Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Tebụl na nri

Ndụ kwa ụbọchị

Tebụl na nri nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (36), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Tebụl

  • Ihe ndina, tebụl, oche na oriọna nʼobere ọnụụlọ Ịlaisha2Ez 4:10
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 4:10Biko, ka anyị doziere ya otu ọnụụlọ nta nʼime ụlọ elu anyị, ka anyị tinyere ya ihe ndina na tebul, na oche, na oriọna, ka o nwee ebe ọ ga na-anọ mgbe ọbụla ọ bịakwutere anyị.”
  • Ndị eze iri asaa na-achịkọta iberibe nri nʼokpuru tebụl Adoni-BezekNkp 1:7
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 1:7Mgbe ahụ, Adoni-Bezek sịrị, “Iri ndị eze asaa ka m mesoro ụdị mmeso a unu mesoro m, ọ bụkwa nri si na tebul m dapụ ka ha riri. Ugbu a Chineke akwụghachila m ụgwọ ọrụ ọjọọ m.” Ha kpụụrụ ya gaa Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ.
  • Tebụl ụlọ nzute: osisi akashia e ji ọlaedo machie, nwere mkpara e ji ebu yaỌpụ 25:23–28
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọpụ 25:23–28“Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa. Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu. Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu. Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya. Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ. Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha.
  • Ogbe achịcha iri na abụọ, ahịrị abụọ, nʼelu tebụl ọlaedo kwa Ụbọchị IzuikeLev 24:5–8
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 24:5–8“Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla. Doo achịcha ndị a nʼahịrị abụọ nʼelu tebul ahụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị. Ogbe achịcha isii ga-adị nʼotu ahịrị. Nʼogologo ahịrị ọbụla tinye insensi a na-agwaghị ihe, ka ọ bụrụ ihe nọchiri achịcha ndị a dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. A ga-edo achịcha ndị a nʼihu Onyenwe anyị oge niile, ụbọchị izuike niile, nʼọnọdụ ụmụ Izrel, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi.
  • Tebụl ọlaedo na tebụl ọlaọcha maka ụlọnsọ1Ih 28:16
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ih 28:16Ọ wepụtara ọlaedo e ji akpụ tebul achịcha nsọ, na ọlaedo e ji akpụ tebul ndị ọzọ, na ọlaọcha e ji akpụ tebul ọlaọcha.
  • Jisọs kpughere tebụl ndị na-agbanwe egoJọn 2:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 2:15Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. Ọ kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu.
  • Ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebụl na-eri iberibe nri ụmụntakịrịMat 15:27, Mak 7:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 15:27Ọ zara sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebul rie iberibe nri nke na-esi nʼelu tebul ha daa nʼala.”
    Mak 7:28Ma ọ zaghachiri ya sị, “Onyenwe m, ma ụmụ nkịta na-erikwa iberibe nri ụmụntakịrị si na tebul tụpụ nʼala.”
  • Lazarọs na-agụ agụụ iberibe nri si na tebụl ọgaranya (ilu)Luk 16:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 16:21Ọ na-agụsị ya agụụ ike iri iberibe nri si na tebul ọgaranya ahụ daa nʼala. Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nʼahụ.
  • Ụmụ gị ndị ikom dị ka ome osisi oliv gburugburu tebụl gịAbụ 128:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Abụ 128:3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị.

Ịnọdụ ala na ịdabere

  • Ebraham guzoro nso ndị ọbịa ya nʼokpuru osisi mgbe ha na-eri nriJen 18:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 18:8Emesịa, Ebraham buuru mmiri ara ehi nke rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi, na anụ ahụ a kwadoro dozie ha nʼihu ndị ọbịa ahụ. O guzokwara nso nso ebe ha nọ nʼokpuru osisi ahụ mgbe ha na-eri nri.
  • Rut nọdụrụ nʼakụkụ ndị na-ewe ihe ubi nʼoge iri nriRut 2:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Rut 2:14Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.” Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ.
  • Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ebe eze nwanyị Esta dabereEst 7:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Est 7:8Mgbe eze sitere nʼubi a gbara ogige lọghachita nʼụlọ oriri ahụ, lee ka Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ahụ Esta na-adabere nʼelu ya. Eze sịrị, “Ọ chọrọ iwedakwa nwunye eze nʼala nʼihu m nʼụlọ m?” Ngwangwa okwu a si nʼọnụ eze pụta, ha kpuchiri Heman akwa nʼihu.
  • Jisọs na ndị iri na abụọ nọdụrụ na nriMat 26:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 26:20Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ.
  • Otu onye na-eso ụzọ dabere nʼakụkụ Jisọs, tụgharịa ịjụ ya ajụjụJọn 13:23–25
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 13:23–25Otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya dabere ya nso. Saimọn Pita fufeere ya isi, ka ọ, Jụọ ya onye ọ na-ekwu maka ya. Ebe ọ dabere Jisọs nso, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?”
  • Otu onye Farisii kpọrọ Jisọs oriri, ọ nọdụ na nriLuk 7:36
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 7:36Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri.
  • Mata na-eje ozi, Lazarọs na Jisọs nọdụ na nriJọn 12:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 12:2Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ.
  • Puku mmadụ ise nọdụrụ nʼelu ahịhịa nʼotu nʼotu, narị narị na iri ise iri iseMak 6:39–40, Luk 9:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 6:39–40Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ. Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ.
    Luk 9:14Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.”

