Nyochaa › Isiokwu › Olili ozu na ili
Ndụ kwa ụbọchị
Olili ozu na ili nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (42), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- A na-eli ndị nwụrụ anwụ ngwa ngwa, ọtụtụ mgbe nʼotu ụbọchị ahụDit 21:23, Ọrụ 5:6, Ọrụ 5:10
Amaokwu ndị ahụ
Dit 21:23unu agaghị ahapụ ozu ya ka ọ dịgide nʼelu osisi abalị ahụ niile. Hụnụ na e liri ya nʼotu ụbọchị ahụ, nʼihi na onye ọbụla a kwụbara nʼelu osisi bụ onye Chineke bụrụ ọnụ. Emerụla ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.
Ọrụ 5:6Ụmụ okorobịa ndị nọ ebe ahụ batara jiri akwa kee ozu ya bupụ ya ga lie.
Ọrụ 5:10Nʼotu oge ahụ ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, nwụọ, ụmụ okorobịa ahụ liri di ya batakwara chọpụta na ọ nwụọla, buru ya pụọ gaa lie ya nʼakụkụ di ya.
- A na-esure ihe na-esi isi ụtọ iji sọpụrụ ndị eze nwụrụ anwụJer 34:5
Amaokwu ndị ahụ
Jer 34:5ị ga-anwụ nʼudo. Dịka ndị mmadụ si mụnye ọkụ kwaa ozu nna gị ha, bụ ndị buru gị ụzọ chịa ka eze, otu a ka ha ga-esi mụnye ọkụ kwaa gị. Ha ga-eti aka nʼobi kwa akwa sị, “Ewoo, onyenwe anyị!” Ọ bụ mụ onwe m na-ekwe nkwa a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
- Eze Devid sooro ihe ndina ozu Abna, kwaa ákwá nʼili ya2Sa 3:31–32
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 3:31–32Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ. Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna.
- Na Nain, igwe mmadụ sooro nwa nwoke naanị otu nke nwanyị di ya nwụrụ gaa oliliLuk 7:12
Amaokwu ndị ahụ
Luk 7:12Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya.
Olili
- Ndị okenye Fero, ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya so gaa ili JekọbJen 50:7–9
Amaokwu ndị ahụ
Jen 50:7–9Ya mere, Josef gara ili nna ya. Ọtụtụ ndị mmadụ sokwa ya. Ndịisi ọchịchị Fero, na ndị okenye ụlọ ya, na ndị okenye a ma ama nʼala Ijipt. Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen. Ma ịnyịnya ụgbọ na ndị na-agba ịnyịnya, so ya gaa. Igwe mmadụ gara ije a buru ibu nke ukwuu.
- Aịzik na Ishmel liri Ebraham; Ịsọ na Jekọb liri AịzikJen 25:9, Jen 35:29
- Izrel niile ruru ụjụ Samuel, lie ya nʼụlọ ya na Rema1Sa 25:1, 1Sa 28:3
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 25:1Emesịa Samuel nwụrụ. Izrel niile chịkọtara onwe ha ọnụ zukọta ruo ụjụ nʼihi ọnwụ ya. Ha liri ya nʼụlọ ya dị na Rema. Emesịa, Devid gara nʼọzara Paran biri nʼebe ahụ.
1Sa 28:3Nʼoge a Samuel anwụọla, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, lie ya nʼobodo ya bụ Rema. Sọl achụpụsịakwala ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase na ndị dibịa afa site nʼala ahụ.
- Ndị ikom Jebesh jere ije abalị niile iji wetaghachi ozu Sọl1Sa 31:11–13
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 31:11–13Mgbe ndị obodo Jebesh Gilead nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl, ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, gara njem ogologo abalị ahụ niile jeruo Bet-Shan. Ha sitere nʼelu mgbidi obodo Bet-Shan tọda ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom buru ha laa Jebesh ebe ha nọ kpọọ ozu ha ọkụ. Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi Tamarisk dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.
- Devid bufere ọkpụkpụ Sọl na Jonatan nʼili Kish2Sa 21:12–14
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 21:12–14ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa. Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu. Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ.
- Ndị ikom na-atụ egwu Chineke liri Stivin, ruo ụjụ nke ukwuu nʼihi yaỌrụ 8:2
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 8:2Ndị ikom, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin gaa lie ya. Ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ya.
Ọchịchọ banyere olili
- Jekọb rịọrọ ka e lie ya na ndị nna ya, ọ bụghị nʼIjiptJen 47:30, Jen 49:29–32
Amaokwu ndị ahụ
Jen 47:30Kama, mgbe m nwụrụ, site nʼala Ijipt bupụ m. Buru ozu m gaa lie ya ebe e liri nna m ha.” Ọ zara, “Aga m eme dịka i kwuru.”
Jen 49:29–32Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het. Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu. Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa. Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”
- Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-ebupụ ọkpụkpụ ya site nʼIjiptJen 50:25
Amaokwu ndị ahụ
Jen 50:25Mgbe ahụ, Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọrọ ya iyi sị, “Mgbe Chineke bịara ileta unu, unu aghaghị ị site nʼebe a chịkọrọ ọkpụkpụ m.”
- Bazilai chọrọ ịnwụ nʼakụkụ ili nna ya na nne ya2Sa 19:37
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 19:37Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.”
- Otu agadi onye amụma rịọrọ ka e lie ya nʼakụkụ onye nke Chineke1Ez 13:30–31
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 13:30–31O liri ozu onye nke Chineke ahụ nʼili nke aka ya. Mgbe o liri ya, ọ kwara akwa sị, “Ewoo nwanna m!” Mgbe o lisiri ya, ọ gwara ụmụ ya ndị ikom sị, “Mgbe m nwụrụ, lienụ m nʼotu ili a e liri onye nke Chineke; doonụ ọkpụkpụ m ka ọ dịrị nʼakụkụ ọkpụkpụ ya.
