Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ọrịa na ndị dibịa

Ndụ kwa ụbọchị

Ọrịa na ndị dibịa nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (41), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Ndị dibịa

  • Ndị dibịa Josef gbasịrị ozu JekọbJen 50:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 50:2Josef nyere iwu, ka ndị dibịa na-ejere ya ozi gbasie ozu nna ya. Ya mere, ndị dibịa ahụ gbasikwara Izrel.
  • Asa, onye ọrịa metụtara ụkwụ ya, chọrọ enyemaka nʼaka ndị dibịa2Ih 16:12, 1Ez 15:23
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ih 16:12Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka Onyenwe anyị kama ọ bụ naanị ndị dibịa ka o jekwuru.
    1Ez 15:23Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi.
  • Nwanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ mefuru ihe niile o nwere nʼaka ndị dibịaMak 5:25–26, Luk 8:43
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 5:25–26Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ.
    Luk 8:43Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya.
  • “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike”Mat 9:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 9:12Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa.
  • Ilu: “Dibịa, gwọọ onwe gị!”Luk 4:23
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 4:23Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ”
  • Luk, “Ezi enyi anyị Luk, onye dibịa ukwu anyị”Kọl 4:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Kọl 4:14Ezi enyi anyị Luk, onye dibịa ukwu anyị na Dimas na-ekele unu.
  • “Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead? Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ?”Jer 8:22
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 8:22Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead? Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ? Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị m nʼihi mmerụ ahụ ha niile?

Ọgwụgwọ

  • Mmanụ fiig a tụkwasịrị nʼelu etuto Hezekaya2Ez 20:7, Aịz 38:21
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 20:7Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma.
    Aịz 38:21Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”
  • Onye Sameria kechiri ọnya, wụsa mmanụ na mmanyaLuk 10:34
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 10:34Ọ gara nso nʼebe ọ nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. Ọ tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma.
  • Ntakịrị mmanya maka afọ na nrịa nrịa ọtụtụ mgbe1Tm 5:23
    Amaokwu ndị ahụ
    1Tm 5:23Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, na-aṅụ ntakịrị mmanya maka afọ gị na nrịa nrịa nke na-arịa gị ọtụtụ mgbe.
  • A na-ete ndị ọrịa mmanụMak 6:13, Jem 5:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 6:13Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, teekwa ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike mmanụ, gwọọ ha.
    Jem 5:14Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
  • Obi na-aṅụrị ọṅụ bụ ezi ọgwụIlu 17:22
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 17:22Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.