Ndị riri nri ọnụ

  • Devid anọghị na tebụl Sọl; Jonatan ji iwe hapụ ya1Sa 20:29, 1Sa 20:34
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 20:29Ọ sịrị m, ‘Kwere ka m gaa nʼihi na ndị ezinaụlọ anyị nwere aja mmemme ha na-eme nʼobodo. Nwanne m nwoke nyere m iwu sị m na m aghaghị ịbịa. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼebe ị nọ, biko kwere ka m gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ nke a mere ọ bịaghị na tebul eze.”
    1Sa 20:34Jonatan si na tebul ahụ bilie nʼoke iwe pụọ, o righịkwa nri nʼụbọchị nke abụọ nke mmemme ahụ, nʼihi na omume ihere nna ya mesoro Devid wutere ya hie nne.
  • Ndị nlekọta na-ewetara ndị niile na-abịa tebụl Solomọn nri1Ez 4:27
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 4:27Nʼọnwa ọbụla, ndị ahụ a họpụtara ịchị Izrel na-ewetara eze Solomọn na ndị ụlọ ya ihe oriri. Ha adịghị ekwekwa ka otu ihe kọọ nʼụlọ ya.
  • Tebụl Solomọn na ọnọdụ ndị ozi ya tụrụ eze nwanyị Sheba nʼanya1Ez 10:4–5
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 10:4–5Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe niile nke Solomọn, hụkwa ụlọeze o wuru, na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ ya, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo.
  • Ọtụtụ ndị Juu na ndịisi na-eri nri na tebụl Nehemaya, tinyere ndị ọbịaNeh 5:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Neh 5:17Ma otu ọ dị, ndịisi Juu ọnụọgụgụ ha dị otu narị na iri na ise na-eri nri na tebul m, tinyere ndị na-abịakwute anyị site na mba ndị dị anyị gburugburu.
  • Jehoiakin na eze Babilọn rikọrọ nri ruo ọnwụ ya2Ez 25:29
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 25:29Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
  • Jisọs na ndị ọna ụtụ na ndị mmehie riri nri nʼụlọ MatiuMat 9:10–11, Mak 2:15–16, Luk 15:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 9:10–11Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri. Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”
    Mak 2:15–16Mgbe ọ na-eri nri uhuruchi nʼụlọ Livayị, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ, nʼihi na ndị na-esogharị ya dị ọtụtụ. Mgbe ndị ozizi iwu nke ndị Farisii hụrụ ya ka o so ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere o ji eso ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-erikọ nri?”
    Luk 15:2Ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie sorokwa ha na-eri nri.”
  • “onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri”Luk 22:21
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 22:21Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri.
  • Jisọs mgbe o sitere nʼọnwụ bilie: “Bịanụ rie nri ụtụtụ”Jọn 21:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Jọn 21:12Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị.
  • Ndị kwere ekwe mbụ na-erikọ nri nʼụlọ ha site nʼụlọ ruo nʼụlọỌrụ 2:46
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 2:46Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele.
  • Ndị iri na abụọ achọghị ịhapụ ikwusa ozi ka ha na-eke nriỌrụ 6:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 6:2Nʼihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ ọgbakọ ndị niile na-eso ụzọ ya sị, “O zighị ezi na anyị ga-ahapụ ikwusa oziọma Chineke bido na-eke nri.
  • A tara Pita ụta maka iso ndị a na-ebighị ugwu rie nriỌrụ 11:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 11:3na-asị, “Gịnị mere ị ji gakwuru ndị a na-ebighị ugwu soro ha rie ihe?”
  • Na Antiọk, Pita laghachiri azụ, ọ dịghịkwa eso ndị mba ọzọ rie nriGal 2:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Gal 2:12Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya.
  • Onye nche ụlọ mkpọrọ doziri Pọl na Saịlas nriỌrụ 16:34
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 16:34Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
  • Onye na-ekweghị ekwe kpọrọ gị oriri? Rie ihe ọbụla e doziri nʼihu gị1Kọ 10:27
    Amaokwu ndị ahụ
    1Kọ 10:27Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.