Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ọmụmụ nwa na ịgba aga

Ndụ kwa ụbọchị

Ọmụmụ nwa na ịgba aga nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (39), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Ọmụmụ

  • Nwanyị na-eme ime na-echefu ihe mgbu ya nʼihi ọṅụ ọmụmụ nwaJọn 16:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 16:21Mgbe ime na-eme nwanyị, ọ na-anọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nʼihi ọṅụ na a mụpụtala nwa nʼelu ụwa.
  • Ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, Shifra na Pua, na oche ọmụmụ nwaỌpụ 1:15–16
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 1:15–16Mgbe ahụ kwa, eze Ijipt gwara ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, ndị aha ha bụ Shifra na Pua sị, “Mgbe ọbụla unu na-aghọ nwa ndị inyom Hibru, unu lezie anya nʼokwute e ji amụ nwa, ọ bụrụ nwoke, gbuonụ ya, ma ọ bụrụkwanụ nwanyị, hapụnụ ya ka ọ dịrị ndụ.”
  • Ndị inyom Hibru: “Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute”Ọpụ 1:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 1:19Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.”
  • Rechel nwere ihe mgbu nʼịmụ nwa; nwanyị na-aghọ nwa sịrị, “ọ bụ nwa nwoke ọzọ ka ị mụtara”Jen 35:16–17
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 35:16–17Ha biliri ije, site na Betel. Ma mgbe ha ka nọ ebe dị anya site nʼobodo Efrat, Rechel mụrụ nwa, ma o nwere ihe mgbu ka ọ na-amụ nwa. Mgbe o sitere nʼoke ihe mgbu na-amụpụta nwa ahụ, nwanyị na-aghọ nwa gwara ya, “Atụla egwu, nʼihi na ọ bụ nwa nwoke ọzọ ka ị mụtara.”
  • Rechel nwụrụ nʼụzọ BetlehemJen 35:18–19
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 35:18–19Ma tupu Rechel ekuo ume ikpeazụ, nʼihi na ọ na-anwụ, ọ kpọrọ aha nwa ọhụrụ ahụ Ben-Oni, ma nna ya kpọrọ ya Benjamin. Rechel nwụrụ, e lie ya nʼakụkụ ụzọ gara Efrat, nke a na-akpọkwa Betlehem.
  • Nwunye Finehaz mụrụ nwa mgbe ọ nụrụ ozi ahụ, nwụọ1Sa 4:19–20
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 4:19–20Nwunye nwa ya, bụ nwunye Finehaz, dị ime, nọọkwa nso oge ịmụ nwa ya. Mgbe ọ nụrụ maka obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nụkwa maka ọnwụ nna di ya na di ya, ọ mụpụtara nwa ya nʼike. Ma ọ nwụrụ nʼihi ihe mgbu nke afọ ime. Ma mgbe ọ na-anwụ, ndị inyom na-eji ya ime, sịrị ya, “Atụla egwu, adala mba, ị mụọla nwa nwoke.” Ma ọ zaghị ha ihe ọbụla. Ọ ṅakwaghị ha ntị.
  • Mgbe nwanyị mụrụ nwa nwoke, ọ na-adịghị ọcha ụbọchị asaa, emesịa chere ka e mee ya ka ọ dị ọchaLev 12:2–4
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 12:2–4“Nye ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha, ‘Mgbe nwanyị tụụrụ ime mesịa mụọ nwa nwoke, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa, dịka o si adị mgbe ọ nọ nʼadịghị ọcha nke nsọ ya nʼoge a kara aka. Nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ya, a ga-ebi nwa nwoke ahụ ugwu. Nʼime iri abalị atọ na atọ site nʼụbọchị nwanyị ahụ mụsịrị nwa ahụ, ọ ga-anọkwa na-adịghị ọcha nke ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe dị nsọ aka, maọbụ banye nʼime ebe nsọ, ruo mgbe ụbọchị ime ya ka ọ dị ọcha gasịrị.
  • Mgbe ọ mụrụ nwa nwanyị, izu ụka abụọ nke adịghị ọcha, emesịa ogologo oge ime ka ọ dị ọchaLev 12:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 12:5Mgbe nwanyị dị ime mụrụ nwa nwanyị, ọ ga-abụ onye nʼadịghị ọcha iri ụbọchị na anọ, dịka o si adị mgbe ọ nọ na nsọ ya. Ọ ga-echere tutu iri ụbọchị isii agwụsịa, ime ya ka ọ dị ọcha.
  • Emesịa, a na-enye nwa atụrụ na nnụnụ, maọbụ nnụnụ abụọ ma ọ bụrụ onye ogbenyeLev 12:6, Lev 12:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 12:6“ ‘Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma ọ mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie.
    Lev 12:8Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’ ”
  • Ndị agbataobi na ndị ikwu Elizabet sooro ya ṅụrịa ọṅụLuk 1:57–58
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 1:57–58Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.