Ihe atụ

  • Jekọb rịara ọrịa; Josef kpọtara ụmụ ya ndị ikom abụọJen 48:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 48:1Mgbe ihe ndị a gasịrị, a gwara Josef sị, “Lee nna gị na-arịa ọrịa.” Josef biliri duru ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Manase na Ifrem gawa ileta ya.
  • Onyenwe ohu onye Ijipt hapụrụ ya mgbe ọ rịara ọrịa1Sa 30:13
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 30:13Mgbe ahụ, Devid jụrụ ya sị, “Ị bụ onye? Ebeekwa ka i si bịa?” Ọ zara Devid sị, “Abụ m onye Ijipt, bụrụkwa ohu onye Amalek. Onyenwe m hapụrụ m nʼebe a abalị atọ gara aga nʼihi na ahụ adịghị m ike.
  • Nwa Jeroboam rịara ọrịa; nne ya gbanwere onwe ya gaa nʼebe onye amụma nọ1Ez 14:1–3
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 14:1–3Nʼoge a, Abija nwa Jeroboam nọ nʼọrịa nke dị ukwuu. Nʼihi ya, Jeroboam sịrị nwunye ya, “Gaa, jikwaa onwe gị nʼụzọ mmadụ na-enweghị ike ịmata na ị bụ nwunye Jeroboam. Ị ga-ejekwa Shaịlo, Ahija onye amụma nọ nʼebe ahụ, bụ nwoke ahụ gwara m okwu na m ga-abụ eze ndị nke a. Chịrịkwa ogbe achịcha iri, na achịcha nta ole na ole, na otu karama mmanụ aṅụ, jekwuru ya. Ọ ga-agwa gị ihe ga-eme banyere nwantakịrị a.”
  • Nwa nwoke nwanyị di ya nwụrụ na Zarefat rịara ọrịa1Ez 17:17
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 17:17Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya.
  • Nwa nwoke nwanyị Shunem nʼubi: “Isi m o, isi m o!”2Ez 4:18–20
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 4:18–20Nwata ahụ toputara, otu ụbọchị ọ pụrụ jekwuru nna ya nʼubi, ebe ha nọ na-aghọ ọka. O tikuru nna ya sị ya, “Isi m o, isi m o!” Nna ya sịrị otu nʼime ndị ohu ya, “Kuru ya kulaara nne ya.” O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe ọ nwụrụ.
  • Ahazaya si na mgbe ụlọ elu daa, merụọ ahụ2Ez 1:2
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 1:2Nʼoge a, Ahazaya sitere na mgbe ụlọ elu ya dị na Sameria daa, merụọ ahụ nke ukwuu. Nʼihi ọrịa a, o zigara ndị ozi, sị ha, “Gaa jụta ase nʼaka Baal-Zebub, bụ chi Ekrọn, ma m ga-adịrị site nʼihe mmerụ ahụ a.”
  • Ben-Hadad nke Aram jụrụ Ịlaisha ma ọ ga-agbake2Ez 8:7–8
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 8:7–8Mgbe ihe ndị a gasịrị Ịlaisha gara Damaskọs, isi obodo ndị Siria. Nʼoge a, Ben-Hadad eze Aram, na-arịa ọrịa. “A gara gwa eze na onye nke Chineke abịala nʼebe ahụ.” Mgbe eze nụrụ ya, ọ kpọrọ Hazael sị ya, “Were onyinye ịnata ihuọma nʼaka gị wegara onye nke Chineke, site nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase. Jụọ ya, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ”
  • Ịlaisha rịara ọrịa ahụ o si na ya nwụọ2Ez 13:14
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 13:14Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!”
  • Hezekaya rịara ọrịa ruo nʼọnụ ọnwụ, emesịa ọ gbakeeAịz 38:1, 2Ez 20:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 38:1Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
    2Ez 20:7Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma.
  • Job, ọnya jupụtara ya ahụ, ji ibe ite kụwara akụwa na-akọ onwe yaJob 2:7–8
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 2:7–8Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya. Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ.
  • Daniel dinara nʼọrịa ọtụtụ ụbọchị mgbe ọ hụsịrị ọhụDan 8:27
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 8:27Mụ bụ Daniel, nọrọ nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ na ahụ esighị ike. Mgbe ụbọchị ole na ole gafekwara, ebiliri m bidokwa na-agagharị, na-arụkwa ọrụ eze, ma obi jọrọ m njọ nke ukwuu nʼihi nrọ ahụ, nʼihi na ọ karịrị m nghọta.
  • Nne nwunye Pita dina nʼihe ndina, ahụ ọkụ siri ikeMat 8:14, Luk 4:38
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 8:14Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ.
    Luk 4:38Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka.
  • Nwa nwoke otu onye ọrụ ụlọeze na-arịa ọrịa na KapanọmJọn 4:46–47
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 4:46–47Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm. Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ.
  • Nwata nwoke akwụkwụ na-adọ na-adaba nʼọkụ maọbụ nʼime mmiri ọtụtụ mgbeMat 17:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 17:15rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri.
  • Ọtụtụ ndị ọrịa dina nʼọdọ mmiri Betsaida; otu nwoke afọ iri atọ na asatọJọn 5:2–3, Jọn 5:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 5:2–3Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise. Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị.
    Jọn 5:5Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ.
  • A na-ebu otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya kwa ụbọchị gaa nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọỌrụ 3:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 3:2Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.
  • Lazarọs onye Betani na-arịa ọrịa; ụmụnne ya ndị inyom ziri Jisọs oziJọn 11:1–3
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 11:1–3Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị. Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa. Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, “Onyenwe anyị, onye ahụ nke ị hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa.”
  • Dọkas rịara ọrịa, nwụọỌrụ 9:37
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 9:37Nʼoge a, ọ rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nibere ya nʼotu ime ụlọ dị nʼụlọ elu.
  • Nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsaỌrụ 28:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 28:8Nʼoge ahụ, nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsa, Pọl banyere nʼime obodo gaa leta ya, kpeere ya ekpere, bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịkwara ya mma.
  • Epafroditọs rịara ọrịa, fọdụ obere ka ọ nwụọFil 2:25–27
    Amaokwu ndị ahụ
    Fil 2:25–27Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs, nwanna m na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, onye mụ na ya na-ebukọ agha, onyeozi nke unu zitere ka ọ bịa nyere m aka nʼọnọdụ mkpa m. Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nʼihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nʼoge gara aga. Nʼezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nʼọrịa ahụ daa nʼụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara m ebere, nʼihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m ihe mwute nʼelu ihe mwute.
  • Pọl buru ụzọ kwusa ozi na Galeshịa nʼihi ọrịaGal 4:13–14
    Amaokwu ndị ahụ
    Gal 4:13–14Unu maara na ọ bụ nʼime adịghị ike nke anụ ahụ ka m ji kwusaara unu oziọma a. Ọ bụ ezie, ọnọdụ m nʼoge ahụ bụ ọnwụnwa nʼebe unu nọ, unu eledaghị m anya, maọbụ jụ ige m ntị. Kama unu nabatara m, dị ka mmụọ ozi Chineke, maọbụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya.
  • Pọl hapụrụ Trofimọs na Melitọs nʼọrịa2Tm 4:20
    Amaokwu ndị ahụ
    2Tm 4:20Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Melitọs nʼọnọdụ ahụ esighị ike.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.