Nyochaa › Isiokwu › Ụlọ mkpọrọ na agbụ
Nkọwa ndị na-eju anya
Ụlọ mkpọrọ na agbụ nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (45), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Nʼime Agba Ochie
- E tinyere Josef nʼụlọ mkpọrọ ebe a na-etinye ndị mkpọrọ ezeJen 39:20
Amaokwu ndị ahụ
Jen 39:20Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt. Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ,
- Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ nyefere ndị mkpọrọ niile nʼaka JosefJen 39:22
Amaokwu ndị ahụ
Jen 39:22Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ mere Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile nọ nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Josef ghọrọ onye a na-ajụ otu ihe si aga nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ.
- Onyeisi ndị na-ebu iko Fero na onyeisi ndị na-esi nri nọ nʼotu ụlọ mkpọrọ ahụJen 40:3
Amaokwu ndị ahụ
Jen 40:3O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef.
- E si nʼụlọ mkpọrọ wepụta Josef; ọ kpụchara afụọnụ, gbanwee uwe yaJen 41:14
Amaokwu ndị ahụ
Jen 41:14Ya mere Fero ziri ozi ka a kpọọ Josef. E mere ngwangwa wepụta ya site nʼụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ọ kpụchara afụọnụ ya, gbanwee uwe ya, ọ bịakwara nʼihu Fero.
- Josef tinyere ụmụnne ya nʼụlọ mkpọrọ ụbọchị atọ, emesịa kee Simiọn agbụJen 42:17, Jen 42:24
- Ehab: tinye Maikaya nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri1Ez 22:27
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 22:27ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ”
- Asa, iwe were ya, tụnyere Hanani onye ọhụ ụzọ nʼụlọ mkpọrọ2Ih 16:7, 2Ih 16:10
Amaokwu ndị ahụ
2Ih 16:7Nʼoge ahụ Hanani, bụ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Asa, bụ eze Juda sị ya, “Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Onyenwe anyị Chineke gị, tụkwasị eze Aram obi, lee na usuu ndị agha Siria esitela nʼaka gị wezuga onwe ha.
2Ih 16:10Iwe were Asa megide onye ọhụ ụzọ a nʼihi nke a; iwe were ya nke ukwuu nke mere na ọ tụnyere Hanani nʼụlọ mkpọrọ. Sitekwa nʼoge ahụ, Asa bidoro imekpa ụfọdụ nʼime ndị ya ahụ.
- Eze Asịrịa tinyere eze Hoshea nʼụlọ mkpọrọ2Ez 17:4
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 17:4Ma eze Asịrịa chọpụtara na Hoshea abụghị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihi na Hoshea eze Izrel zipụrụ ndị ozi ya ka ha jekwuru So, eze Ijipt, maka enyemaka. Ọzọkwa, Hoshea kwụsịrị ịtụ ụtụ nye eze Asịrịa dịka ọ na-eme kwa afọ. Nʼihi ya Shalmanesa nwụchiri ya, tinye ya nʼụlọ mkpọrọ.
- E ji nko na agbụ bronz kpụrụ Manase gaa Babilọn2Ih 33:10–11
Amaokwu ndị ahụ
2Ih 33:10–11Onyenwe anyị gwara Manase na ndị ya okwu, ma ha egeghị ntị. Nʼihi ya, Onyenwe anyị mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn.
- Zedekaya, onye e ghụpụrụ anya, ka e ji agbụ bronz kpụrụ gaa Babilọn2Ez 25:7, Jer 52:11
- E mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta mgbe afọ iri atọ na asaa gasịrị, ọ na-erikọ nri na eze2Ez 25:27–29
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 25:27–29Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a. Ọ gwara ya okwu ọma, nye ya oche ọnọdụ ya dị elu karịa nke ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babilọn. Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
Jeremaya
- E tiri ya ihe, kee ya agbụ nʼỌnụ Ụzọ Ama Dị Elu nke BenjaminJer 20:2
Amaokwu ndị ahụ
Jer 20:2o nyere iwu ka e tie Jeremaya, bụ onye amụma ihe, kee ya agbụ, tinye ya nʼọnụ ụzọ ama Dị Elu nke Benjamin, nke dị ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
- E kpọchiri ya nʼọnụụlọ mkpọrọ nʼụlọ Jonatan ode akwụkwọJer 37:15–16
Amaokwu ndị ahụ
Jer 37:15–16Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a. E tinyere Jeremaya nʼime ụlọ mkpọrọ olulu, ebe ọ nọrọ ogologo oge.
- E debere ya nʼogige ndị nche, a na-enye ya otu ogbe achịcha kwa ụbọchịJer 32:2, Jer 37:21
Amaokwu ndị ahụ
Jer 32:2Nʼoge a, ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. E tinyekwara Jeremaya, bụ onye amụma nʼogige ụlọ ndị nche nke dị nʼụlọeze Juda.
Jer 37:21Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche.
- E ji ụdọ wedata ya nʼolulu mmiri na-enweghị mmiri, naanị apịtịJer 38:6
Amaokwu ndị ahụ
Jer 38:6Ya mere, ha jidere Jeremaya, tinye ya nʼime olulu mmiri Malkija, nwa eze. Olulu mmiri a dị nʼogige ụlọ ndị nche. Ọ bụ ụdọ ka ha ji wetuo Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. Ma mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị. Ya mere, Jeremaya danyere nʼime apịtị ahụ, mibanye nʼime ya.
