Ndụ kwa ụbọchị
Ụra nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (34), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Okwu
- Ọ na-enye ndị ọ hụrụ nʼanya ụraAbụ 127:2
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 127:2Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ na-adọgbu onwe gị nʼọrụ ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị, nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.
- “Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo”Abụ 4:8, Abụ 3:5
- Mgbe ị dinara ala, ụra gị ga-adị ụtọIlu 3:24
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 3:24Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.
- Onye ọrụ na-arahụ ụra nke ọma; ụba onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụraEkl 5:12
Amaokwu ndị ahụ
Ekl 5:12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, ma oke iriju afọ onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụra.
- Ahụla ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ogbenyeIlu 20:13
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 20:13Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.
- “Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta”Ilu 6:9–10, Ilu 24:33
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 6:9–10Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie? Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike,
Ilu 24:33Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike
- Umengwụ na-akpata oke ụraIlu 19:15
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 19:15Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.
- Onye na-eche Izrel nche adịghị atụ oru ụra, adịghịkwa arahụ ụraAbụ 121:4
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 121:4nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.
- Ịlaịja kwara ndị amụma Baal emo: ma eleghị anya ọ na-arahụ ụra1Ez 18:27
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 18:27Nʼihe dị ka nʼetiti ehihie, Ịlaịja malitere ịchị ha ọchị, na ịkwa ha emo. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Tisienụ mkpu ike ka Baal nwe ike ịnụ arịrịọ unu. Nʼezie, ọ bụ chi! Ma eleghị anya ọ nọ nʼoke echiche, maọbụ o ji ọrụ nʼaka, maọbụ ọ gara njem. Ma eleghị anya ọ na-arahụ ụra. Ọ chọrọ onye ga-akpọte ya.”
- Nkwa: ọ dịghị ụra tutu a chọtara Onyenwe anyị ebe obibiAbụ 132:3–5
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 132:3–5“Agaghị m abanye nʼime ụlọ m maọbụ rigoo nʼihe ndina m, agaghị m arahụ ụra, egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra, tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.”
Ihe atụ
- Adam dara nʼoke ụraJen 2:21
Amaokwu ndị ahụ
Jen 2:21Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya.
- Ebram dara nʼoke ụra mgbe anwụ na-adaJen 15:12
Amaokwu ndị ahụ
Jen 15:12Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya.
- Jekọb hinyere nkume nʼisi ya rahụ ụraJen 28:11
Amaokwu ndị ahụ
Jen 28:11Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra.
- Jekọb: oyi nʼabalị, ụra sikwa nʼanya m pụọJen 31:40
Amaokwu ndị ahụ
Jen 31:40Nʼime oke anwụ nke ehihie ka m rụụrụ gị ọrụ. Rụọkwara gị ọrụ nʼoge oyi na-atụ, nʼabalị ụra sikwa nʼanya m pụọ.
- Jael gburu Sisera mgbe ọ na-arahụ ụra nʼihi ike ọgwụgwụNkp 4:21
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 4:21Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ.
- Delaịla mere ka Samsin rahụ ụra nʼapata yaNkp 16:19
Amaokwu ndị ahụ
Nkp 16:19Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya.
- Boaz rahụrụ ụra nʼakụkụ ọka a tụkọtara; nʼetiti abalị ọ hụrụ RutRut 3:7–8
Amaokwu ndị ahụ
Rut 3:7–8Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya. Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.
- Devid weere ube na karama mmiri nʼakụkụ Sọl na-arahụ ụra1Sa 26:7, 1Sa 26:12
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 26:7Ya mere, nʼabalị, Devid na Abishai jiri nwayọọ jeruo ebe ndị agha Sọl mara ụlọ ikwu ha. Ha hụrụ Sọl ebe o dinara ala na-arahụ ụra. Ùbe ya ka ọ manyekwara nʼala nʼakụkụ ebe isi ya dị. Abna, na ndị agha ndị ọzọ dina gburugburu Sọl na-arahụ ụra.
1Sa 26:12Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ha daba nʼoke ụra.
- E gburu Ishboshet mgbe ọ na-ezu ike nʼehihie2Sa 4:5
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 4:5Nʼoge a, Rekab na Baana ụmụ Rimọn, onye Beerọt bịaruru nʼụlọ Ishboshet nʼoge ehihie, mgbe ọ nọ na-ezu ike.
- Ịlaịja rahụrụ ụra nʼokpuru osisi brum1Ez 19:5
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 19:5O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra. Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.”
- Sekses, ụra abịaghị ya nʼanya, mere ka a gụọrọ ya akwụkwọ ihe ncheta ezeEst 6:1
Amaokwu ndị ahụ
Est 6:1Nʼabalị ahụ, ụra abịaghị eze nʼanya ma ọlị. Nʼihi ya, o metụrụ ya nʼobi ịgụ akwụkwọ ihe ncheta. Ya mere, o nyere iwu ka e wetara ya akwụkwọ a na-edekọta ihe niile e mere nʼoge ọchịchị ya.
- Nrọ Nebukadneza: ụra pụrụ ya nʼanyaDan 2:1
Amaokwu ndị ahụ
Dan 2:1Nʼime afọ nke abụọ nke ọchịchị ya, eze Nebukadneza rọrọ nrọ dị iche iche. Nrọ ndị a mere ka obi ya gbasasịa, ụra pụkwara ya nʼanya.
- Daraiọs enweghị ike rahụ ụra mgbe Daniel nọ na ọdụmDan 6:18
Amaokwu ndị ahụ
Dan 6:18Mgbe eze lọbatara nʼụlọeze ya, o dinara nʼihe ndina ya buo ọnụ, onweghịkwa nri ebutere ya. Nʼabalị ahụ, o nweghị ike rahụ ụra.
- Jona rahụrụ ụra nʼime ụgbọ mgbe oke ifufe na-efeJona 1:5
Amaokwu ndị ahụ
Jona 1:5Mgbe ahụ, ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ ahụ tụrụ oke egwu, malite itiku chi ha. Ha malitekwara itufu ihe niile dị nʼụgbọ mmiri ahụ, ime ka ụgbọ ahụ dị mfe. Ma nʼoge ihe ndị a na-eme, Jona nọrịị nʼala ala ụgbọ mmiri ahụ ebe o dinara ala na-arahụ ụra.
- Jisọs rahụrụ ụra nʼelu ohiri isi nʼazụ ụgbọ mgbe oke ifufe na-efeMat 8:24, Mak 4:38, Luk 8:23
Amaokwu ndị ahụ
Mat 8:24Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme.
Mak 4:38Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?”
Luk 8:23ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.
- Ndị na-eso ụzọ rahụrụ ụra na GetsameniMat 26:40–43, Luk 22:45
Amaokwu ndị ahụ
Mat 26:40–43Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa? Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.” Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.” Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ.
Luk 22:45Mgbe o kpechara ekpere bilie, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya hụ ha ka ha na-arahụ ụra nʼihi ihe mwute nke obi.
- Pita rahụrụ ụra nʼụlọ mkpọrọ nʼetiti ndị agha abụọỌrụ 12:6
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 12:6Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche.
- Yutikọs tụrụ oru ụra mgbe Pọl na-ekwu okwu, si na windo daaỌrụ 20:9
Amaokwu ndị ahụ
Ọrụ 20:9Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.