Ndụ kwa ụbọchị
Esemokwu nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (32), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Ihe atụ
- Ndị ọzụzụ anụ ụlọ Ebram na nke Lọt sere okwu, ha abụọ wee kewaaJen 13:7–9
Amaokwu ndị ahụ
Jen 13:7–9Nke a mere esemokwu ji dapụta nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Ebram na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt. Ndị Kenan na ndị Periz bikwa nʼala ahụ nʼoge ahụ. Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne. Lee, ọ bụ na ala a niile adịghị nʼihu gị? Ka anyị kewaa. Ọ bụrụ na ị gaa nʼakụkụ aka ekpe, aga m aga nʼakụkụ aka nri. Ma ọ bụrụ na i gaa nʼakụkụ aka nri gị, aga m aga nʼakụkụ aka ekpe.”
- Ebraham mere mkpesa banyere olulu mmiri ndị ozi Abimelek ji anya ike naraJen 21:25
Amaokwu ndị ahụ
Jen 21:25Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi.
- Mosis hụrụ ndị Hibru abụọ na-alụ ọgụỌpụ 2:13, Ọrụ 7:26
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 2:13Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?”
Ọrụ 7:26Nʼụbọchị ọzọ sonụ, Mosis hụrụ ụmụnna ya ndị Izrel abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nʼetiti ha, sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emejọrịta onwe unu?’
- Mosis enweghị ike naanị ya ibu ise okwu ndị mmadụ niileDit 1:12
Amaokwu ndị ahụ
Dit 1:12Ma olee otu naanị m ga-esi buo ibu unu, doziekwa ise okwu unu na nsogbu unu niile?
- Ifrem yiri Jefta egwu; “Shibolet” nʼebe ngabiga JọdanNkp 12:1–6
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 12:1–6Mgbe ahụ, ndị Ifrem kpọkọtara ndị agha ha na Zafọn zigara Jefta ozi sị ya, “Gịnị mere ị kpọghị anyị ka anyị bịa nyere gị aka ịlụso ndị Amọn agha? Anyị na-abịa iwere ọkụ irechapụ gị na ezinaụlọ gị.” Jefta zaghachiri ha sị, “Akpọrọ m unu mgbe mụ na ndị m na ndị Amọn na-ese okwu dị ukwu ma unu jụrụ ịbịa. Unu azọpụtaghị m site nʼaka ha. Mgbe m hụrụ na unu achọghị inyere anyị aka, e tinyere m ndụ m nʼaka m, gabiga nʼofe nke ọzọ ibuso ndị Amọn agha. Ma Onyenwe anyị nyeere m aka imeri ha. Ugbu a, nʼihi gịnị ka unu ji bịa ịlụso m ọgụ taa?” Jefta kpọkọtara ndị ikom Gilead pụọ buso ndị Ifrem agha. Ndị Gilead tidara ha nʼala nʼihi na ndị Ifrem sịrị, “Ndị gbapụrụ agbapụ site nʼIfrem na Manase ka unu bụ.” Ọ nọchiri akụkụ Jọdan dị ndị agha Ifrem nʼazụ, ebe ndị agha Ifrem nwere ike isi gbapụ. Mgbe ọbụla onye agha Ifrem ọbụla gbapụrụ ọsọ chọọ ịgafe osimiri ahụ, ndị agha Gilead ga-ejide ya jụọ ya sị, “Ị bụ onye Ifrem?” Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ya abụghị onye Ifrem, ha sịrị, “Ọ dị mma, kpọọ, ‘Shibolet.’ ” Ọ bụrụ na onye ahụ akpọ, “Sibolet,” nʼihi na ọ kpọpụtaghị mkpụrụ okwu ahụ nke ọma, ha na-akpụrụ ya gbuo ya na ngabiga mmiri Jọdan. Ọ bụ ọnụọgụgụ iri puku anọ, na puku abụọ ndị Ifrem ka e gburu mgbe ahụ.
- Akụkọ nwanyị Tekoa: ụmụ ndị ikom abụọ lụrụ ọgụ nʼọhịa2Sa 14:6
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 14:6Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya.
- Ndị na-eso ụzọ rụrịtara ụka banyere onye kachasị ukwuu nʼetiti haMak 9:33–34, Luk 22:24
Amaokwu ndị ahụ
Mak 9:33–34Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?” Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya.
Luk 22:24Ịrụ ụka malitere nʼetiti ha banyere onye nʼime ha ka a na-agụ na ọ dị ukwuu karịa ibe ya.