Ili na ebe a na-eli ozu
- Ebraham zụtara ọgba Makipela narị shekel ọlaọcha anọJen 23:16–20
Amaokwu ndị ahụ
Jen 23:16–20Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa. Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu, ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan. Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị Het resiri Ebraham ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na-eli ozu.
- Jekọb guzobere ogidi nʼelu ili Rechel nʼụzọ BetlehemJen 35:19–20
Amaokwu ndị ahụ
Jen 35:19–20Rechel nwụrụ, e lie ya nʼakụkụ ụzọ gara Efrat, nke a na-akpọkwa Betlehem. Jekọb wuru ogidi nʼelu ili ya, nke na-eguzokwa ruo taa, igosi ebe e liri Rechel.
- E liri nʼokpuru osisi: Debọra nʼokpuru osisi ook, Sọl nʼokpuru osisi tamariskJen 35:8, 1Sa 31:13
- E liri ndị eze Juda nʼobodo Devid1Ez 2:10, 2Ih 32:33
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 2:10Emesịa, Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E liri ya na obodo Devid.
2Ih 32:33Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ, e lie ya nʼugwu nʼebe ili ndị nna nna Devid dị. Ndị Juda niile na ndị niile bi na Jerusalem kwanyere ya ugwu nʼọnwụ ya. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
- E liri Jehoiada onye nchụaja na ndị eze2Ih 24:16
Amaokwu ndị ahụ
2Ih 24:16E liri ya nʼebe a na-eli ndị eze nʼobodo Devid nʼihi ihe ọma niile o meere Izrel na Chineke na ụlọnsọ ya.
- E liri Joash na Jehoram, ma ọ bụghị nʼili ndị eze2Ih 24:25, 2Ih 21:20
Amaokwu ndị ahụ
2Ih 24:25Mgbe ndị agha Aram lara, hapụ Joash nʼọnọdụ mmerụ ahụ dị ukwuu, ndịisi ozi ya gbara izu gbuo ya, nʼihi ogbugbu o gburu nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ha gburu ya mgbe o dina nʼihe ndina ya. Emesịa, ha liri ya nʼobodo Devid, ma ọ bụghị nʼebe a na-eli ndị eze.
2Ih 21:20Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.
- E liri Ụzaya, onye ekpenta, nʼọhịa dị nso nʼili ndị eze2Ih 26:23
Amaokwu ndị ahụ
2Ih 26:23Ụzaya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼọhịa ebe a na-eli ozu nke dịịrị ndị eze, maka na ndị mmadụ sịrị, “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
- E liri Manase na Amọn nʼubi Ụza2Ez 21:18, 2Ez 21:26
- E liri Joab nʼala nke ya nʼọzara1Ez 2:34
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 2:34Benaya nwa Jehoiada gara gbuo Joab. E liri ya nʼala nke ya dị nʼọzara.
- Josaya hụrụ ili nʼelu ugwu, na ihe ncheta nʼelu otu nʼime ha2Ez 23:16–17
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 23:16–17Josaya legharịkwara anya gburugburu hụ ọtụtụ ili dị nʼelu ugwu. O ziri ndị ohu ya ka ha gaa chịpụtasịa ọkpụkpụ dị nʼili ahụ niile, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja imerụ ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke onye nke Chineke kwupụtara mgbe o buru amụma banyere ihe ndị a. Josaya jụrụ ndị guzo nʼebe ahụ ajụjụ sị, “Ọ bụ ili onye bụ nke a?” Ndị ikom obodo ahụ zara sị, “Ọ bụ ili onye nke Chineke ahụ si Juda bịa buo amụma megide ebe ịchụ aja Betel. O buru amụma na ihe ndị a ị na-eme ebe ịchụ aja a ga-emezu.”
- E tọgbọrọ Jisọs nʼili ọhụrụ nʼubi dị nso ebe a kpọgidere ya nʼobeJọn 19:41–42
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 19:41–42Ebe ahụ a kpọgidere ya nʼobe dị nʼotu ubi a gbara ogige. Nʼime ogige a, otu ili ọhụrụ dị na ya nke e jibeghị lie onye ọbụla. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, nakwa nʼihi na ili ahụ dị nso, ha dọnyere ahụ Jisọs nʼime ya.
- Ndị inyom ahụ na-eche onye ga-enupụ nkume ukwu ahụ site nʼọnụ iliMak 16:3–4
Amaokwu ndị ahụ
Mak 16:3–4Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ.
- E zụtara ala ọkpụ ite ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịaMat 27:7
Amaokwu ndị ahụ
Mat 27:7Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa.
- A tụnyere ozu Ụraya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efuJer 26:23
Amaokwu ndị ahụ
Jer 26:23Ha si nʼIjipt kpọlata Ụraya, duru ya gaa nʼihu Jehoiakim bụ eze, onye nyere iwu ka e jiri mma agha gbuo ya. A tụnyere ozu ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu nʼala ahụ.)
- A tụbara Absalọm nʼolulu, tụọ nnukwu nkume nʼelu ya2Sa 18:17
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 18:17Ha buuru ozu Absalọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha Izrel niile gbalara nʼụlọ ha.
- Ọ dịghị onye maara ebe ili Mosis dịDit 34:6
Amaokwu ndị ahụ
Dit 34:6Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.
- Otu nwoke mmụọ ọjọọ bụ na-ebi nʼetiti iliMak 5:3, Luk 8:27, Mat 8:28
Amaokwu ndị ahụ
Mak 5:3Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya.
Luk 8:27Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu.
Mat 8:28Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.