Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Nne na nna

Ndụ kwa ụbọchị

Nne na nna nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (42), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Ndị a kacha hụ nʼanya

  • Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya; Ribeka hụrụ Jekọb nʼanyaJen 25:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 25:28Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya.
  • Ribeka chepụtara ka Jekọb nweta ngọzi AịzikJen 27:6–10
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 27:6–10Ribeka gwara Jekọb nwa ya okwu sị ya, “Lee, anụrụ m ka nna gị na-agwa nwanne gị Ịsọ okwu sị ya, ‘Gaa nʼọhịa gbute anụ, siere m nri ụtọ, ka m nọdụ nʼihu Onyenwe anyị nye gị ngọzị ikpeazụ tupu m nwụọ.’ Ugbu a, nwa m nwoke, gee ntị nke ọma, mee ihe niile m gwara gị. Gaa ugbu a nʼigwe anụ ụlọ wetara m ụmụ nwa ewu abụọ dị mma ka m jiri ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị ahụ na-amasị ya. Ị ga-eburu ya bujere nna gị ka o rie, ka ya onwe ya gọzie gị tupu ọ nwụọ.”
  • Jekọb ekweghị izipụ Benjamin, nʼihi egwu ihe ọjọọJen 42:4, Jen 42:38
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 42:4Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin nwanne nta Josef soro ha gaa, nʼihi na ọ tụrụ egwu na ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị ya.
    Jen 42:38Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.”

Ịhụnanya na nlekọta

  • Hega nọdụrụ ebe dị anya, ihe ruru ebe àkụ ga-eru, nʼihi na ọ pụghị ilegide nwa ya ka ọ nwụọJen 21:15–16
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 21:15–16Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa. Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa.
  • Nne Ribeka na nwanne ya rịọrọ ka ọ nọnyere ha ụbọchị iri ọzọJen 24:55
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 24:55Ma Leban na nne ya zara sị ya, “Ka nwantakịrị nwanyị a nọnyere anyị ihe dịka ụbọchị iri tupu o soro gị laa.”
  • Jekọb nwetara ume mgbe ọ nụrụ na Josef dị ndụJen 45:26–28
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 45:26–28Ha gwara ya sị, “Josef ka nọ ndụ. Nʼezie, ọ bụ ya na-achị ala Ijipt niile.” Ma o siiri Jekọb ike ịnabata akụkọ a. O kwenyeghị na ọ bụ eziokwu. Ma mgbe ha gwasịrị ya ihe niile Josef gwara ha, mgbe ọ hụkwara ụgbọala niile Josef zitere ka e jiri bute ya, mmụọ nna ha Jekọb lọghachiri. Mgbe ahụ Izrel kwuru sị, “Ekwetala m! Josef nwa m ka dị ndụ. Aga m aga hụ ya anya tupu m nwụọ.”
  • Nne Mosis zoro ya ọnwa atọ, emesịa tinye ya nʼime nkataỌpụ 2:2–3
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 2:2–3Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ. Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto.
  • Manoa jụrụ otu ha ga-esi zụlite nwata a ga-amụNkp 13:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 13:8Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.”
  • Nne na nna Samsin megidere ịlụ nwanyị FilistiaNkp 14:2–3
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 14:2–3Mgbe ọ lọtara nʼụlọ, ọ gwara nne na nna ya, “Ahụrụ m otu nwanyị nʼime Timna sitere nʼụmụ ndị inyom Filistia; ugbu a, lụtara m ya na nwunye.” Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?” Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.”
  • Naomi suturu ndị nwunye ụmụ ya ọnụ, zilaga ha nʼụlọRut 1:8–9
    Amaokwu ndị ahụ
    Rut 1:8–9Mgbe ahụ, Naomi gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ okwu sị ha, “Ngwa, onye ọbụla nʼime unu laghachi nʼụlọ nne ya. Ka Onyenwe anyị gosi unu obiọma dịka unu si gosi mụ onwe m, na ndị unu nwụrụ anwụ. Ka Onyenwe anyị nyekwa unu di ọzọ ma meekwa ka unu chọta udo nʼezinaụlọ ọzọ.” Mgbe ahụ Naomi suturu ha ọnụ, ha niile kwara akwa.
  • Job na-ebili nʼisi ụtụtụ ịchụ aja nsure ọkụ maka nwa ya ọbụlaJob 1:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 1:5Mgbe oge mmemme ndị ahụ gwụsịrị, Job na-akpọkọta ụmụ ya doo ha nsọ. Nʼisi ụtụtụ ya, ọ na-achụ aja nsure ọkụ nʼihi onye ọbụla nʼetiti ụmụ ya. Echiche ya bụ, “Ma eleghị anya, ụmụ ya emehiela kọchaa Chineke nʼime obi ha.” Nke a bụ ihe Job na-eme mgbe niile.
  • Devid chọsiri ike ịgakwuru Absalọm2Sa 13:39
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 13:39Ọ gụrụ eze bụ Devid agụụ ịgakwuru Absalọm, nʼihi ọ kasịela obi maka ọnwụ Amnọn.
  • Devid: “nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ”2Sa 18:5
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 18:5Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm.
  • Rizpa chere ozu ụmụ ya nche site nʼebe nnụnụ na anụ ọhịa nọ2Sa 21:8, 2Sa 21:10
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 21:8Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola.
    2Sa 21:10Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha.
  • Ezi nne ahụ kwere ka e nye onye ọzọ nwa ya karịa ka e gbuo ya1Ez 3:26
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 3:26Nwanyị ahụ nwa ya dị ndụ jupụtara nʼọmịiko nʼebe nwa ya nọ, ọ gwara eze sị, “Biko, onyenwe m, kunye ya nwantakịrị ahụ dị ndụ. Egbukwala ya.” Ma onye nke ọzọ sịrị, “Kpọwaa ya abụọ. Nwa a agaghị abụ nke gị, ọ gaghị abụkwa nke m.”
  • Solomọn mere ka e weta ocheeze maka nne ya1Ez 2:19
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 2:19Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.
  • Meri na Josef ji nchekasị chọgharịa nwata JisọsLuk 2:48
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 2:48Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha nʼanya, ma nne ya sịrị ya, “Nwa m, gịnị mere i ji mesoo anyị mmeso dị otu a? Mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị?”
  • Nne Jisọs guzo nso nʼakụkụ obeJọn 19:25
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 19:25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs.
  • Jairọs rịọsiri ike maka nwa ya nwanyị ntaMak 5:23
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 5:23rịọsie ya arịrịọ ike sị, “Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ.”
  • Onye ọrụ ụlọeze: “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ”Jọn 4:49
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 4:49Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.”
  • Nna nwata: “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!”Mak 9:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 9:24Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!”
  • Nne ụmụ Zebedi rịọrọ ọnọdụ nsọpụrụ maka haMat 20:20–21
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 20:20–21Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya ndị ikom abụọ bịakwute ya, o gburu ikpere nʼala nʼihu ya, rịọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha. Ọ sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ zara ya sị, “Kwee m nkwa na ụmụ abụọ ndị a ga-anọdụ otu nʼaka nri gị, nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼalaeze gị.”
  • Nne na nna nwoke a mụrụ ìsì: “Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa”Jọn 9:20–23
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 9:20–23Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya. Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.” Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha. Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”

