Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Iwe

Ndụ kwa ụbọchị

Iwe nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (41), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Okwu

  • Ọsịsa dị nro na-eme ka iwe laa; okwu ike na-akpali yaIlu 15:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 15:1Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ; ma okwu ike na-akpali iwe.
  • Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ ka onye dike mmaIlu 16:32, Ilu 14:29
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 16:32Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.
    Ilu 14:29Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.
  • Nwoke na-adịghị achị onwe ya dị ka obodo mgbidi ya tikpọrọIlu 25:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 25:28Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.
  • Onye nzuzu na-egosi iwe ya niile; onye maara ihe na-ejide yaIlu 29:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 29:11Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
  • Dịka ịpịa mmiri ara na-ewepụta mmanụ ara, ikpali iwe na-eweta ise okwuIlu 30:33
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 30:33A pịaa mmiri ara ehi a na-ewepụta mmanụ ara ehi; iti mmadụ aka nʼimi na-akpata ịgba ọbara, otu a kwa ikpali iwe na-eweta ise okwu.”
  • Iwe na-ebi nʼobi ndị nzuzuEkl 7:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 7:9Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ, nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.
  • Kwụsị iwe; ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọAbụ 37:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 37:8Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
  • Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka na-ewe iweEfe 4:26
    Amaokwu ndị ahụ
    Efe 4:26Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.
  • Nụ ihe ọsịịsọ, kwuo okwu nwayọọ, ewela iwe ọsịịsọJem 1:19–20
    Amaokwu ndị ahụ
    Jem 1:19–20Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke.

