Bible Explorer

Nyochaa › Isiokwu › Umengwụ

Ndụ kwa ụbọchị

Umengwụ nʼime Baịbụl

Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (26), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.

Okwu nʼIlu

  • Gaa nʼebe ndanda nọ, gị onye umengwụ: ọ na-achịkọta nri nʼoge okpomọkụIlu 6:6–8
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 6:6–8Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile. Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha, ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi.
  • Nwa ụra nta, ụbịam abịa dịka onye ohiIlu 6:9–11
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 6:9–11Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie? Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike, ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
  • Ubi onye umengwụ: ogwu, uke na mgbidi nkume dara adaIlu 24:30–34
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 24:30–34Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche, hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala. Elegharịrị m ya anya site na ya mụta otu ihe a: Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
  • Aka umengwụ na-eme ka mmadụ daa ogbenyeIlu 10:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 10:4Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
  • Onye na-arahụ ụra nʼoge owuwe ihe ubi bụ nwa na-eweta ihereIlu 10:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 10:5Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe, ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.
  • Dịka mmanya gbara ụka nye eze na anwụrụ ọkụ nye anyaIlu 10:26
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 10:26Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya; ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.
  • Umengwụ na-akwụsị nʼọrụ mmanyeIlu 12:24
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 12:24Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.
  • Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara nʼọkụIlu 12:27
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 12:27Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.
  • Onye umengwụ na-achọ ihe ma ọ dịghị ihe o nwereIlu 13:4, Ilu 21:25
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 13:4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
    Ilu 21:25Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.
  • Ụzọ onye umengwụ dị ka ogige ogwuIlu 15:19
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 15:19Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ, ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.
  • Onye umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne onye mbibiIlu 18:9
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 18:9Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.
  • Ọ na-amanye aka nʼefere, ma ọ gaghị eweghachi ya nʼọnụ yaIlu 19:24, Ilu 26:15
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 19:24Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.
    Ilu 26:15Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.
  • Ọ naghị akọ ubi nʼoge ya, ọ dịghị ihe ọ na-ahụ nʼoge owuwe ihe ubiIlu 20:4
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 20:4Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.
  • “Ọdụm nọ nʼezi!”Ilu 22:13, Ilu 26:13
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 22:13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi! A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”
    Ilu 26:13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ, ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”
  • Dịka ọnụ ụzọ si atụgharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si atụgharị nʼihe ndina yaIlu 26:14
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 26:14Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.
  • Nʼanya ya, ọ maara ihe karịa mmadụ asaa na-aza okwu nʼucheIlu 26:16
    Amaokwu ndị ahụ
    Ilu 26:16Nʼuche ya, onye umengwụ na-eche na ọ maara ihe karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.

Ebe ndị ọzọ

  • Nʼihi umengwụ, elu ụlọ na-ada, ụlọ na-ehie mmiriEkl 10:18
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 10:18Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri; ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.
  • Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapataEkl 4:5
    Amaokwu ndị ahụ
    Ekl 4:5Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.
  • A kpọrọ ohu liri talenti ya onye umengwụMat 25:26
    Amaokwu ndị ahụ
    Mat 25:26“Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị.
  • Ka ịnụ ọkụ nʼobi unu ghara ịdajụRom 12:11
    Amaokwu ndị ahụ
    Rom 12:11Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile.
  • “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri”2Te 3:10–12
    Amaokwu ndị ahụ
    2Te 3:10–12Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.” Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla. Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.
  • Ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ na-amụta ịnọ nkịtị, na-aga site nʼụlọ ruo nʼụlọ1Tm 5:13
    Amaokwu ndị ahụ
    1Tm 5:13Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu.
  • Unu abụla ndị umengwụHib 6:12
    Amaokwu ndị ahụ
    Hib 6:12Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa.

Isi mmalite

Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.