Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Ụlọ

Ndụ kwa ụbọchị

Ụlọ nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (38), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

  • Ụlọ nkume, ogidi sida na ntuhie fịaEms 5:11, Abụk 1:17
    Amaokwu ndị ahụ
    Ems 5:11Unu na-azọpịa ndị ogbenye, na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha. Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa, ma unu agaghị ebi nʼime ha. Unu akụọla ubi vaịnị mara mma, ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.
    Abụk 1:17Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida, ntuhie ya bụkwa osisi fịa.
  • E ji ụrọ tee mgbidiLev 14:42, Dan 5:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 14:42A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.
    Dan 5:5Na mberede, ha hụrụ mkpịsịaka mmadụ ka ọ na-ede ihe nʼaja ụlọ nke ụlọeze ahụ ha nọ nʼime ya, na ncherita ihu ebe a dọbara iheọkụ. Eze nʼonwe ya hụrụ aka ahụ mgbe ọ na-ede ihe ahụ.
  • Ntọala nkume buru ibu, dị oke ọnụahịa, ogologo kubit iri na kubit asatọ1Ez 7:9–10
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 7:9–10E ji nkume dị mma ma dịkwa oke ọnụahịa nke a wara awa na nke a kwadoro nke ọma nʼime na nʼezi dịka ọtụtụ si dị, wuo ụlọ ndị a. Site na ezi ruo nʼogige ukwu ahụ ma sitekwa na ntọala ruo nʼelu ya. Nkume e ji tọọ ntọala ụlọ ndị a bụ nkume buru ibu, ndị dị ezi mma. Ụfọdụ nʼime nkume ndị a ruru mita anọ na ọkara nʼogologo, ndị ọzọ dị mita atọ na ụma isii.
  • Solomọn ji afọ iri na atọ wuo ụlọeze ya1Ez 7:1
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 7:1Solomọn ji afọ iri na atọ wuo ụlọ nke ya, bịa ruchakwaa ụlọ ya niile.
  • Devid bi nʼụlọ sida2Sa 7:2
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 7:2ọ sịrị Netan, bụ onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼime ụlọ ikwu.”
  • Ụlọ e ji osisi machieHeg 1:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Heg 1:4“Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?”
  • Ụlọ Rehab dị nʼime mgbidi obodoJos 2:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Jos 2:15Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ.
  • Nzukọ na-ezukọ nʼụlọ ndị kwere ekweỌrụ 12:12, Rom 16:5, Kọl 4:15, Flm 1:2
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 12:12Mgbe ọ ghọtara ihe merenụ, ọ gawara nʼụlọ Meri nne Jọn onye a na-akpọkwa Mak, ebe ọtụtụ mmadụ zukọtararị na-ekpe ekpere.
    Rom 16:5Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile.
    Kọl 4:15Keleerenụ m ụmụnna anyị bi na Laodisia na nwanna anyị Nimfas na chọọchị na-ezukọ nʼụlọ ya.
    Flm 1:2Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nʼụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipos onye anyị na ya so na-alụ agha a.

Elu ụlọ

  • Rehab zoro ndị nnyopụta nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼelu ụlọ yaJos 2:6
    Amaokwu ndị ahụ
    Jos 2:6(Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)
  • Samuel na Sọl kparịtara ụka nʼelu ụlọ, Sọl rahụkwa ụra nʼebe ahụ1Sa 9:25–26
    Amaokwu ndị ahụ
    1Sa 9:25–26Mgbe ha sitere nʼebe ahụ dị elu rịdata nʼobodo. Samuel kpanyere Sọl ụka nʼelu ụlọ ya. Nʼisi ụtụtụ mgbe ha biliri, Samuel kpọrọ Sọl nʼụlọ elu sị, “Jikere, ka m zilaga gị.” Mgbe Sọl kwadoro, ya na Samuel sooro pụọ nʼezi.
  • Devid jegharịrị nʼelu ụlọeze nʼuhuruchi2Sa 11:2
    Amaokwu ndị ahụ
    2Sa 11:2Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya.
  • E wuru ụlọ ahịhịa nʼelu ụlọ na nʼogige ụlọ maka mmemme ahụNeh 8:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Neh 8:16Ya mere, ndị ahụ pụrụ gaa weta alaka osisi, jiri ha wuore onwe ha ụlọ ahịhịa ha ga-ebi nwa mgbe nta nʼelu ụlọ ha, na nʼogige ụlọ nke aka ha, nakwa nʼogige ụlọ Chineke, na mbara ala Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, na nʼakụkụ Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem.
  • Ihe dị ka puku mmadụ atọ nọ nʼelu ụlọ arụsị ndị FilistiaNkp 16:27
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 16:27Nʼoge a, mmadụ ejupụtala nʼime ụlọ ahụ, nwoke na nwanyị; ndịisi ọchịchị ndị Filistia nọkwa nʼebe ahụ. Ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru puku atọ, nwoke na nwanyị, nọ nʼelu ụlọ ahụ na-ele Samsin, ebe ọ na-emere ha ihe ọchị.
  • Ndị enyi gwupuru elu ụlọ, budata nwoke ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụMak 2:4, Luk 5:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 2:4Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina.
    Luk 5:19Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs.
  • A ga-ekwusa nʼelu ụlọ ihe a gbara nʼizu nʼime ụlọLuk 12:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Luk 12:3Ihe ọbụla unu kwuru nʼọchịchịrị, a ga-anụ ya nʼihe, ihe ọbụla unu gbara nʼizu nʼime ụlọ ka a ga-ekwusa nʼelu ụlọ.

