Nyochaa › Isiokwu › Akwụkwọ ozi
Ndụ kwa ụbọchị
Akwụkwọ ozi nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (38), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Ndị eze na ndị ọchịchị
- Devid zigara Ụraya ka o buru akwụkwọ ozi nke nyere iwu ka e gbuo ya2Sa 11:14–15
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 11:14–15Nʼụtụtụ echi ya, Devid degaara Joab akwụkwọ, zighachịkwa ya site nʼaka Ụraya. Ihe ọ dere nʼakwụkwọ ahụ bụ nke a, “Tinye Ụraya nʼihu agha ebe ọgụ siri ike. Mgbe ndị iro na-apụkwute unu, laanụ azụ, ma hapụnụ Ụraya nʼihu ọgụ ka ndị iro gbuo ya.”
- Jezebel dere akwụkwọ ozi nʼaha Ehab, were akara ya kaa ha1Ez 21:8–11
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 21:8–11Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi. Nʼime akwụkwọ ozi ndị a, o dere sị, “Nyenụ iwu ka mmadụ niile buo ọnụ. Kpọkọtaanụ ndị Jezril niile, ka ha zukọta. Mgbe unu zukọrọ, nyenụ Nebọt ọnọdụ nʼoche dị mkpa. Họpụtanụ ndị ikom abụọ, ndị na-abaghị uru ka ha pụta nʼihu nzukọ unu guzo gbaa ama ụgha megide Nebọt sị na ha nụrụ mgbe ọ kọchara Chineke na eze. Maanụ ya ikpe ọnwụ, kpụpụ ya nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya, ka ọ nwụọ.” Ndị okenye na ndị a na-asọpụrụ ndị bi nʼobodo ahụ mere dịka Jezebel nyere nʼiwu nʼakwụkwọ ahụ o degaara ha.
- Eze Aram ziri Neeman ya na akwụkwọ ozi2Ez 5:5–7
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 5:5–7Eze Aram sịrị, “Bilie, gaa, aga m ezigakwara eze Izrel akwụkwọ ozi.” Ya mere Neeman gara, ọ chịịrị talenti ọlaọcha iri, na puku shekel ọlaedo isii, na uwe ọma dị iche iche, nke dị iri nʼọnụọgụgụ. Nke a bụkwa ihe dị nʼime akwụkwọ ahụ eze Aram degaara eze Izrel: “Nwoke a ji akwụkwọ a bịakwute gị bụ Neeman, onyeisi ndị agha m. Biko, achọrọ m ka ị gwọọ ya ọrịa ekpenta dị ya nʼahụ.” Ngwangwa eze Izrel gụrụ akwụkwọ ahụ, ọ dọwara uwe ya sị, “Abụ m Chineke? A pụrụ m ime ka mmadụ nwụọ na ime ka mmadụ dị ndụ? Gịnị mere nwoke a ji ezitere m onye m ga-agwọ ọrịa ekpenta? Lee ka o si na-achọ ụzọ anyị ga-eji nwee esemokwu.”
- Jehu degaara ndị na-elekọta ụmụ Ehab iri asaa akwụkwọ2Ez 10:1–7
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 10:1–7Ugbu a, e nwere ụmụ Ehab ndị ikom ọnụọgụgụ ha dị iri asaa ndị nọ na Sameria, Jehu dere akwụkwọ ozi ziga Sameria, zigara ndịisi obodo Jezril, zigakwara ndị okenye na ndị na-elekọta ụmụ Ehab ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ugbu a, mgbe akwụkwọ a rutere unu aka, ebe unu na ụmụ ndị ikom nna unu ukwu nọ, ebe unu nwekwara ụgbọ agha na ịnyịnya, na obodo e wusiri ike na ngwa agha, họpụtanụ onye kachasị inwe ugwu ma kwesikwa nʼime ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, mee ka ọ nọkwasị nʼocheeze nna ya. Mgbe ahụ, buo agha chebe ụlọ nna unu ukwu.” Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?” Ya mere, onye ọ dị nʼaka ilekọta ezinaụlọ eze, onyeisi obodo, ndị okenye na ndị niile na-elekọta ụmụ Ehab, dere akwụkwọ a zigara Jehu, sị ya, “Jehu, anyị niile bụ ndị ohu gị. Anyị jikeere ime ihe niile i gwara anyị. Anyị agaghị ahọpụta onye ọbụla dịka eze; gị onwe gị mee ihe ọbụla ị chere na ọ bụ ya kachasị mma.” Mgbe ahụ, Jehu degaara ha akwụkwọ nke ugboro abụọ sị ha, “Ọ bụrụ na unu dịnyeere m, ọ bụrụkwa na unu ga-erube isi nye m, chịrịnụ isi ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, bịakwute m nʼotu oge a echi na Jezril.” Nʼoge ahụ, ụmụ eze iri ndị ikom asaa nọ nʼaka ndịisi obodo ahụ, ndị na-azụlite ha. Mgbe akwụkwọ ozi ahụ rutere ha, ndị ikom ahụ kpọrọ ụmụ ndị ikom eze dị iri asaa nʼọnụọgụgụ gbuo ha niile, chịrị isi ha tinye na nkata zigara ya Jehu na Jezril.