Ihe atụ

  • Ken were oke iwe, gbuo nwanne ya EbelJen 4:5–8
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 4:5–8ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ. Ma Onyenwe anyị jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ? Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya.” Ken gwara nwanne ya Ebel sị, “Bịa soro m ka anyị banye ọhịa.” Mgbe ha nọ nʼebe ahụ, Ken jidere nwanne ya gbuo ya.
  • Jekọb gwara Rechel: “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?”Jen 30:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 30:2Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?”
  • Jekọb, iwe were ya, chere Leban akaJen 31:36
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 31:36Iwe were Jekọb megide Leban. O ji iwe jụọ Leban sị, “Gịnị bụ njehie m? Gịnị bụ mmehie m mere i ji si otu a na-achụsi m ike?
  • Jekọb: Simiọn na Livayị — “ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha”Jen 49:5–7
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 49:5–7“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike. Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche. Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.
  • Iwe dị ọkụ were nna ukwu Josef mgbe ọ nụrụ akụkọ nwunye yaJen 39:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 39:19Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya gwara ya sị, “Otu a ka ohu gị si meso m mmeso,” o were iwe dị ọkụ.
  • Fero gwara Mosis: “Lezie anya hụ na ị bịaghị nʼihu m ọzọ”Ọpụ 10:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 10:28Fero gwara Mosis sị, “Si nʼihu m pụọ. Lezie anya hụ na ị bịaghị nʼihu m ọzọ. Ụbọchị ọbụla ị nwara bịa nʼihu m, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ.”
  • Mosis ji iwe dị ọkụ si nʼihu Fero pụọỌpụ 11:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 11:8Ndị ọchịchị gị ndị a ga-abịa gbuo ikpere rịọọ m sị m, ‘Biko kpọrọ ndị gị pụọ nʼobodo anyị.’ Mgbe ha mesịrị nke a, aga m apụ.” Iwe were Mosis mgbe o si nʼụlọ Fero na-apụta.
  • Mosis tụpịara mbadamba nkume mgbe ọ hụrụ nwa oke ehi ahụỌpụ 32:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 32:19Mgbe Mosis bịaruru nso ebe ahụ ha mara ụlọ ikwu ha, hụ nwa oke ehi ahụ a kpụrụ akpụ na egwu a na-ete, iwe were ya nke ukwuu. Ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ o ji nʼaka. Kụrie ha na ndịda ugwu ahụ.
  • Mosis tiri nkume ahụ ugboro abụọỌnụ 20:10–11
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọnụ 20:10–11Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?” Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.
  • Belam tiri ịnyịnya ibu ya ihe, ọ wee kwuo okwuỌnụ 22:27–29
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọnụ 22:27–29Nʼihi nke a, mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị o dinara ala nʼokporoụzọ. Nʼoke iwe, Belam ji mkpara dị ya nʼaka tie ya ihe ọzọ. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka ịnyịnya ibu ahụ kwuo okwu. Ọ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị ka m mere gị i ji tie m ihe ugboro atọ?” Belam zara ịnyịnya ibu ahụ sị, “Ọ bụ nʼihi na i meela ka m dị ka onye nzuzu! Nʼezie, a sị na m ji mma agha nʼaka m, agaara m egbu gị.”
  • Balak kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe megide BelamỌnụ 24:10
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọnụ 24:10Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.
  • Gidiọn ji ọsịsa dị nro mee ka iwe ndị Ifrem dajụọNkp 8:1–3
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 8:1–3Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu. Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza? Chineke nyefere unu Oreb na Zeeb, ndị ndu Midia, nʼaka. Gịnị ka m rụpụtara a ga-eji tụnyere nke unu?” Okwu a mere ka ọnụma ha nʼebe ọ nọ dajụọ.
  • Iwe Eliab dị ọkụ megide Devid nwanne ya nta1Sa 17:28
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 17:28Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.”
  • Sọl tụrụ Jonatan nwa ya ube1Sa 20:30–34
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 20:30–34Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere? Nʼihi na ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ nʼụwa a, ọnọdụ gị na alaeze gị agaghị eguzosi ike. Ugbu a, pụọ, zipụ ozi kpọtara m ya ka m gbuo ya!” Jonatan jụrụ nna ya Sọl sị, “Gịnị ka o mere? Nʼihi gịnị ka a ga-eji mee ka ọ nwụọ?” Ma Sọl tụrụ ùbe o ji nʼaka ya ka o jiri ya tugbuo Jonatan, ma Jonatan zere ya. Nke a mere ka Jonatan mata nʼezie na nna ya na-achọ igbu Devid. Jonatan si na tebul ahụ bilie nʼoke iwe pụọ, o righịkwa nri nʼụbọchị nke abụọ nke mmemme ahụ, nʼihi na omume ihere nna ya mesoro Devid wutere ya hie nne.
  • Iwe were Devid mgbe Netan kọrọ akụkọ ọgaranya ahụ2Sa 12:5
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 12:5Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ!
  • Ehab, ihu gbarụrụ na iwe were ya, ajụ iri nri1Ez 21:4
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 21:4Ehab jiri obi ụfụ na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya nʼihi okwu a Nebọt, onye Jezril gwara ya, sị, “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m ha.” O dinara nʼihe ndina ya, chee ihu ya nʼaja ụlọ, jụ iri ihe ọbụla.
  • Neeman: ọ bụ na osimiri Damaskọs akaghị Jọdan mma?2Ez 5:11–12
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 5:11–12Ma Neeman were iwe nke ukwuu tụgharịa bido ịlaghachi ebe o si bịa. Mgbe ọ na-ala, ọ na-ekwu na-asị, “Echere m na ọ ga-apụkwute m, guzo, kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya, fufee aka ya nʼebe ahụ ọrịa m dị, gwọọ m ọrịa ekpenta m. Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ.
  • Asa tụnyere onye ọhụ ụzọ nʼụlọ mkpọrọ2Ih 16:10
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ih 16:10Iwe were Asa megide onye ọhụ ụzọ a nʼihi nke a; iwe were ya nke ukwuu nke mere na ọ tụnyere Hanani nʼụlọ mkpọrọ. Sitekwa nʼoge ahụ, Asa bidoro imekpa ụfọdụ nʼime ndị ya ahụ.
  • Ụzaya ji ihe ịgụ ọkụ nʼaka were iwe megide ndị nchụaja2Ih 26:19
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ih 26:19Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu.
  • Iwe were Sekses nke ukwuu mgbe eze nwanyị Vashti jụrụ ịbịaEst 1:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Est 1:12Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.
  • Oke iwe jupụtara Heman mgbe Mọdekai ajụ igbu ikpereEst 3:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Est 3:5Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na Mọdekai jụrụ igbu ikpere nʼihu ya, maọbụ ịsọpụrụ ya.
  • Iwe were Elihu megide Job na ndị enyi ya atọJob 32:2–3
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 32:2–3Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke. Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe.
  • Nebukadneza mere ka ọkụ ekwu dị ọkụ ugboro asaa karịaDan 3:13, Dan 3:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Dan 3:13Nebukadneza nʼọnọdụ oke iwe nyere iwu ka a kpọta Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, a kpọbatara ndị ikom a nʼihu eze,
    Dan 3:19Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri.
  • Jona banyere osisi kpọrọ nkụ: “ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ”Jona 4:1, Jona 4:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Jona 4:1Ma ihe a jọrọ Jona njọ nʼobi nke ukwuu, iwe ya dịkwa ọkụ.
    Jona 4:9Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?” Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.”
  • Oke iwe jupụtara Herọd mgbe ndị amamihe ahụ ghọgburu yaMat 2:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 2:16Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị.
  • Ndị nọ nʼụlọ ekpere Nazaret chọrọ ịtụpụ Jisọs site nʼelu ugwuLuk 4:28–29
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 4:28–29Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ.
  • Jisọs ji iwe lee ha anya nʼihi obi ha kpọrọ nkụMak 3:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 3:5O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma.
  • Ndị nnọkọ ụlọ ikpe, iwe were ha, tara Stivin ikikere ezeỌrụ 7:54–58
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 7:54–58Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu. Ha tara ikikere eze nʼiwe na nʼọnụma nʼebe ọ nọ. Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke. Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.” Ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsịaka ha rụchie ntị ha. Ha niile gbara ọsọ gaa nụkwasị ya, dọkpụrụ ya pụọ nʼazụ obodo malite ịtụ ya nkume. Nʼoge a, ndị akaebe wụsara uwe ha nʼụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl.
  • Pọl gwara onyeisi nchụaja: “gị mgbidi e tere nzu”Ọrụ 23:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 23:3Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?”

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.