Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ọrụ ubi

Ndụ kwa ụbọchị

Ọrụ ubi nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (37), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • E tinyere mmadụ nʼIden ka ọ kọọ ya, lekọtakwa yaJen 2:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 2:15Onyenwe anyị Chineke weere mmadụ ahụ tinye ya nʼogige Iden, ka ọ na-akọ ya ma bụrụkwa onye na-elekọta ya.
  • Ken bụ onye ọrụ ubi; Ebel na-azụ atụrụJen 4:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 4:2Emesịa Iiv mụtara nwanne ya nwoke Ebel. Ebel ghọrọ onye na-azụ igwe atụrụ. Ma Ken ghọrọ onye ọrụ ubi.
  • Noa, onye ọrụ ubi, kụrụ ubi vaịnịJen 9:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 9:20Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige.
  • Aịzik kụrụ mkpụrụ, wee ihe ubi narị okpukpu nʼafọ ahụJen 26:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 26:12Aịzik kụrụ mkpụrụ ubi nʼala ahụ. Nʼotu afọ ahụ kwa, o si nʼala ahụ webata ihe ubi narị okpukpu karịa nke ọ kụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị gọziri ya.
  • Rut na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi: ihe dị ka otu efa ọka balịRut 2:2–3, Rut 2:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Rut 2:2–3Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka ndị ha hapụrụ.” Naomi zara sị ya, “Ọ dị mma nwa m, gaa.” Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek.
    Rut 2:17Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel.
  • Boaz na-afụcha ọka balị nʼabalị nʼebe ịzọcha ọkaRut 3:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Rut 3:2Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka.
  • Gidiọn na-azọcha ọka wiiti nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ka o zoo ya ndị MidiaNkp 6:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 6:11Mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara nọdụ ọdụ nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼOfra, nʼala ubi Joash, onye obodo Abieza, ebe nwa ya a na-akpọ Gidiọn nọ na-azọcha mkpụrụ ọka wiiti nʼime ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼihi na ọ na-ezo onwe ya ka ndị Midia hapụ ịhụ ya anya.
  • Ndị Bet-Shemesh na-ewe ọka wiiti na ndagwurugwu1Sa 6:13
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 6:13Nʼoge a, ndị Bet-Shemesh nọ nʼubi na-ewe ihe ubi nke ọka wiiti na ndagwurugwu ala ahụ. Mgbe ha lepụrụ anya hụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ọṅụ juru ha obi.
  • Ndị Izrel na-aga nʼebe ndị Filistia ka ha mụọ ihe ọkọ ubi na mma ịwe ọka1Sa 13:19–21
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 13:19–21Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala Izrel, nʼihi na ndị Filistia sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị Hibru ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.” Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi. Ihe ha na-akwụ maka ịmụ ọgụ igwuze ala, na mma oge ha bụ ụzọ abụọ nke shekel e kere ụzọ atọ, maka ịmụ anyụike, na ndụdụ, ya na ịpị ndụdụ e ji achị ehi bụ, otu ụzọ nke shekel e kere ụzọ atọ.
  • Ịlaisha ji ehi iri abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ na-akọ ubi1Ez 19:19
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 19:19Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya.
  • Ndị nlekọta Devid na-ahụ maka ubi, ubi vaịnị, osisi oliv na igwe anụ ụlọ1Ih 27:26–31
