Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ọbụbụenyi

Ndụ kwa ụbọchị

Ọbụbụenyi nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (45), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Enyi na-ahụ nʼanya oge niile; a mụrụ nwanne maka oge nsogbuIlu 17:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 17:17Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
  • O nwere enyi na-arapara nso karịa nwanneIlu 18:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 18:24Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.
  • Mmerụ ahụ sitere nʼaka enyi kwesiri ntụkwasị obiIlu 27:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 27:6Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
  • Onye agbataobi nọ nso ka mma karịa nwanne nọ ebe dị anyaIlu 27:10
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 27:10Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị. Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka. Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.
  • Dịka igwe si amụ igwe, otu a ka mmadụ si amụ ibe yaIlu 27:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 27:17Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
  • Ejela nʼụlọ onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ike gị ghara ịgwụ yaIlu 25:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 25:17Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.
  • Ngọzi e ji oke olu kwuo nʼisi ụtụtụ ka a na-agụ dịka ọnụIlu 27:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 27:14Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.
  • Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyiIlu 22:24–25
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 22:24–25Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe, ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.
  • Akụ na-adọta ọtụtụ ndị enyi; a na-ahapụ onye ogbenyeIlu 19:4, Ilu 19:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 19:4Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
    Ilu 19:6Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ, otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.
  • Ikwughachi njehie na-ekewa ndị enyiIlu 17:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 17:9Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.
  • Mmadụ abụọ ka mma karịa otu; eriri atọ a kpara akpa adịghị agbaji ngwa ngwaEkl 4:9–12
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 4:9–12Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe: Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu. Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ? Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.
  • Enyi nso, onye ya na ya riri nri, biliri imegide onye ọbụ abụAbụ 41:9, Abụ 55:12–14
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 41:9Ọ bụladị ezigbo enyi m, onye m tụkwasịrị obi, onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, ebiliela imegide m.
    Abụ 55:12–14A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ. Maọbụ gị, nwoke dịka m, onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma, onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.
  • Job na-eme mkpesa na ndị enyi ya agbakụtala ya azụJob 6:14–15, Job 16:20, Job 19:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 6:14–15“Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ. Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha, dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,
    Job 16:20Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m, dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.
    Job 19:19Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ; ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m
  • Mgbe Pọl buru ụzọ kpee ọnụ ya, mmadụ niile gbahapụrụ ya2Tm 4:16
    Amaokwu ndị ahụ
    2Tm 4:16Na mbụ, mgbe m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m. Ha niile gbahapụrụ m. Ka a hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie.
  • Jisọs: ọ dịghị ịhụnanya karịrị ịtọgbọ ndụ mmadụ nʼihi ndị enyi yaJọn 15:13–15
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 15:13–15Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu. Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m.

Ihe atụ

  • Ebram ji ndị ikom 318 a zụrụ azụ napụta Lọt onye ikwu yaJen 14:14–16
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 14:14–16Mgbe Ebram nụrụ na adọrọla Lọt nwa nwanne ya nʼagha, ọ kpọkọtara ndị ikom a zụrụ azụ na-ejere ya ozi, ndị a mụrụ nʼụlọ ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom atọ na iri na asatọ, ha chụrụ ndị agha ahụ ọsọ tutu ha erute Dan. Nʼabalị, Ebram kere ndị agha ya ibuso ndị ahụ agha. O meriri ha, chụọ ha ọsọ, chụruo ha Hoba, nke dị nʼakụkụ ugwu Damaskọs. Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha.
  • Rut agaghị ahapụ Naomi: “Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga”Rut 1:16–17
    Amaokwu ndị ahụ
    Rut 1:16–17Ma Rut zara, “Akwagidela m ka m hapụ gị, maọbụ ime ka m site nʼiso gị chigharịa. Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga. Aga m esokwa gị biri nʼebe ọbụla ị ga-ebi; ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m, ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụ kwa ka a ga-eli m. Ka Onyenwe anyị mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ekwere ka ihe ọzọ, ma ọ bụghị ọnwụ, kewaa mụ na gị.”
  • Samuel ruru ụjụ nʼihi Sọl1Sa 15:35, 1Sa 16:1
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 15:35Site nʼoge ahụ ruo mgbe Samuel nwụrụ, ọ hụkwaghị Sọl anya ọzọ. Ma o rugidere ụjụ nʼihi Sọl oge ndị a niile. O wutekwara Onyenwe anyị na o mere Sọl eze ndị Izrel.
