Ndụ kwa ụbọchị
Ngarị nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (27), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- Erila ngarị, nʼihi na ngarị na-eme ka anya kpuo ìsìỌpụ 23:8, Dit 16:19
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 23:8“Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
Dit 16:19Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
- Onye a bụrụ ọnụ ka onye na-anara ngarị maka igbu onye aka ya dị ọchaDit 27:25
Amaokwu ndị ahụ
Dit 27:25“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
- Samuel: “Ọ dị onye m si nʼaka ya nara ego aka azụ”1Sa 12:3
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 12:3Lee m ka m guzo nʼihu unu. Gbaanụ ama megide m nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu onye ya o tere mmanụ. Onye ka m zuuru ehi ya? Onye ka m zuuru ịnyịnya ibu ya? Ọ dị onye m ghọgburu? Ọ dị onye m megburu? Ọ dị onye m si nʼaka ya nara ego aka azụ ime ka m ghara ikpe ikpe ziri ezi? Gwanụ m ma ọ bụrụ na m mere ihe ndị a, aga m emezi ya.”
- Eze Jehoshafat gwara ndị ọkaikpe ya: ọ dịghị ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị2Ih 19:7
Amaokwu ndị ahụ
2Ih 19:7Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.”
- Onye ga-ebinyere Chineke? Onye na-ajụ ngarịAbụ 15:5, Aịz 33:15
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 15:5onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha. Onye na-eme ihe ndị a agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.
Aịz 33:15Ndị na-ejegharị nʼezi omume na-ekwu ihe ziri ezi, ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi, ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche, ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara, na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ.
- Okwu nʼIlu: onyinye na-emeghe ụzọ; onyinye nzuzo na-eme ka iwe dajụọIlu 17:8, Ilu 18:16, Ilu 21:14
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 17:8Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.
Ilu 18:16Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.
Ilu 21:14Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ, otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ.
- Onye kpọrọ ngarị asị ga-adị ndụIlu 15:27
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 15:27Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu. Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ.
- Ngarị na-emerụ obiEkl 7:7
Amaokwu ndị ahụ
Ekl 7:7Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu, iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.
- Ndị amụma boro ndị ọchịchị na ndị ọkaikpe hụrụ ngarị nʼanya ebuboAịz 1:23, Aịz 5:23, Mai 3:11, Mai 7:3, Ems 5:12
Amaokwu ndị ahụ
Aịz 1:23Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi, ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi, onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya, na-agbasokwa onyinye. Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha.
Aịz 5:23ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị, ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.
Mai 3:11Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị, ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ, ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego. Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị, “ Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị? O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”
Mai 7:3Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume. Onyeisi na-ana onyinye, onye ọkaikpe na-eri ngarị, ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha, si otu a na-akpagbu eziokwu.
Ems 5:12Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba, matakwa ọtụtụ mmehie unu niile. Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị. Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama.
Ihe atụ
- Ụmụ Samuel na-eri ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi1Sa 8:3
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 8:3Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya. Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha. Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.
- Ndị eze Filistia kwere Delaịla ọlaọcha ka ọ rara Samsin nyeNkp 16:5
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 16:5Ndị eze ndị Filistia, bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.”
- Asa zigaara Ben-Hadad ọlaọcha na ọlaedo nke ụlọnsọ1Ez 15:18–19
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 15:18–19Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ozi ya ka ha chịrị ha zigara Ben-Hadad, nwa Tabrimọm, nwa Hezion, bụ eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị, “Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị onyinye ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”
- Ehaz zigaara eze Asịrịa ọlaọcha na ọlaedo nke ụlọnsọ2Ez 16:8
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 16:8Ehaz weere ọlaedo na ọlaọcha ahụtara nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼakụ niile dị nʼụlọeze zigara eze Asịrịa dịka onyinye.
- E goro ndị ndụmọdụ ka ha mebie iwughachi ụlọnsọEzr 4:5
Amaokwu ndị ahụ
Ezr 4:5Ha ji ngarị gota ụfọdụ ndịisi ka ha megide ha, mebikwaa atụmatụ ha niile nʼoge niile Sairọs bụ eze Peshịa, ruokwa nʼoge Daraiọs ghọrọ eze ọhụrụ Peshịa.
- E goro Shemaya ka o mee ka Nehemaya tụọ egwu zoo nʼụlọnsọNeh 6:10–13
Amaokwu ndị ahụ
Neh 6:10–13Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.” Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.” Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya. E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.
- Heman kwere puku talenti iri maka iwu megide ndị JuuEst 3:9
Amaokwu ndị ahụ
Est 3:9Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.”
- Ndịisi nchụaja kwụrụ Judas iri mkpụrụ ọlaọcha atọMat 26:15
Amaokwu ndị ahụ
Mat 26:15Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ.
- A kwụrụ ndị agha ụgwọ ka ha sị na ndị na-eso ụzọ zuru ozu yaMat 28:12–15
Amaokwu ndị ahụ
Mat 28:12–15Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego, sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’ Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.” Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.
- Gọvanọ Feliks tụrụ anya na Pọl ga-enye ya egoỌrụ 24:26
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 24:26Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.