ọzọ fọdụrụ.” Mgbe ahụ, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta.
  • Ịlaisha zigara otu onye amụma nta ya na karama mmanụ na Ramọt Gilead2Ez 9:1
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 9:1Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead.
  • Jeremaya zụtara ite aja nke ọkpụ ite, tiwaa ya nʼihu ndị okenyeJer 19:1, Jer 19:10
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 19:1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee, zụta otu ite aja site nʼaka ọkpụ ite. Duru ụfọdụ nʼime ndị okenye na ndị nchụaja,
    Jer 19:10“Kụwaa ite ahụ mgbe ndị gị na ha so nọ na-ele gị anya.
  • Na Kena, ite nkume isii, nke ọbụla galọọnụ iri abụọ ruo iri atọ, e kujuru ruo ọnụJọn 2:6–7
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 2:6–7A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ. Jisọs gwara ha, “Gbajuonụ ite ndị a mmiri.” Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri.
  • Otu nwoke bu ite mmiri ga-edu ndị na-eso ụzọMak 14:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 14:13O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya.
  • Nwanyị Sameria ahụ hapụrụ ite mmiri ya laa nʼobodoJọn 4:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 4:28Mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi nʼime obodo ga gwa ndị mmadụ,
  • Otu nwanyị kụwara karama alabasta mmanụ naad, wụsa ya nʼisi JisọsMak 14:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 14:3Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.