    1Sa 16:1Emesịa Onyenwe anyị sịrị Samuel, “Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-eru ụjụ nʼihi Sọl, ebe ọ bụ na m ajụla ya dịka eze ndị Izrel? Ugbu a, gbajuo mmanụ na mpi gị, bilie ije. Ana m eziga gị ka ijekwuru Jesi onye Betlehem, ahọrọla m otu onye ga-abụ eze site nʼetiti ụmụ ya ndị ikom.”
  • Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka onwe ya, nye ya uwe mwụda ya1Sa 18:1–4
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 18:1–4Mgbe Devid gwasịrị Sọl okwu, ịhụnanya dị ukwuu malitere nʼetiti Jonatan na Devid. Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya. Sọl mere ka Devid nọgide nʼụlọeze. O kwekwaghị ka ọ laghachi nʼụlọ nna ya. Jonatan na Devid gbara ndụ nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya. Jonatan yipụtara uwe o yi nʼahụ nye ya Devid, nyekwa ya uwe ime ahụ ya, na ọ bụladị mma agha ya, ma ụta ya na eriri ukwu ya.
  • Devid na Jonatan sutara onwe ha ọnụ, kwaa ákwá, were iyi kewaa1Sa 20:41–42, 1Sa 23:16–18
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 20:41–42Mgbe nwokorobịa ahụ lara, Devid biliri site nʼakụkụ ndịda nkume ahụ ebe o zoro onwe kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala ugboro atọ, nʼihu Jonatan. Ha suritere onwe ha ọnụ, bekọkwaa akwa. Ma Devid kwara akwa karịa. Nʼikpeazụ, Jonatan gwara Devid okwu sị, “Gaa nʼudo, nʼihi na anyị ejirila aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi ịbụ enyi nʼetiti onwe anyị, na-asị, ‘ Onyenwe anyị bụ onye akaebe nʼebe mụ na gị, na nʼebe ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ gị nọ ruo mgbe ebighị ebi.’ ” Ha kewara. Devid malitere ịpụ, ma Jonatan tụgharịrị baa nʼobodo.
    1Sa 23:16–18Jonatan, nwa Sọl pụrụ ịchọ Devid. Mgbe ọ hụrụ ya na Horesh, ọ gbara ya ume, nyere ya aka iguzosi ike nʼime Chineke. Jonatan sịrị ya, “Atụla egwu, nna m Sọl apụghị ịchọta gị. Ị ga-abụ eze Izrel. Aga m abụkwa onye na-eso gị dịka Sọl nna m maara nke ọma.” Ha abụọ gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Devid nọgidere na Horesh, ma Jonatan laghachiri nʼụlọ ya.
  • Abụ akwa Devid: “Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi”2Sa 1:26
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 1:26ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi karịa ịhụnanya ndị nwanyị.
  • Nʼihi Jonatan, Mefiboshet na-eri nri na tebụl Devid mgbe niile2Sa 9:1, 2Sa 9:7
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 9:1Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.”
    2Sa 9:7Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.”
  • Devid gwara onye nchụaja Abịata: “Soro m nọdụ nʼebe a, atụla ụjọ”1Sa 22:23
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 22:23Soro m nọdụ nʼebe a, atụla ụjọ, nʼihi na onye na-achọ ndụ gị na-achọkwa ndụ nke m. Mmekpa ahụ ọbụla agaghị adakwasị gị ma mụ na gị nọdụ.”
  • Hiram eze Taịa na Devid bụ enyi oge niile1Ez 5:1
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 5:1Mgbe Hiram eze Taịa nụrụ na eteela Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ nna ya Devid, o zipụrụ ndị ozi ya ijekwuru Solomọn, nʼihi na ya na Devid bụ enyi, dịrịkwa na mma.
  • Hushaị enyi Devid nọgidere kwesi ntụkwasị obi mgbe Absalọm nupụrụ isi2Sa 15:32–37, 2Sa 16:16–17
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 15:32–37Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi. Ma Devid sịrị ya, “Ọ bụrụ na i soro m, ị ga-abụ ibu arọ nye m. Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel. Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze. Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.” Ya mere Hushaị, enyi Devid, bịarutere Jerusalem mgbe Absalọm na-abata obodo ahụ.