Ndị na-eku nwa

  • Onye na-eku Ribeka sooro ya gaa KenanJen 24:59
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 24:59Ya mere, ha zipụrụ nwanne ha nwanyị Ribeka, tinyere nwanyị lekọtara ya anya mgbe ọ dị na nwantakịrị, na ohu Ebraham na ndị ikom so ya.
  • Sera: “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị”Jen 21:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 21:7O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.”
  • Mosis: “kuru ha nʼaka m … dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị”Ọnụ 11:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọnụ 11:12Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji si m kuru ha nʼaka m gawa nʼala ahụ ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị?
  • Pọl: dị nwayọọ, dị ka nne na-azụ ụmụ ya, na-elekọta ha1Te 2:7
    Amaokwu ndị ahụ
    1Te 2:7Ọ bụ ezie, dị ka ndị ozi Kraịst, anyị gara abụ ibu arụ nye unu. Kama, anyị biri nʼetiti unu site nʼịdị nwayọọ dị ka ndị bụ nne na-azụ ụmụntakịrị ha, na-elekọta ha.

Ogologo oge na-enweghị nwa

  • Serai bụ nwanyị aga; ọ mụtaghị nwaJen 11:30
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 11:30Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.
  • Serai nyere Ebram Hega odibo ya nwanyị ka o nwee ụmụJen 16:1–2
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 16:1–2Ma Serai nwunye Ebram, amụtaghị nwa. Serai nwere odibo nwanyị onye Ijipt, aha ya bụ Hega. Ya mere ọ gwara Ebram sị, “Lee, ugbu a, Onyenwe anyị egbochiela m ịmụta ụmụ. Ugbu a, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi. Ma eleghị anya, aga m esi na ya wulite ezinaụlọ m.” Ebram kweere ihe Serai kwuru.
  • Sera chịrị ọchị: ọ gafeela oge ịmụ nwaJen 18:11–14
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 18:11–14Nʼoge a, Ebraham na Sera emeela nnọọ agadi, gbaakwa isi awọ. Sera agafeela oge ịmụta nwa. Ya mere, mgbe Sera nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ọ chịrị ọchị sị, “Agadi nwanyị dịka m o si aṅaa amụta nwa, ugbu a onyenwe m karala nka?” Onyenwe anyị jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’ Ọ dị ihe nyịrị Onyenwe anyị ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.”
  • Sera mụrụ Aịzik; Ebraham gbara narị afọJen 17:17, Jen 21:2, Jen 21:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 17:17Ebraham dara kpuo ihu nʼala, chịakwa ọchị nʼobi ya sị, “Ọ bụ onye gbara narị afọ ka a ga-amụrụ nwa? Sera, onye gbara iri afọ itoolu ọ ga-amụ nwa?”
    Jen 21:2Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa.
    Jen 21:5Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke.
  • Aịzik kpere ekpere maka Ribeka nwanyị aga, ọ tụrụ imeJen 25:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 25:21Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.
  • Rechel: “Nye m ụmụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m anwụ”Jen 30:1–2
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 30:1–2Rechel hụrụ na ya amụghị nwa ọbụla nye Jekọb, o kworo ekworo megide nwanne ya nwanyị. Ya mere, ọ sịrị Jekọb, “Nye m ụmụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m anwụ.” Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?”
  • Rechel na Lịa kpara ụka banyere mandrekiJen 30:14–16
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 30:14–16Otu ụbọchị, nʼoge a na-aghọ ọka wiiti, Ruben nwa Lịa, gara nʼọhịa hụ ahịhịa a na-akpọ mandreki. Ọ kụtaara nne ya ụfọdụ nʼime ahịhịa a. Mgbe Rechel hụrụ ahịhịa a, ọ rịọrọ Lịa sị ya, “Biko nyetụ m ụfọdụ nʼime mandreki ndị a nwa gị nwoke kụtara.” Ma Lịa zara sị ya, “O zubeere gị na ị napụrụ m di m? Ị chọkwara ịnapụ m mandreki ndị a nwa m nwoke wetaara m?” Rechel zara Lịa sị, “Ọ dị mma, ka gị na ya dinaa nʼabalị a ka ọ bụrụ ihe mgbanwo maka mandreki nwa gị nwoke.” Ya mere, mgbe Jekọb si nʼọhịa na-alọbata nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, Lịa pụrụ izute ya, sị ya, “Ị ga-abakwute m nʼihi na m ejirila m ahịhịa mandreki nwa m nwoke m zụta gị.” Ha dinara nʼabalị ahụ.