- Na Rema, a tọpụrụ ya agbụ dị nʼaka yaJer 40:1, Jer 40:4
Amaokwu ndị ahụ
Jer 40:1Mgbe oge nta gasịrị site nʼoge Nebuzaradan ọchịagha ndị nche nọ na Rema mere ka Jeremaya nwere onwe ya, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị. Nebuzaradan hụrụ Jeremaya mgbe e kekọtara ya na ndị e si na Jerusalem na Juda dọta nʼagha agbụ, bụ ndị ahụ a na-ebula Babilọn.
Jer 40:4Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.”
Nʼime Agba Ọhụrụ
- Herọd kere Jọn agbụ, tinye ya nʼụlọ mkpọrọMat 14:3
Amaokwu ndị ahụ
Mat 14:3Nʼihi na, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nʼụlọ mkpọrọ, nʼihi Herodịas nwunye Filip nwanne ya nwoke.
- Site nʼụlọ mkpọrọ, Jọn zigara ndị na-eso ụzọ ya nʼebe Jisọs nọMat 11:2
Amaokwu ndị ahụ
Mat 11:2Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya.
- E bipụrụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọMat 14:10
Amaokwu ndị ahụ
Mat 14:10O ziri ozi ka e bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ.
- Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara na igbu mmadụLuk 23:19
Amaokwu ndị ahụ
Luk 23:19(Onye a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara dapụtara nʼobodo ahụ, nakwa nʼihi igbu mmadụ.)
- Jisọs: “Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m”Mat 25:36
Amaokwu ndị ahụ
Mat 25:36Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’
- E debere Pita na Jọn nʼụlọ mkpọrọ ruo echi nʼihi na ọ bụ uhuruchiỌrụ 4:3
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 4:3Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi.
- Ndị ozi ahụ apụọla nʼụlọ mkpọrọ, ma a ka kpọchiri ya, ndị nche ka na-eche yaỌrụ 5:18–19, Ọrụ 5:23
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 5:18–19Ha jidere ndị ozi a tụba ha nʼụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ. Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị,
Ọrụ 5:23“Anyị hụrụ ka a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ ahụ nke ọma, ndị nche guzokwa nʼọnụ ụzọ ya. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị ahụghị onye ọbụla nʼime ya.”
- Nʼokpuru nche siri ike, Pita rahụrụ ụra nʼetiti ndị agha abụọ, e kee ya agbụỌrụ 12:4, Ọrụ 12:6
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 12:4Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị.
Ọrụ 12:6Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche.
- Agbụ ahụ dapụrụ, ọnụ ụzọ ama igwe meghere nʼonwe yaỌrụ 12:7, Ọrụ 12:10
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 12:7Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya.
Ọrụ 12:10Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya.
- Na Filipai: ime ime ụlọ mkpọrọ, ụkwụ ha nʼosisi mkpọrọỌrụ 16:23–24
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 16:23–24Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma. Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ.
- Nʼetiti abalị, ala ọma jijiji meghere ọnụ ụzọ, agbụ niile tọpụkwaỌrụ 16:25–26
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 16:25–26Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị. Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara.
- Na Jerusalem, e ji ụdọ igwe abụọ kee Pọl agbụỌrụ 21:33
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 21:33Ọchịagha ahụ bịara jide ya, nye iwu ka e were ụdọ igwe abụọ kee ya agbụ, ọ jụkwara onye ọ bụ na ihe o mere.
- Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ afọ abụọỌrụ 24:27
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 24:27Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.
- Na Rom, Pọl biri ya na onye agha na-eche ya nche, e ji agbụ kee yaỌrụ 28:16, Ọrụ 28:20
- O biri afọ abụọ nʼụlọ ọ na-akwụ ụgwọ yaỌrụ 28:30
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 28:30O biri obi nke onwe ya afọ abụọ nʼụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ileta ya,
- Agbụ Pọl emeghị Onisiferọs ihere2Tm 1:16
Amaokwu ndị ahụ
2Tm 1:16Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ.
Agbụ ọlaedo
- Fero nyanyere Josef ihe ịnya nʼolu ọlaedoJen 41:42
Amaokwu ndị ahụ
Jen 41:42Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ.
- Belshaza mere ka e yinye Daniel ihe olu ọlaedoDan 5:29
Amaokwu ndị ahụ
Dan 5:29Mgbe ahụ Belshaza nyere iwu ka e yikwasị Daniel uwe odo odo ndị eze ahụ, ka e yinye ya ihe olu ọlaedo. O nyekwara iwu ka e kwusaa nʼalaeze ya niile, na o meela ya onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze ahụ.
- Gidiọn weere ihe olu dị nʼolu ịnyịnya kamel ndị MidiaNkp 8:26
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 8:26Ịdị arọ nke ọlantị ọlaedo ndị a bụ otu puku na narị shekel asaa, na-agụnyeghị ihe ịchọ mma ndị ọzọ, na ihe olu, na uwe odo odo ndị eze Midia na-eyi, na ihe olu dị nʼolu ịnyịnya kamel ha.
- Solomọn gbatịrị ụdọ ọlaedo nʼihu ime ime ebe nsọ1Ez 6:21
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 6:21Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.