    2Sa 16:16–17Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.” Absalọm sịrị Hushaị, “Ọ bụ otu a ka i si egosi ịhụnanya i nwere na-ebe enyi gị nọ? Gịnị mere i soghị ya?”
  • Itai onye Git ajụ ịhapụ Devid mgbe ọ na-agba ọsọ2Sa 15:19–21
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 15:19–21Mgbe ahụ, Devid tụgharịrị kpọọ Itai, onye Git, ọchịagha narị ndị agha isii ahụ sị ya, “Gịnị mere i ji eso m? Laghachi azụ soro eze Absalọm, nʼihi na ị bụ ọbịa nʼIzrel, onye gbatara ọsọ ndụ. Ọ dịbeghị anya kemgbe ị bịara. M ga-esi aṅaa kwere ka i soro m na-awagharị, ebe ọ bụ na m amaghị ebe m na-aga. Chịrị ndị agha gị laghachi. Ka obiọma na ikwesi ntụkwasị obi dịnyere unu.” Ma Itai zara eze sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.”
  • Eze Ahazaya letara eze Joram, onye e merụrụ ahụ2Ez 8:28–29
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 8:28–29Ahazaya sooro Joram nwa Ehab, gaa ibuso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ. Ya mere, eze Joram lọghachitere na Jezril, ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ndị Aram merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram eze Juda, gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.
  • Ndị enyi Job atọ nọnyeere ya ụbọchị asaa na-ekwughị okwuJob 2:11–13
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 2:11–13Mgbe ndị enyi Job atọ, Elifaz onye Teman, Bildad onye Shua na Zofa onye Neama, nụrụ banyere nsogbu niile dakwasịrị ya, ha biliri ije site nʼụlọ ha, ha zukọtara site na nkwekọrịta ịga nọnyere ya na ịkasị ya obi. Mgbe ha hụrụ ya site nʼebe dị anya, ha amataghị ya, ha weliri olu bido iti mkpu akwa, dọkaa uwe ha yi nʼahụ ha, kporo aja kpokwasị onwe ha nʼisi. Ha sooro Job nọdụ nʼala ụbọchị asaa, ehihie na abalị. Ọ dịghị onye gwara ya okwu nʼihi na ha hụrụ otu ihe mgbu ya si dị ukwuu.
  • Daniel rịọrọ eze ka o bulie ndị enyi ya atọ eluDan 2:17–18, Dan 2:49
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 2:17–18Emesịa, Daniel lara nʼụlọ nke ya gaa kọọrọ Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ndị enyi ya ihe merenụ. Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn.
    Dan 2:49Ma dịka Daniel siri rịọ eze, o mekwara ka Shedrak, Mishak na Abednego bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn, Daniel nʼonwe ya nọdụrụ nʼogige eze.
  • Jisọs hụrụ Mata, nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanyaLuk 10:38–39, Jọn 11:5, Jọn 11:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 10:38–39Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu.
    Jọn 11:5Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya.
    Jọn 11:11Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra.”
  • Nwa nwanne nwanyị Pọl gwara ya banyere izuzu ọjọọỌrụ 23:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 23:16Ma nwa nwanne nwanyị Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ banyere nʼogige ndị agha kọọrọ Pọl.
  • Prisila na Akwila tinyere ndụ ha nʼihe ize ndụ nʼihi PọlRom 16:3–4
    Amaokwu ndị ahụ
    Rom 16:3–4Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs. Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha.
  • Pọl banyere Timoti: “Enweghị m onye ọzọ dị ka ya”Fil 2:19–22
    Amaokwu ndị ahụ
    Fil 2:19–22Enwere m olileanya nʼime Onyenwe anyị Jisọs na m ga-ezitere unu Timoti nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, ka m site nʼozi ọ ga-anata banyere unu nwee obi ụtọ. Enweghị m onye ọzọ dị ka ya, onye ga-eche ezi echiche maka ọdịmma unu. Nʼihi na ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ọdịmma nke ha, ma ọ bụghị maka ọdịmma Jisọs Kraịst. Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma.
  • Epafroditọs, nwanne Pọl, onye ya na ya na-arụkọ ọrụ na onye ya na ya na-ebukọ aghaFil 2:25
    Amaokwu ndị ahụ
    Fil 2:25Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs, nwanna m na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, onye mụ na ya na-ebukọ agha, onyeozi nke unu zitere ka ọ bịa nyere m aka nʼọnọdụ mkpa m.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.