Nyochaa › Isiokwu › Ahịa na ndị ahịa
Ndụ kwa ụbọchị
Ahịa na ndị ahịa nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (37), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- Ebraham tụpụtara ọlaọcha “dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa”Jen 23:16
Amaokwu ndị ahụ
Jen 23:16Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa.
- Igwe ndị ahịa Ishmel ji ịnyịnya kamel bu ụda, mgbaa na máá gaa IjiptJen 37:25
Amaokwu ndị ahụ
Jen 37:25Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga.
- E resịrị Josef ndị ahịa shekel ọlaọcha iri abụọJen 37:28, Jen 37:36
Amaokwu ndị ahụ
Jen 37:28Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt.
Jen 37:36Ugbu a, ndị Midia ahụ rere Josef nʼIjipt, resi ya Pọtifa, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, onye bụ onyeisi ndị nche Fero, bụ eze Ijipt.
- Hiram zitere osisi sida na junipa; Solomọn ji ọka wiiti na mmanụ oliv kwụọ ụgwọ1Ez 5:8–11, 2Ih 2:15
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 5:8–11Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị, “Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa. Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.” Nʼụzọ dị otu a, Hiram nọgidere na-ezitere Solomọn osisi sida na junipa niile ọ chọrọ. Solomọn nyere Hiram na ezinaụlọ ya narị puku bushel, na iri puku bushel ọka wiiti abụọ, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ ya, tinyekwara narị puku galọọnụ, na iri puku galọọnụ abụọ nke mmanụ oliv asụrụ asụ. Solomọn nọgidere na-enye Hiram ihe ndị a kwa afọ.
2Ih 2:15“Ugbu a, ka onyenwe m zitere ndị ohu ya ọka wiiti ahụ, na ọka balị, na mmanya vaịnị, na mmanụ oliv, dịka ọ kwere na nkwa.
- Ụgbọ mmiri Solomọn wetara talenti ọlaedo 420 site nʼỌfịa1Ez 9:26–28
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 9:26–28Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm. Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a. Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa, site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.
- Solomọn na-anata uru site nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa1Ez 10:15, 2Ih 9:14
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 10:15na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa na nke sitekwara nʼaka ndị eze Arebịa niile, nakwa nʼaka ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ.
2Ih 9:14na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa. Ọzọkwa, ndị eze niile nke dị Arebịa na ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ, na-enwetara Solomọn ọlaọcha na ọlaedo.
- Naomi na-ere ala nke ElimelekRut 4:3
Amaokwu ndị ahụ
Rut 4:3Mgbe ahụ, ọ gwara nwoke onye mgbapụta ahụ dị nso sị, “Naomi, onye si nʼala ndị Moab lọta, na-achọ ire ala nwanna anyị nwoke Elimelek.
- Ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo na ndị ahịa rụziri akụkụ mgbidi JerusalemNeh 3:32
Amaokwu ndị ahụ
Neh 3:32Ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo na ndị ahịa rụchara ọrụ iwuzi akụkụ mgbidi nke fọdụrụ, site nʼetiti ọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ.
- Ndị Taịa na-ere azụ na Jerusalem nʼụbọchị izuikeNeh 13:16
Amaokwu ndị ahụ
Neh 13:16Ndị si obodo Taịa, bụ ndị birila na Jerusalem nọ na-ebubata azụ na ngwa ahịa ndị ọzọ dị iche iche, na-ere ha na Juda, nakwa na Jerusalem nʼụbọchị izuike.
- Nehemaya mechiri ọnụ ụzọ ama; ndị ahịa nọrọ abalị nʼezi obodoNeh 13:19–20
Amaokwu ndị ahụ
Neh 13:19–20Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike. Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ.
- Nwunye nwere ike na-azụ ubi, na-ere uwe ogho ọchaIlu 31:16, Ilu 31:24
- Ụgbọ mmiri Pọl budatara ibu ya na TaịaỌrụ 21:2–3
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 21:2–3Mgbe anyị hụrụ ụgbọ mmiri na-aga Fonisia, anyị banyere nʼime ya kwọpụ. Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ Saiprọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo Siria. Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya.
- Lidia, onye na-azụ ahịa akwa odo odo si TiatiraỌrụ 16:14
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 16:14Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu.
- Ndị na-agbanwe ego na ndị na-ere nduru nʼogige ụlọnsọJọn 2:14
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 2:14Nʼime ụlọnsọ ukwu, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego.
- Onye ahịa rere ihe niile o nwere maka otu nkume dị oke ọnụahịa (ilu)Mat 13:45–46
Amaokwu ndị ahụ
Mat 13:45–46“Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara. Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa.
- E nyere ndị ohu ego ka ha jiri zụọ ahịa (ilu)Luk 19:13, Mat 25:16
- “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa”Jem 4:13
Amaokwu ndị ahụ
Jem 4:13Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.”
Ahịa na Taịa (Izikiel 27)
- Tashish: ọlaọcha, igwe, gbamgbam na opuIzk 27:12
Amaokwu ndị ahụ
Izk 27:12“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
- Ndị Griis, Tubal na Meshek: ndị ohu na ihe e ji bronz kpụọIzk 27:13
Amaokwu ndị ahụ
Izk 27:13“ ‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
- Bet Togama: ịnyịnya, ịnyịnya agha na ịnyịnya ibuIzk 27:14
Amaokwu ndị ahụ
Izk 27:14“ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ.
- Dedan: akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya; ndị bi nʼọnụ mmiri: ọdụ enyi na osisi eboniIzk 27:15, Izk 27:20
- Aram: tọkwọisi, akwa odo odo, akwa a kpara nke ọma, ezi akwa ogho ọcha, kọral na rubiIzk 27:16
Amaokwu ndị ahụ
Izk 27:16“ ‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
- Juda na Izrel: ọka wiiti, mmanụ aṅụ, mmanụ na mmanụ otiteIzk 27:17
Amaokwu ndị ahụ
Izk 27:17“ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
- Damaskọs: mmanya Helbon na ajị anụIzk 27:18
Amaokwu ndị ahụ
Izk 27:18“ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta,
- Arebịa na Keda: ụmụ atụrụ, ebule na mkpiIzk 27:21
Amaokwu ndị ahụ
Izk 27:21“ ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.
- Sheba na Raama: ụda, nkume dị oke ọnụahịa na ọlaedoIzk 27:22
Amaokwu ndị ahụ
Izk 27:22“ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.
Nʼime Iwu
- Ihe ọtụtụ, ihe ịtụ arọ na ihe nleta ziri eziLev 19:35–36, Dit 25:13–15
Amaokwu ndị ahụ
Lev 19:35–36“ ‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu, Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu.
Dit 25:13–15Enwela ụzọ ihe ọtụtụ abụọ nʼime akpa gị, nke dị arọ, na nke na-adịghị arọ. Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta. Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
- Onye na-azụ na onye na-ere aghọgbula ibe haLev 25:14
Amaokwu ndị ahụ
Lev 25:14“ ‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu.
Okwu
- “Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ na-asị, wee nya isi mgbe ọ pụrụIlu 20:14
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 20:14“Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.
- Ndị ahịa na-eche ka ụbọchị izuike gwụ ka ha ree ọkaEms 8:5
Amaokwu ndị ahụ
Ems 8:5na-asị, “Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe ka anyị ree mkpụrụ ubi, na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ ka anyị ree ọka wiiti?” Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta, na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu, na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.