- Hezekaya gbasara akwụkwọ ozi eze Asịrịa nʼihu Onyenwe anyị2Ez 19:14, Aịz 37:14
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 19:14Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.
Aịz 37:14Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.
- Eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi na onyinye2Ez 20:12, Aịz 39:1
Amaokwu ndị ahụ
2Ez 20:12Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa.
Aịz 39:1Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa ma nwe ahụ ike.
- Akwụkwọ ozi sitere nʼaka Ịlaịja ruru eze Jehoram aka2Ih 21:12
Amaokwu ndị ahụ
2Ih 21:12Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị: “Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda,
- Ndị ọgba ọsọ ozi buru akwụkwọ Hezekaya ji kpọọ oku maka Ngabiga gaa nʼIzrel niile2Ih 30:1, 2Ih 30:6
Amaokwu ndị ahụ
2Ih 30:1Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.
2Ih 30:6Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si: “Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị.
- Akwụkwọ ozi megide Jerusalem, e dere nʼasụsụ Aramaik, degara AtakseksesEzr 4:7–8, Ezr 4:11
Amaokwu ndị ahụ
Ezr 4:7–8Nʼụbọchị niile ahụ Ataksekses bụ eze ndị Peshịa, ka Bishlam, na Mitredat, na Tabeel, na ndị otu ya fọdụrụ degaara Ataksekses akwụkwọ. E dere akwụkwọ ozi ahụ nʼodide akwụkwọ ndị Aramaik, a sụgharịkwara ya nʼasụsụ Aramaik. Ndị ọzọ soro ha gbaa ajọ izu a bụ Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ. Ha deere Ataksekses akwụkwọ megide ndị Jerusalem sị ya:
Ezr 4:11Nke a bụ ihe ha dere nʼakwụkwọ ha zigaara Eze Ataksekses. Ọ bụ gị, eze ukwu Ataksekses, ka ndị ohu gị bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis na-edetara akwụkwọ a.
- Akwụkwọ ozi gọvanọ Tatenai degaara eze DaraiọsEzr 5:6–7
Amaokwu ndị ahụ
Ezr 5:6–7Nke a bụ akwụkwọ ozi Tatenai, onye na-achị ala dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ degara eze Daraiọs: Ha zigara ya akwụkwọ ozi, nke e si otu a dee, Daraiọs bụ eze nwe akwụkwọ a, Anyị ekelee gị.
- Nehemaya rịọrọ akwụkwọ ozi maka ụzọ dị nchebe na maka osisiNeh 2:7–9
Amaokwu ndị ahụ
Neh 2:7–9Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda. Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m. Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m.
- Sanbalat zitere Nehemaya akwụkwọ ozi e mechighị emechiNeh 6:5–7
Amaokwu ndị ahụ
Neh 6:5–7Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa. Nke a bụ ihe e dere nʼime ya; “Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha, na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.”
- Ndị ọgba ọsọ ozi buru akwụkwọ ozi Heman gaa na mpaghara ọbụlaEst 3:13
Amaokwu ndị ahụ
Est 3:13E zipụrụ ndị ọgba ọsọ ozi eze ka ha gaa nʼisi obodo ọbụla nʼalaeze ahụ, na-enye iwu a edere nʼakwụkwọ ka a laa nʼiyi, gbuo, ma kpochapụkwa ndị Juu niile, ma nwantakịrị ma okenye, ma nwanyị, ma ụmụntakịrị, nʼotu ụbọchị, nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada, nakwa ịpụnara ha akụnụba ha nʼike.
- Mọdekai ji ọlaaka eze kaa akwụkwọ ozi akara; ndị ozi gbara ịnyịnya dị ọsọEst 8:10
Amaokwu ndị ahụ
Est 8:10Mọdekai dere akwụkwọ ahụ nʼaha eze, bụ Ahasuerọs, werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, zipụ akwụkwọ ndị a site nʼaka ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu, bụ ndị na-agba ịnyịnya ụkwụ ọsọ nke e leziri anya nke ọma zụọ maka ije ozi dịrị eze.
- Akwụkwọ ozi Mọdekai banyere Purim nye ndị Juu nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anyaEst 9:20
Amaokwu ndị ahụ
Est 9:20Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya,
- Akwụkwọ ozi Jeremaya degaara ndị a dọtara nʼagha na BabilọnJer 29:1
Amaokwu ndị ahụ
Jer 29:1Ihe ndị a bụ ihe dị nʼakwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si Jerusalem degaara ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị okenye, na ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị Izrel Nebukadneza dọtara nʼagha si na Jerusalem bulaa ha Babilọn.