  • Rechel mụrụ Josef: “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m”Jen 30:22–24
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 30:22–24Chineke chetara Rechel. Ọ nụrụ olu ya, meghee akpanwa ya. Nʼihi ya, Rechel tụụrụ ime mụta nwa nwoke. Ọ sịrị, “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m.” Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị nyekwa m nwa nwoke ọzọ.”
  • Nwunye Manoa, nwanyị aga, mụrụ SamsinNkp 13:2–3, Nkp 13:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 13:2–3Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa. Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa.
    Nkp 13:24Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. Onyenwe anyị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite.
  • Elkena na-enye Hana, onye na-enweghị nwa, òkè abụọ1Sa 1:2, 1Sa 1:5
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 1:2Elkena lụrụ ndị inyom abụọ, aha nke mbụ bụ Hana, ebe aha nke abụọ bụ Penina. Penina nwere ụmụ, ma Hana enweghị nwa.
    1Sa 1:5Ma ọ na-enye Hana oke mmadụ abụọ, nʼihi na ọ hụrụ ya nʼanya, ọ bụ ezie na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.
  • Penina na-akpasu Hana iwe kwa afọ1Sa 1:6–7
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 1:6–7Ma Penina na-eme ka obi jọọ Hana njọ karịa, site nʼikpasu ya iwe, nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya. Ihe ndị a na-eme kwa afọ. Penina na-akwa Hana emo, na-achị ya ọchị oge niile ha gara nʼụlọ Onyenwe anyị, si otu a na-eme ka ọ na-akwa akwa, gharakwa iri nri.
  • Hana kwara ákwá, kwe nkwa; ọ mụrụ Samuel1Sa 1:10–11, 1Sa 1:19–20
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 1:10–11Nʼọnọdụ obi mwute Hana kwara akwa, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị. O kwere nkwa sị, “O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla.”
    1Sa 1:19–20Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri kpọọ isiala nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, ha laghachiri nʼụlọ ha dị na Rema. Mgbe ha laruru, Elkena bakwuru nwunye ya Hana, Onyenwe anyị chetakwara ya. Mgbe oge ruru, o mere ka Hana tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Samuel, nʼihi na ọ sịrị, “Arịrịọ m Onyenwe anyị maka ya.”
  • E mesịa, Hana mụtakwara ụmụ ndị ọzọ1Sa 2:21
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 2:21Onyenwe anyị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu Onyenwe anyị.
  • Nwanyị Shunem, onye di ya mere agadi, mụrụ nwa nwoke nʼafọ sotere ya2Ez 4:14–17
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 4:14–17Ịlaisha jụrụ, “Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?” Gehazi sịrị, “Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi.” Ịlaisha sịrị, “Kpọọ ya.” Ya mere, Gehazi kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼọnụ ụzọ. Ịlaisha sịrị, “Na mgbe dị otu a nʼafọ ọzọ, ị ga-eku nwa nwoke nʼaka gị abụọ.” Ọ sịrị, “Mba, onyenwe m, biko, gị onye nke Chineke, agwala ohu gị nwanyị okwu ụgha.” Ma dịka Ịlaisha si kwuo, nwanyị ahụ tụụrụ ime, na mgbe ahụ nʼafọ ọzọ ya, ọ mụrụ nwa nwoke.
  • Mikal amụtaghị nwa ruo ụbọchị ọnwụ ya2Sa 6:23
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 6:23Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.
  • Elizabet, nwanyị aga, onye agadi, tụrụ ime, zoo onwe ya ọnwa iseLuk 1:7, Luk 1:24–25, Luk 1:36
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 1:7Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi.
    Luk 1:24–25Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise. Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.”
    Luk 1:36Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga.
  • Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ ya dịka nne ọṅụ juru obiAbụ 113:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 113:9Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi. Toonu Onyenwe anyị.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.