Ndụ kwa ụbọchị
Nri nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (38), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
Ihe ndị mmadụ na-eri
- Mmiri ara ewu maka ezinaụlọIlu 27:27
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 27:27Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.
- Mmiri ara rahụrụ arahụ, mmiri ara, abụba ụmụ atụrụ na ọka wiiti kachasị mmaDit 32:14
Amaokwu ndị ahụ
Dit 32:14na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ, na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba, na oke ebule Bashan dị ezi mma, tinyere ezi obi ọka wiiti. Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị.
- Chiizi iri maka onyeisi usuu ndị agha1Sa 17:17–18
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 17:17–18Otu ụbọchị, Jesi gwara Devid okwu sị, “Bịa ka i wegara ụmụnne gị otu akpa ọka ndị a e ghere eghe. Chịrịkwa ogbe achịcha iri ndị a chịlara ha. Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi, ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.”
- Ọka wiiti, ọka balị, akịdị, lentil, mmanụ aṅụ na chiizi maka ndị ikom Devid2Sa 17:28–29
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 17:28–29wetara ute e ji edina ala, na ite isi nri, na efere e ji eri nri bụ ọrụ onye ọkpụ ite. Tinyere ọka wiiti na ọka balị, ụtụ ọka na ọka a ṅara nʼọkụ, akịdị na lentil. O wetakwara mmanụ aṅụ, na bọta, atụrụ na chiizi nke sitere na mmiri ara ehi nye Devid na ndị so ya ka ha rie. Nʼihi na ha sịrị, “Ike agwụla ndị mmadụ, agụụ na-agụ ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, nʼime ọzara.”
- Ebraham nyere achịcha, nwa ehi dị nro, mmiri ara rahụrụ arahụ na mmiri araJen 18:5–8
Amaokwu ndị ahụ
Jen 18:5–8Ka m wetara unu nri ntakịrị unu ga-eri nke ga-agba unu ume tupu unu agawa nʼihu nʼije unu ugbu a unu bịara na nke ohu unu.” Ha zara sị ya, “Ọ dị mma. Mee dịka i kwuru.” Ya mere, Ebraham mere ngwangwa banyekwuru Sera nʼụlọ ikwu ya sị ya, “Mee ngwa, mapụta ihe ọtụtụ sịa atọ site na ọka a kwọrọ nke ọma jiri meta achịcha.” Mgbe ahụ, Ebraham gbagara nʼigwe ehi ya, họpụta otu nwa ehi na-akaghị aka nke ahụ ya dị mma, nye ya otu ohu ya onye mere ngwangwa gbuo ya, dozie ya maka oriri. Emesịa, Ebraham buuru mmiri ara ehi nke rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi, na anụ ahụ a kwadoro dozie ha nʼihu ndị ọbịa ahụ. O guzokwara nso nso ebe ha nọ nʼokpuru osisi ahụ mgbe ha na-eri nri.
- Rut sunyere achịcha nʼime mmanya viniga, rie ọka a ṅara nʼọkụRut 2:14
Amaokwu ndị ahụ
Rut 2:14Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.” Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ.
- Achịcha, achịcha nkwụ na achịcha mkpụrụ vaịnị a mịrị amị nye onye ọbụla2Sa 6:19
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 6:19O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya.
- Abigel wetara ogbe achịcha, mmanya, atụrụ, mkpụrụ vaịnị a mịrị amị na achịcha fiig1Sa 25:18
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 25:18Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu.
- Ziba wetaara Devid achịcha, mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na mkpụrụ osisi ndị ọzọ2Sa 16:1–2
Amaokwu ndị ahụ
2Sa 16:1–2Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya. Eze jụrụ Ziba sị, “Gịnị mere i ji bute ihe ndị a?” Ziba zara sị, “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ndị ụlọeze ga-anọkwasị. Achịcha na mkpụrụ osisi ndị a bụ nke ndị ikom gị ga-eri. Mmanya a bụ nke ndị na-ada mba nʼọzara ga-aṅụ.”
- Onye Ijipt agụụ na-egbu nwetara ike site nʼachịcha fiig na mkpụrụ vaịnị a mịrị amị1Sa 30:11–12
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 30:11–12Ha hụrụ otu nwokorobịa onye Ijipt nʼọhịa, duuru ya bịakwute Devid. Ha nyere ya mmiri ka ọ ṅụọ, nyekwa ya nri ka o rie. Ihe ha nyere ya bụ achịcha fiig, na ụyọkọ mkpụrụ vaịnị abụọ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Mgbe o richara ha, o nweghachiri onwe ya, nʼihi na o ribeghị nri ọbụla, maọbụ ṅụọ mmiri ọbụla ụbọchị atọ, ehihie na nʼabalị.
- Azụ, kukumba, melọn, liik, ayo na galiik nʼIjiptỌnụ 11:5
Amaokwu ndị ahụ
Ọnụ 11:5Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn, na liik, na ayo na galiik.
- Achịcha na ofe lentilJen 25:34
Amaokwu ndị ahụ
Jen 25:34Mgbe ahụ, Jekọb nyere Ịsọ achịcha na ofe lentil o siri. O riri, ṅụọkwa, bilie ọtọ pụọ. Ya mere Ịsọ ledara ọnọdụ ịbụ ọkpara nna ya anya.
- Mánà na-atọ ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ meeỌpụ 16:31
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 16:31Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee.
- Ọka a ṅara nʼọkụ nke ala ahụ; emesịa mánà kwụsịrịJos 5:11–12
Amaokwu ndị ahụ
Jos 5:11–12Nʼụbọchị sotere ụbọchị ngabiga, nʼotu ụbọchị ahụ, ha riri ụfọdụ ihe ubi nke ala Kenan. Ọ bụ achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na ọka ahụrụ nʼọkụ ka ha tara. Mánà kwụsịkwara nʼechi ya mgbe ha riri nri sitere nʼala ahụ. Ụmụ Izrel ahụkwaghị mánà anya ọzọ, ma nʼafọ ahụ ha riri ihe omume ubi si nʼala Kenan.