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ih 27:26–31Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya. Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile. Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha. Baal-Hanan onye Gedera na-elekọta ubi oliv na osisi sikamọ eze, nke dị nʼoke ala ndị Filistia na Izrel. Joash ka ọ dị nʼaka iweta mmanụ oliv. Shitrai onye Sharọn na-elekọta igwe ehi eze ndị na-ata nri na Sharọn. Shafat nwa Adlai na-elekọta igwe ehi ndị nke dị nʼala ndagwurugwu. Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze. Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu. Jaziz onye Haga bụ onyeisi na-elekọta igwe atụrụ. Ndị a niile bụ ndịisi na-elekọta akụ niile nke eze Devid nwere.
  • Ụzaya, onye hụrụ ọrụ ubi nʼanya, nwere ndị ọrụ ubi na ndị na-elekọta ubi vaịnị2Ih 26:10
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ih 26:10O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu.
  • Solomọn kụrụ ubi vaịnị na ubi mkpụrụ osisi, gwuo ọdọ mmiriEkl 2:4–6
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 2:4–6Arụpụtara m ọtụtụ ihe dị iche iche, ewuru m ụlọ nye onwe m ma nweekwa ubi vaịnị. Ewuru m ubi a gbara ogige ebe izuike, ma kụọkwa osisi na-amị mkpụrụ dị iche iche nʼime ha, wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri.
  • Ịkọ ubi, ịkụ mkpụrụ nʼahịrị, na ịzọcha ihe ubi ọbụla nʼụzọ nke yaAịz 28:24–28
    Amaokwu ndị ahụ
    Aịz 28:24–28Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ? Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla? Mgbe o gwuzesịrị ya, ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin? Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya, ọka balị nʼebe o kwesiri, na spelti nʼebe o kwesiri? Ọ maara ihe o kwesiri ime, nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi. Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe, maọbụ kpọree ụkwụ igwe nʼelu kumin, kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin, werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe. A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ, ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya. E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha, ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha.
  • Onye ọrụ ubi na-eche mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụJem 5:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Jem 5:7Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya.
  • Ndị na-eso ụzọ ghọrọ ogbe ọka ka ha na-agafe nʼubiMat 12:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 12:1Nʼoge ahụ, Jisọs sitere nʼubi a kụrụ ọka na-agafe nʼụbọchị izuike. Ma ebe agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ịghọ ogbe ọka, na ịta mkpụrụ ya.
  • Mkpụrụ dara nʼụzọ, nʼelu nkume, nʼetiti ogwu, nʼezi ala (ilu)Mat 13:3–8
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 13:3–8O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo. Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi. Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala. Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha. Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị.
  • Ndị ọrụ e goro nʼubi vaịnị otu denarị kwa ụbọchị (ilu)Mat 20:1–2
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 20:1–2“Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya. Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya.