Ọnụụlọ, ọnụ ụzọ na oghereikuku

  • Eze Eglọn nọ naanị ya nʼọnụụlọ ya dị jụụ nʼelu ụlọNkp 3:20
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 3:20Ehud bịakwutere ya mgbe ọ nọ naanị ya nʼọnụụlọ dị nʼime nʼelu ụlọeze ya, sị, “Enwere m ozi Chineke sị m zie gị.” Dịka eze ahụ si nʼoche ya bilite ọtọ,
  • Ịlaịja nọrọ nʼụlọ elu nke ụlọ nwanyị di ya nwụrụ1Ez 17:19
    Amaokwu ndị ahụ
    1Ez 17:19Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya.
  • Nnukwu ụlọ elu, a kwadoro ya maka NgabigaMak 14:14–15
    Amaokwu ndị ahụ
    Mak 14:14–15Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga? Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.”
  • Josef banyere nʼime ụlọ ya ịkwa ákwáJen 43:30
    Amaokwu ndị ahụ
    Jen 43:30Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa.
  • Ahazaya si na mgbe ụlọ elu ya daa2Ez 1:2
    Amaokwu ndị ahụ
    2Ez 1:2Nʼoge a, Ahazaya sitere na mgbe ụlọ elu ya dị na Sameria daa, merụọ ahụ nke ukwuu. Nʼihi ọrịa a, o zigara ndị ozi, sị ha, “Gaa jụta ase nʼaka Baal-Zebub, bụ chi Ekrọn, ma m ga-adịrị site nʼihe mmerụ ahụ a.”
  • Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anyaNkp 5:28
    Amaokwu ndị ahụ
    Nkp 5:28“Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’
  • Yutikọs rahụrụ ụra nʼoghereikuku, si nʼụlọ elu nke atọ daaỌrụ 20:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Ọrụ 20:9Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ.

Nʼime Iwu

  • Ụlọ ọhụrụ chọrọ ihe mgbochi gburugburu elu yaDit 22:8
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 22:8Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara.
  • E dere okwu Iwu nʼelu ibo ọnụ ụzọ na ọnụ ụzọ amaDit 6:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 6:9Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.
  • Ntụpọ nʼụlọ: a na-adochi nkume, kpachaa mgbidi, tee ya ụrọ ọhụrụLev 14:40–45
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 14:40–45onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ. “Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya, onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe. Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
  • Ụlọ e rere nʼobodo nwere mgbidi, e nwere ike ịgbapụta ya nʼime otu afọLev 25:29–30
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 25:29–30“ ‘Onye ọbụla rere ụlọ obibi dị nʼobodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nwere ikike mgbapụta ya naanị mgbe otu afọ zuru site na mgbe e rere ya. Nʼoge ahụ ka onye rere ya nwere ike ịgbaghachi ya. Ọ bụrụ na a gbapụtaghị ya tupu otu afọ agafee, ụlọ ahụ dị nʼime obodo nwere mgbidi ga-abụ nke onye ahụ zụrụ ya mgbe niile, bụrụkwa nke ụmụ ụmụ ya. A gaghị enyeghachikwa ya mgbe afọ inwere onwe ruru.
  • Ụlọ nʼobodo nta na-enweghị mgbidi na-alaghachi nye ndị nwe ha nʼafọ JubiliLev 25:31
    Amaokwu ndị ahụ
    Lev 25:31Ma ụlọ ndị dị nʼobodo nta na-enweghị mgbidi a ga-agụ ha dịka ihe dị nʼọhịa. E nwere ike ịgbapụta ha, ha bụkwa nke a ga-eweghachite mgbe afọ inwere onwe ruru.
  • Nwoke nwere ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ, a na-ezilaga ya site nʼaghaDit 20:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Dit 20:5Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ga-esi otu a gwa ndị agha Izrel okwu sị ha, “O nwere onye ọbụla nʼime unu wuru ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ nye Onyenwe anyị? Ka onye dị otu a laghachi nʼụlọ ya. Ka onye ahụ ghara ịnwụ nʼagha hapụ ụlọ ya, ka nwoke ọzọ doo ya nsọ nye Onyenwe anyị!

Okwu

  • Nwoke maara ihe wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume (ilu)Mat 7:24–27, Luk 6:48
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 7:24–27“Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume. Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume. Ma ndị niile nụrụ okwu ndị a, ma lefuru ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nʼelu aja. Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala. Ọdịda ya dị ukwuu.”
    Luk 6:48Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ, onye gwumiri ala, doo ntọala ụlọ ahụ nʼelu oke nkume. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, o nweghị ike ime ka ọ maa jijiji nʼihi na e wusiri ya ike.
  • Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọIlu 24:3
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 24:3Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.
  • Nwanyị ọbụla maara ihe na-ewu ụlọ yaIlu 14:1
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 14:1Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.