- Achịcha ọka wiiti, ọka balị, akịdị, lentil, milet na speltiIzk 4:9
Amaokwu ndị ahụ
Izk 4:9“Ma gị were ọka wiiti na ọka balị, werekwa akịdị na lentil, na ọka milet na spelti. Tinyekọta ha nʼotu ite were ha meere onwe gị achịcha. Nʼụbọchị ole ahụ niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị, narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọ bụ ya ka ị ga-eri.
- Daniel rịọrọ naanị ahịhịa nri na mmiriDan 1:12
Amaokwu ndị ahụ
Dan 1:12“Biko, nye anyị naanị ahịhịa nri, na mmiri ọṅụṅụ, ka ọ bụrụ ihe oriri anyị na ihe ọṅụṅụ anyị. Jiri ya lee anyị ule ụbọchị iri.
- Ugolọma na-ebutere Ịlaịja achịcha na anụ ụtụtụ na anyasị1Ez 17:6
Amaokwu ndị ahụ
1Ez 17:6Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.
- Jọn omee baptizim na-eri igurube na mmanụ aṅụ ọhịaMat 3:4
Amaokwu ndị ahụ
Mat 3:4Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
- Akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya ka ehi a zụziri azụzi mmaIlu 15:17
Amaokwu ndị ahụ
Ilu 15:17Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya, karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.
- Nwa nwoke rịọrọ achịcha maọbụ azụMat 7:9–10
Amaokwu ndị ahụ
Mat 7:9–10“Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute? Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ?
- Azụ na achịcha nʼelu ọkụ icheku nʼakụkụ osimiriJọn 21:9
Amaokwu ndị ahụ
Jọn 21:9Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha.
- Jisọs, mgbe o sitere nʼọnwụ bilie, riri otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọLuk 24:42
Amaokwu ndị ahụ
Luk 24:42Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ.
Na tebụl nri
- Ribeka ji ụmụ ewu abụọ sie nri dị ụtọJen 27:9
Amaokwu ndị ahụ
Jen 27:9Gaa ugbu a nʼigwe anụ ụlọ wetara m ụmụ nwa ewu abụọ dị mma ka m jiri ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị ahụ na-amasị ya.
- Ndị inyom na-arụ ọrụ dịka ndị na-esi nri na ndị na-eme achịcha1Sa 8:13, Ilu 31:15
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 8:13Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị inyom mee ka ha bụrụ ndị na-esiri ya mmanụ otite na-esi isi ụtọ, na ndị na-esiri ya nri, na ndị na-eghere ya ihe oghịghe.
Ilu 31:15Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
- Ndị Ijipt anaghị eso ndị Hibru rie nriJen 43:32
Amaokwu ndị ahụ
Jen 43:32Ha doziiri ya nri nke ya iche, doziekwara ụmụnne ya nri nke ha iche. Otu a kwa, ha dozikwaara ndị Ijipt ya na ha na-erikọ nri, nri nke ha iche. Nʼihi na ọ bụ ihe arụ nʼanya ndị Ijipt na ha na ndị Hibru ga-erikọta nri ọnụ.
- Ekele tupu a nyawaa achịchaMak 8:6, Luk 24:30, Ọrụ 27:35
Amaokwu ndị ahụ
Mak 8:6Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ.
Luk 24:30Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha.
Ọrụ 27:35Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya.
- Abụ a bụrụ mgbe nri anyasị ikpeazụ gasịrịMat 26:30
Amaokwu ndị ahụ
Mat 26:30Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
Ihe a machibidoro iri
- Anụmanụ nọ nʼala: naanị ndị ụkwụ ha wara njakpa ma na-atagharị ọnụLev 11:3–4
Amaokwu ndị ahụ
Lev 11:3–4Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa. nke na-atagharị ọnụ. “ ‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.
- Ihe dị ndụ nọ na mmiri: naanị ndị nwere ntu na akpịrịkpaLev 11:9–10
Amaokwu ndị ahụ
Lev 11:9–10“ ‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha. Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ.
- Ugo, udele na nnụnụ ndị ọzọ a kpọrọ aha, a gaghị eri haLev 11:13
Amaokwu ndị ahụ
Lev 11:13“ ‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii,
- Igurube na ụmụ ahụhụ ndị ọzọ na-awụ awụ, a pụrụ iri haLev 11:21–22
Amaokwu ndị ahụ
Lev 11:21–22Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala, ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche.
- A na-awụfu ọbara, were aja kpuchie yaLev 17:13–14
Amaokwu ndị ahụ
Lev 17:13–14“ ‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya. Nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara. Ọ bụ ya mere m ji nye ụmụ Izrel iwu si unu erila ọbara anụmanụ ọbụla, nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara ya. Nʼihi ya onye ọbụla riri ọbara, a ga-ekewapụ ya site nʼetiti ndị m.
- Erila anụ nke anụ ọhịa dọgburu nʼọhịaỌpụ 22:31
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 22:31“Unu ga na-abụrụ m ndị dị nsọ. Nʼihi nke a, wezuganụ onwe unu nʼebe anụ a dọgburu adọgbu dị. Unu erikwala anụ dị otu a, kama tụpụrụnụ ya nkịta.
- Esila nwa ewu nʼime mmiri ara nne yaỌpụ 23:19, Dit 14:21
Amaokwu ndị ahụ
Ọpụ 23:19“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.
Dit 14:21Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ. Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.