Nʼime Iwu

  • Kụọ mkpụrụ afọ isii; nʼafọ nke asaa, ala ga-ezu ikeỌpụ 23:10–11, Lev 25:3–5
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 23:10–11“Afọ isi ka ị ga-agha mkpụrụ nʼala ubi gị, ghọọkwa ihe omume ya. Ma nʼafọ nke asaa, arụla ọrụ ọbụla nʼala ahụ ọzọ, hapụ ka ala ahụ zuru ike. Mgbe ahụ ndị ogbenye nʼetiti unu ga-aga nʼebe ahụ weta ihe oriri. Mkpụrụ ndị ọzọ fọdụrụ ga-adịrị ụmụ anụ ọhịa dị iche iche. Iwu ndị a ga-adịrị ubi vaịnị na ubi oliv unu niile.
    Lev 25:3–5Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu. Ma mgbe o ruru afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ala ubi unu ka o zuo ike, afọ izuike nye Onyenwe anyị. Unu akụla ihe ọbụla nʼubi unu maọbụ kwachaa osisi vaịnị unu. Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile.
  • Zuo ike nʼụbọchị nke asaa, ọ bụladị nʼoge ịkọ ubi na owuwe ihe ubiỌpụ 34:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 34:21“Nʼoge ịkụ ihe nʼubi na nʼoge owuwe ihe ubi, rụọnụ ọrụ naanị ụbọchị isii. Zukwanụ ike nʼụbọchị nke asaa.
  • Hapụrụ ndị ogbenye akụkụ ubi na mkpụrụ vaịnị dara adaLev 19:9–10
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 19:9–10“ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala. A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
  • A na-ahapụrụ onye ọbịa, nwa mgbei na nwanyị di ya nwụrụ ukwu ọka a lefuru anyaDit 24:19–21
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 24:19–21Ọ bụrụ na i lefuo ukwu ọka ụfọdụ anya mgbe ị na-ewe ihe ubi nʼubi gị, alaghachila azụ nʼubi gị ịchịrị ha. Hapụrụ ya ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, ọ ga-emekwa ka ị baa ụba. Mgbe ị na-akụtusi mkpụrụ osisi oliv gị, ejeghachila azụ nʼalaka ọbụla inyochazi ya, ịchọpụta ma ị ghọtachaala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ha. Hapụrụ ndị ọbịa na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ mkpụrụ ọbụla fọdụrụ. Otu a ka ị ga-emekwa nʼihe banyere mkpụrụ ubi vaịnị gị. Atụtụkọchala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ya. Hapụrụ ndị ọbịa, na ndị mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ ihe niile fọdụrụ.
  • Ọ dịghị ụdị mkpụrụ abụọ; ọ dịghị ehi na ịnyịnya ibu e jikọtara ọnụLev 19:19, Dit 22:9–10
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 19:19“ ‘Unu ga-edebe iwu m niile. “ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.
    Dit 22:9–10Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ. Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi.
  • A naghị eri mkpụrụ osisi a kụrụ ọhụrụ afọ atọLev 19:23–25
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 19:23–25“ ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha. Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye Onyenwe anyị onyinye otuto. Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
  • Ịkwụ ụgwọ maka anụ ụlọ kpafuru maọbụ ọkụ rere ubiỌpụ 22:5–6
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 22:5–6“Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya hapụ anụ ụlọ ya ka ọ gaa taa nri nʼubi maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ nʼubi onye ọzọ, onyenwe anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe niile anụ ụlọ ya mebiri, ma ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ aghaghị ịbụ ihe ọrụ ubi dị mma nke o si nʼubi ya maọbụ nʼubi vaịnị ya wepụta. “Ọ bụrụ na ọkụ na-agba banye nʼogwu, repịa ogbo ọka dị nʼubi mmadụ maọbụ ọka guzoro eguzo, ma ọ bụkwanụ ọhịa niile, onye ahụ tinyere ọkụ ahụ ga-akwụghachi ụgwọ ihe ahụ niile nke ọkụ repịara.
  • Rie nke ga-eju gị afọ nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, ma etinyela ihe ọbụla nʼakpaDit 23:24–25
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 23:24–25Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị. Otu a kwa, ị banye nʼubi ọka onye agbataobi gị, ghọrọ mkpụrụ ọka ọbụla ị chọrọ nʼaka gị, nọọkwa nʼebe ahụ taa ya, ma ị gaghị etinye mma iwe ihe ubi nʼime ọka ha ndị guzoro eguzo.
  • Ejila ihe kechie ehi ọnụ mgbe ọ na-azọcha ọkaDit 25:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 25:4Mgbe ehi na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ.
  • Nwoke na-erebeghị mkpụrụ ubi vaịnị ọhụrụ ya na-ala nʼụlọ site nʼaghaDit 20:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 20:6Ọ dị nwoke ọbụla kụrụ ubi vaịnị ọhụrụ nke ọ na-esitebeghị nʼime ya ghọọ mkpụrụ ọbụla? Ya laa, ka ọ ghara ịnwụ nʼagha, hapụrụ ya onye ọzọ nke ga-eri mkpụrụ si na ya!

Okwu

  • Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri buru ibuIlu 12:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 12:11Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.
  • Ubi onye umengwụ jupụtara nʼogwu, mgbidi nkume ya dara adaIlu 24:30–31
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 24:30–31Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche, hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala.
  • Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ; esepụkwala aka nʼanyasịEkl 11:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 11:6Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ, esepụkwala aka nʼanyasị, nʼihi na ị maghị nke ga-eto, maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ, ha niile nwere ike too nke ọma.
  • Mara ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na igwe ehi gịIlu 27:23–27
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 27:23–27Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ, nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga. Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu. Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị. Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.
  • Onye na-akụ mkpụrụ ntakịrị ga-aghọtakwa nke nta2Kọ 9:6
    Amaokwu ndị ahụ
    2Kọ 9:6Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne.
  • Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ibu ụzọ rie mkpụrụ ubi2Tm 2:6
    Amaokwu ndị ahụ
    2Tm 2:6Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ịbụ onye ga-ebu ụzọ rie mkpụrụ sitere nʼubi ya.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.