Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ite egwu

Ndụ kwa ụbọchị

Ite egwu nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (21), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Miriam na ndị inyom ji ịgba tee egwu mgbe ha gafesịrị osimiriỌpụ 15:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 15:20Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu.
  • Mosis hụrụ nwa oke ehi ahụ na egwu a na-eteỌpụ 32:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 32:19Mgbe Mosis bịaruru nso ebe ahụ ha mara ụlọ ikwu ha, hụ nwa oke ehi ahụ a kpụrụ akpụ na egwu a na-ete, iwe were ya nke ukwuu. Ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ o ji nʼaka. Kụrie ha na ndịda ugwu ahụ.
  • Ada Jefta ji ite egwu pụta izute yaNkp 11:34
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 11:34Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ.
  • Ụmụ agbọghọ Shaịlo tere egwu na mmemme a na-eme kwa afọNkp 21:19–21
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 21:19–21Ma lee, e nwere mmemme Onyenwe anyị a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.” Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ, ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ Shaịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala Benjamin, ka ha bụrụ nwunye unu.
  • Ndị inyom tere egwu, bụọ abụ: “Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị agha”1Sa 18:6–7, 1Sa 21:11
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 18:6–7Mgbe ndị agha ahụ na-alọghachite, mgbe Devid gbusịrị onye Filistia ahụ, ndị inyom sitere nʼobodo niile nke Izrel pụta izute eze Sọl. Ha na-abụ abụ na-ete egwu ọṅụ, nke ha ji ụbọ akwara na ihe egwu ndị ọzọ na-eti. Dịka ha na-ete egwu, ha bụrụ abụ sị, “Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị agha ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị agha.”
    1Sa 21:11Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị: “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?”
  • Devid ji ike ya niile tee egwu nʼihu igbe ahụ2Sa 6:14–16
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 6:14–16Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ, mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu Onyenwe anyị, o ledara ya anya nʼime obi ya.
  • Mikal hụrụ eze Devid ka ọ na-ete egwu, leda ya anya1Ih 15:29
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ih 15:29Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal nwa Sọl, lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-ayọrị egwu na-aṅụrị ọṅụ, o ledara ya anya nʼime obi ya.
  • Ụmụntakịrị na-awụli elu na-ete egwu nʼụda ịgba na ụbọJob 21:11–12
    Amaokwu ndị ahụ
    Job 21:11–12Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ; ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu. Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara; ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja.
  • “I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu”Abụ 30:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 30:11I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.
  • Jiri ịgba na ite egwu too yaAbụ 149:3, Abụ 150:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 149:3Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.
    Abụ 150:4jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
  • Oge iru ụjụ na oge ite egwuEkl 3:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 3:4oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu,
  • “ite egwu ndị Mahanaim”Abụk 6:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụk 6:13Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ; laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya. Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?
  • Ụmụ agbọghọ na-aṅụrị ọṅụ na-ete egwu, ụmụ okorobịa na ndị agadi kwaJer 31:4, Jer 31:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Jer 31:4Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.
    Jer 31:13Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.
  • “ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ”Akw 5:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Akw 5:15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.
  • Ụmụntakịrị nʼọma ahịa: “Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu”Mat 11:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 11:17“ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu. Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu, ma unu akwaghị akwa.’
  • Egwu na ite egwu maka nwa nwoke ahụ lọtaraLuk 15:25
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 15:25“Ọ dịghị anya, nwa ya nke okenye, onye jere ịrụ ọrụ nʼubi, mgbe ọ na-abịaru ụlọ nso, ọ nụrụ ụda egwu na ịgba egwu.
  • Ada Herodịas tere egwu nʼoriri ncheta ọmụmụ HerọdMat 14:6–7, Mak 6:22
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 14:6–7Ma mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herodịas tere egwu nʼihu Herọd, na nʼihu ndị ọbịa bịara nʼụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu. Nke a mere o ji ṅụọ iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ.
    Mak 6:22Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.”

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.