- Oke esemokwu na Antiọk banyere ibi ugwuỌrụ 15:1–2
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 15:1–2Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.” Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ soro gaa Jerusalem hụ ndị ozi na ndị okenye nke nzukọ maka okwu a.
- Pọl na Banabas kewara nʼihi MakỌrụ 15:37–39
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 15:37–39Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa. Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha. Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs.
- Ndị Farisii na ndị Sadusii sere okwu banyere mbilite nʼọnwụỌrụ 23:7–10
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 23:7–10Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara. Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile. Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?” Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.
- Pọl guzogidere Sefas nʼihu ya na AntiọkGal 2:11
Amaokwu ndị ahụ
Gal 2:11Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe.
- Ndị Kọrint: “Abụ m onye na-eso Pọl” … “Abụ m onye na-eso Apọlọs”1Kọ 1:11–12
Amaokwu ndị ahụ
1Kọ 1:11–12Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu. Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.”
- Ndị kwere ekwe na-akpọrịta ibe ha ụlọ ikpe1Kọ 6:6–7
Amaokwu ndị ahụ
1Kọ 6:6–7Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe! Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu?
- Pọl rịọrọ Yodia na Sintiki ka ha nwee otu ucheFil 4:2
Amaokwu ndị ahụ
Fil 4:2Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị.
Nʼime Iwu
- A na-akwụ onye e merụrụ ahụ nʼọgụ ụgwọ maka ọrụ ọ tụfuru na ọgwụgwọ yaỌpụ 21:18–19
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 21:18–19“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ alụọ ọgụ ma otu nʼime ha ewere nkume maọbụ osisi tie onye nke ọzọ. Ọ bụrụ na ọ nwụghị, kama na o merụrụ ahụ, dinaakwa nʼihe ndina ya, ọ bụrụ na onye ahụ ebilie were mkpara ya na-ejegharị, ikpe agaghị ama onye ahụ tiri ya ihe, kama ọ ga-akwụ ụgwọ ihe onye ahụ ji gwọọ onwe ya, na oge onye ahụ o tiri ihe ji nọọ nʼihe ndina, ruo mgbe ahụ ya ga-adị mma.
- A na-ebuga esemokwu dị nʼetiti mmadụ nʼụlọ ikpe ka e kpee yaDit 25:1
Amaokwu ndị ahụ
Dit 25:1Mgbe esemokwu dị nʼetiti ndị mmadụ, ha ga-ebuga ikpe ha nʼụlọikpe ebe ndị ikpe ga-elenye anya nʼikpe ahụ, maa onye ajọ omume ikpe, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya.
Okwu nʼIlu
- Ịkpọ asị na-akpali esemokwu; ịhụnanya na-ekpuchi njehieIlu 10:12
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 10:12Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
- Onye iwe ọkụ na-akpali ọgụIlu 15:18, Ilu 29:22
- Iberibe achịcha kpọrọ nkụ nʼudo ka oriri nwere ọgụ mmaIlu 17:1
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 17:1Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya, karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.
- Ịmalite esemokwu dị ka ịhapụ iju mmiriIlu 17:14
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 17:14Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite.
- Ọ bụ ihe nsọpụrụ izere ise okwu; onye nzuzu ọbụla na-ese okwuIlu 20:3
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 20:3Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka, ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.
- Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsịIlu 22:10
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 22:10Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị, e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.
- Itinye onwe nʼesemokwu onye ọzọ dị ka ijide nkịta na ntịIlu 26:17
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 26:17Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.
- Nwanyị na-ese okwu dị ka mmiri na-ata mgbe niile nʼụbọchị mmiri ozuzoIlu 27:15, Ilu 25:24
Ebe ndị ọzọ
- Gị na onye iro gị kpezie ngwa ngwa nʼụzọ ụlọ ikpeMat 5:25
Amaokwu ndị ahụ
Mat 5:25“Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.
- Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, gị na onye ọbụla biri nʼudoRom 12:18
Amaokwu ndị ahụ
Rom 12:18Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo.
- Ịrụ ụka nzuzu na-eweta ise okwu2Tm 2:23–24
Amaokwu ndị ahụ
2Tm 2:23–24Wezuga onwe gị nʼịrụ ụka nzuzu na nke amaghị ihe niile, nʼihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu. O kwesikwaghị ka ohu Onyenwe anyị bụrụ onye na-ese okwu, kama, ọ ga-abụ onye obiọma nye mmadụ niile, na onye ma otu e si ezi ihe, onye dị njikere ịnagide ihe ọjọọ e mere ya.
- “Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu”Jem 4:1
Amaokwu ndị ahụ
Jem 4:1Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu. Ebee ka ha siri bịa? Ọ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nʼime onwe unu?
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.