Ndị na-adịghị adọ aka na ntị

  • Elayị adọghị ụmụ ya aka na ntị1Sa 3:13
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 3:13Nʼihi na agwara m ya na m ga-ekpe ezinaụlọ ya ikpe, ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi mmehie ahụ ọ maara ihe banyere ya. Nʼihi na ụmụ ya mere onwe ha ndị a na-elelị anya, ma o meghị ihe ọbụla ịkwụsị ha.
  • Devid abaghị Adonaịja mba ọ bụladị otu ugboro1Ez 1:6
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 1:6Na ndụ Adonaịja niile, o nweghị oge nna ya baara ya mba site nʼịjụ ya, “Gịnị mere i ji akpa agwa dị otu a?” Ọ bụ nwokorobịa mara mma nke ukwuu; ọ bụ ya na-esotekwa nwanne ya Absalọm.

Nʼime Iwu

  • Sọpụrụ nne gị na nna gịỌpụ 20:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 20:12Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
  • Ọnwụ maka iti nna maọbụ nne ihe, maọbụ ịbụ ha ọnụỌpụ 21:15, Ọpụ 21:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 21:15“Ọ bụrụ na onye ọbụla etie nna ya maọbụ nne ya ihe, a ghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.
    Ọpụ 21:17“Aghaghị ime ka onye ọbụla ga-akpọ nna ya maọbụ nne ya iyi nwụọ.
  • Nne na nna na-akọwara ụmụ ha NgabigaỌpụ 12:26–27, Ọpụ 13:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 12:26–27Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’ Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’ ”
    Ọpụ 13:8Nʼoge ọbụla ị na-eme mmemme a, kọwaara nwa gị nwoke ihe kpatara i ji eme mmemme a, si ya, ‘Ana m eme mmemme a maka icheta ihe Onyenwe anyị meere m, mgbe m si nʼIjipt pụta.’
  • Nne na nna ya abụọ na-ebute nwa nwoke isiike, nnupu isi nʼihu ndị okenyeDit 21:18–20
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 21:18–20Ọ bụrụ na nwoke amụta nwa nwoke na-eme isiike, nke na-enupu isi, onye na-adịghị ege nna ya na nne ya ntị, ọ bụladị mgbe ha dọrọ ya aka na ntị. Nne ya na nna ya ga-eduru ya gaa nʼihu ndị okenye, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha. Ha ga-agwa ndị okenye obodo ahụ, “Nwa anyị nwoke a na-eme isiike, na-enupu isi, ọ dịghị ege ntị nʼolu anyị. Ọ bụ onye mmefu na onye na-aṅụbiga mmanya oke.”

Okwu nʼIlu banyere nne na nna

  • Gee ntị na ntụziaka nna gị na ndụmọdụ nne gịIlu 1:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 1:8Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
  • Nwa maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụIlu 10:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 10:1Ilu dị iche iche nke Solomọn: Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ; ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.
  • Ezi mmadụ na-ahapụrụ ụmụ ụmụ ya ihe nketaIlu 13:22
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 13:22Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.
  • Akpọla nne gị asị mgbe o mere agadiIlu 23:22
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 23:22Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
  • Ka nna gị na nne gị ṅụrịa ọṅụIlu 23:24–25
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 23:24–25Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe. Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
  • Ụmụ ya na-ebili gọzie yaIlu 31:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 31:28Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.

Nʼime akwụkwọ ozi

  • Nne na nna na-akpakọbara ụmụ ha akụ, ọ bụghị ụmụ maka nne na nna2Kọ 12:14
    Amaokwu ndị ahụ
    2Kọ 12:14Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Agaghị m abụrụ unu ibu arọ, ihe dị m mkpa abụghị akụ unu nwere, kama unu onwe unu. Ọ bụghị ụmụntakịrị ka ọ dịrị ịkpadoro nne na nna ha ihe, kama ọ bụ ọrụ dịrị nne na nna ịkpadoro ụmụ ha ihe.
  • Ndị bụ nna, akpasula ụmụ unu iweEfe 6:4, Kọl 3:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Efe 6:4Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
    Kọl 3:21Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.