Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ịṅụbiga mmanya oke

Ndụ kwa ụbọchị

Ịṅụbiga mmanya oke nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (30), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Okwu

  • Mmanya bụ onye na-akwa emo, ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ onye mkpọtụIlu 20:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 20:1Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.
  • Onye anya ya na-acha ọbara ọbara? Ndị na-anọgide nʼịṅụ mmanyaIlu 23:29–35
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 23:29–35Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara? Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa. Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko. Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala. Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya. Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ. Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”
  • Onye na-aṅụbiga mmanya oke na onye oke oriri ga-adaba nʼọnọdụ ogbenyeIlu 23:20–21
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 23:20–21Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ, nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.
  • Ọ bụghị ihe kwesiri ndị eze ịṅụ mmanyaIlu 31:4–7
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 31:4–7Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze. Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta. Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi. Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.
  • Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanyaAịz 5:11–12
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 5:11–12Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke. Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
  • “ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya”Aịz 5:22
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 5:22Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,
  • Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị nʼihi ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanyaAịz 28:7–8
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 28:7–8Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya. Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya, mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme; ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche, ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe. Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi. O nwekwaghị ebe dị ọcha.
  • “Echi ga-adịkwa ka taa, ma ọ bụkwanụ dị mma karịa”Aịz 56:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 56:12Onye ọbụla na-asị, “Bịa ka m weta mmanya, ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị. Echi ga-adịkwa ka taa, ma ọ bụkwanụ dị mma karịa.”
  • Mmanya na-ewepụ nghọtaHos 4:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Hos 4:11nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta.
  • Ịṅụ mmanya site nʼọbaEms 6:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Ems 6:6Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba; na-ete mmanụ makarịsịrị mma, ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha.
  • Ahụhụ dịrị onye na-enye ndị agbataobi ya mmanya ka ha ṅụbiga okeHab 2:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Hab 2:15“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, ka o si otu a hụ ọtọ ya anya.
  • Ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-aṅụ ya nʼabalị1Te 5:7
    Amaokwu ndị ahụ
    1Te 5:7Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. Ọ bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke.
  • Aṅụbigala mmanya okeEfe 5:18, Rom 13:13, Luk 21:34
    Amaokwu ndị ahụ
    Efe 5:18Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ,
    Rom 13:13Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo.
    Luk 21:34“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya.

Nʼime Iwu

  • Nne na nna nwere ike ibo nwa ha nwoke ebubo nʼihu ndị okenye: “onye mmefu na onye na-aṅụbiga mmanya oke”Dit 21:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 21:20Ha ga-agwa ndị okenye obodo ahụ, “Nwa anyị nwoke a na-eme isiike, na-enupu isi, ọ dịghị ege ntị nʼolu anyị. Ọ bụ onye mmefu na onye na-aṅụbiga mmanya oke.”
  • Ndị nchụaja anaghị aṅụ mmanya mgbe ha na-aba nʼụlọ nzuteLev 10:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 10:9“Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.
  • Onye Nazirait na-ezere mmanya na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanyaỌnụ 6:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọnụ 6:3ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ.

Ihe atụ

  • Noa kụrụ ubi vaịnị, ṅụbiga mmanya okeJen 9:20–21
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 9:20–21Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige. Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya.
  • Ụmụ ndị inyom Lọt mere ka nna ha ṅụbiga mmanya okeJen 19:32–33
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 19:32–33Ka anyị mee ka nna anyị ṅụọ mmanya, ka anyị na ya dinakọọ, ka anyị chebe agbụrụ anyị site na nna anyị.” Nʼabalị ahụ, ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya, nke ada banyere soro nna ya dina. Ha abụọ nwere mmekọ. Ma ọ amaghị mgbe ada ya dinara maọbụ mgbe o bilikwara.
  • Nebal ṅụbigara mmanya oke nʼoriri ya, ọ nụghị ihe ọbụla tutu ruo ụtụtụ1Sa 25:36–37
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 25:36–37Mgbe Abigel batara nʼụlọ, o jekwuru Nebal ebe ọ nọ nʼoriri ọ kpọrọ, oriri dịka oriri a na-enwe nʼụlọeze. Ọ ṅụọkwala mmanya ṅụbigakwa ya oke; nʼihi ya ọ gwaghị ya ihe ọbụla tutu ruo nʼụtụtụ. Nʼụtụtụ, mgbe mmanya pụrụ Nebal nʼanya, nwunye ya gwara ya ihe ndị a niile. Nke a mere ka obi ya nwụọ, ka ọ tọgbọrọ dịka nkume.
  • Devid mere ka Ụraya ṅụbiga mmanya oke, ma Ụraya alaghị nʼụlọ ya2Sa 11:13
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 11:13Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi.
  • Absalọm chere ruo mgbe mmanya bidoro igbu Amnọn2Sa 13:28
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 13:28Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.”
  • Zimri gburu eze Ela mgbe ọ na-aṅụbiga mmanya oke1Ez 16:9–10
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 16:9–10Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke. Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya.
  • Ben-Hadad na ndị eze 32 na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha nʼetiti ehihie1Ez 20:16
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 20:16Nʼetiti ehihie, mgbe Ben-Hadad na iri ndị eze atọ na abụọ ahụ, bụ ndị ahụ bịara inyere ya aka nọ na-aṅụ mmanya, na-aṅụbiga ya oke,
  • Sekses, obi dị ya mma nʼihi mmanya, kpọrọ eze nwanyị VashtiEst 1:10–11
    Amaokwu ndị ahụ
    Est 1:10–11Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze Sekses mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma.
  • Belshaza ṅụrụ mmanya site nʼarịa ụlọnsọ JerusalemDan 5:1–4
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 5:1–4Eze Belshaza, kpọrọ puku ndịisi nọ nʼalaeze ya oriri, ebe ha nọ ṅụọ nnọọ mmanya dị ukwuu. Mgbe Belshaza na-aṅụ mmanya ya, ọ nyere iwu ka a chịtara ya iko ọlaedo na ọlaọcha nke nna ya bụ Nebukadneza si nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem chịkọta, ka eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya, na ndị nwunye ya, na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya. Ya mere, a chịtara iko ọlaedo ndị e si nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem chịkọta. Eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya. Ha ṅụrụ mmanya tookwa chi nke ọlaedo na ọlaọcha na bronz, na igwe na osisi na nkume.

E chere na ha ṅụbigara mmanya oke

  • Elayị chere na Hana, onye na-ekpe ekpere nʼobi ya, ṅụbigara mmanya oke1Sa 1:13–15
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 1:13–15Ka Hana nọ na-ekpe ekpere nʼobi ya, naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ma enweghị onye na-anụ olu ya. Mgbe ahụ, Elayị chere nʼobi ya na ọ bụ nwanyị mmanya na-egbu. Elayị sịrị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-akwụsị ịṅụbiga mmanya oke? Si nʼebe mmanya dị wezuga onwe gị!” Ma Hana zara sị ya, “Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi.
  • A kpọrọ Jisọs “onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ”Mat 11:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 11:19Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.”
  • Nʼụbọchị Pentikọọsụ: “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu”Ọrụ 2:13–15
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 2:13–15Ma ụfọdụ ndị ọzọ na-akwa ha emo na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.” Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu. Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.