- Ọchịagha Klọdiọs Lisias degaara gọvanọ Feliks akwụkwọỌrụ 23:25–30
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 23:25–30O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a: Klọdiọs Lisias, Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a. Ana m ekele gị. Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya, ma mgbe m nụrụ na ọ bụ onye Rom, mụ na ndị agha m bịara napụta ya nʼaka ha. Achọrọ m ịmata ihe mere ha ji ebo ya ebubo, nʼihi ya eduuru m ya gaa nʼọgbakọ ndị okenye ha. Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere iwu ha. Nʼeziokwu, o nweghị ihe ọbụla kwesiri iji tụọ ya mkpọrọ maọbụ ọnwụ nʼime ebubo ahụ. Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha.
Nʼime nzukọ mbụ
- Luk dere akụkọ nʼusoro nye TiofilọsLuk 1:3, Ọrụ 1:1
- Sọl rịọrọ akwụkwọ ozi nye ụlọ nzukọ ndị Juu dị na DamaskọsỌrụ 9:2
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 9:2rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem.
- A gụrụ akwụkwọ ozi nke nzukọ Jerusalem na AntiọkỌrụ 15:23, Ọrụ 15:30
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 15:23Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a, Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia. Ekele.
Ọrụ 15:30Ya mere, e zipụrụ ha, ha jeruokwa Antiọk. Mgbe ha kpọkọrọ nzukọ ahụ, ha nyere ha akwụkwọ ozi ahụ.
- Ụmụnna ahụ dere akwụkwọ ka a nabata Apọlọs na AkaịaỌrụ 18:27
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 18:27Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ.
- Ndịisi ndị Juu na Rom: “Anyị anataghị akwụkwọ ozi ọbụla site na Judịa banyere gị”Ọrụ 28:21
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 28:21Ha sịrị, “Anyị anataghị akwụkwọ ozi ọbụla site na Judịa banyere gị. Ọ dịghịkwa ụmụnna anyị ọbụla nke si ebe ahụ bịa nke kọrọ maọbụ kwuo okwu ọjọọ ọbụla banyere gị.
- Tatiọs dere akwụkwọ ozi e degaara Ndị RomRom 16:22
Amaokwu ndị ahụ
Rom 16:22Mụ onwe m bụ Tatiọs, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nʼaha Onyenwe anyị.
- Pọl kwuru banyere akwụkwọ ozi mbụ o degaara Kọrint1Kọ 5:9
Amaokwu ndị ahụ
1Kọ 5:9E dere m unu nʼime akwụkwọ ozi m, ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọbụla.
- Akwụkwọ nkọwa iji too mmadụ2Kọ 3:1
Amaokwu ndị ahụ
2Kọ 3:1Anyị na-ebido ito onwe anyị ọzọ? Ọ dị a mkpa anyị inye unu, maọbụ ịnata nʼaka unu akwụkwọ nkọwa iji too onwe anyị dịka ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ si eme?
- “Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee … si gbaa okpotokpo”Gal 6:11
Amaokwu ndị ahụ
Gal 6:11Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo.
- Ekele Pọl ji aka ya dee bụ ihe e ji arịba akwụkwọ ozi ọbụla ama2Te 3:17
Amaokwu ndị ahụ
2Te 3:17Mụ onwe m bụ Pọl ji aka m depụta ekele a, nke m na-ekele unu niile. Nke a bụ ihe e ji arịba akwụkwọ niile m dere ama. Otu a ka m si ede ihe.
- Lezie anya nʼakwụkwọ ozi “e dere dị ka o sitere nʼaka anyị”2Te 2:2
Amaokwu ndị ahụ
2Te 2:2Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola.
- Kọlọsị na Laodisia ga-agbanwerịta akwụkwọ oziKọl 4:16
Amaokwu ndị ahụ
Kọl 4:16Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ dị na Laodisia. Gụọkwanụ nʼotu mgbe ahụ akwụkwọ nke si na Laodisia bịa.
- Pọl degaara Fịlịmọn akwụkwọ banyere OnisimọsFlm 1:1, Flm 1:10
- Pita: ụfọdụ ihe nʼakwụkwọ ozi Pọl siri ike ịghọta2Pt 3:16
Amaokwu ndị ahụ
2Pt 3:16O na-ede otu ihe ahụ nʼakwụkwọ ozi ya niile, na-ekwu ihe banyere ihe ndị a nʼime ha. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta nke ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe na-akọwa dịka ha si chepụta nʼobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere dịka ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ, si otu a wetara onwe ha ịla nʼiyi.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.