Nyochaa › Isiokwu › Ịchụ nta na isi ọnya
Ndụ kwa ụbọchị
Ịchụ nta na isi ọnya nʼime Baịbụl
Akụkụ nke Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (14), ahịrị na ahịrị, site na Nave’s Topical Bible.
- Nimrọd, “dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị”Jen 10:9
Amaokwu ndị ahụ
Jen 10:9Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”
- Ishmel tolitere nʼọzara, ghọọ onye na-agba àkụ nke ọmaJen 21:20
Amaokwu ndị ahụ
Jen 21:20Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma.
- Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye ọhịaJen 25:27
Amaokwu ndị ahụ
Jen 25:27Ha abụọ toro, Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye na-epiogharị nʼọhịa, ebe Jekọb bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anọ nʼetiti ụlọ ikwu.
- Anụ ọhịa na-atọ Aịzik ụtọ, ọ hụrụ Ịsọ nʼanyaJen 25:28
Amaokwu ndị ahụ
Jen 25:28Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya.
- Aịzik zipụrụ Ịsọ ka o were akpa àkụ na ụta gaa chụta anụJen 27:3–5
Amaokwu ndị ahụ
Jen 27:3–5Ya mere, were ihe ịchụ nta gị, ụta gị na àkụ gị, gaa nʼọhịa, gbutere m anụ. Siere m nri ụtọ otu ahụ o si amasị m, butere m ya ka m rie, ka mụ onwe m gọzie gị tupu m nwụọ.” Ma Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik na-agwa nwa ya Ịsọ okwu. Nke mere na mgbe Ịsọ gawara nʼọhịa ịchụ nta,
- Ịsọ si nʼịchụ nta lọta mgbe oge ngọzi gafereJen 27:30–33
Amaokwu ndị ahụ
Jen 27:30–33Mgbe Aịzik gọzichara Jekọb, ka Jekọb si nʼihu ya na-apụ, lee Ịsọ ka o si ịchụ nta na-alọbata. Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.” Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?” Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.” Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.”
Nʼime Iwu
Ọnya na ụgbụ
- Ụgbụ, ọnya, ihe nkechi na ụdọ ọnya a zoro nʼalaJob 18:8–10
Amaokwu ndị ahụ
Job 18:8–10Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya; ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere. Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya, ọnya ahụ na-ejidesi ya ike. E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala, ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.
- Mgbada ọnya maraAịz 51:20
Amaokwu ndị ahụ
Aịz 51:20Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.
- Ndị na-esiri nnụnụ ọnya na-eche nche, na-esi ọnyaJer 5:26
Amaokwu ndị ahụ
Jer 5:26“E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m, ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya, dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.
- Ụdọ ụgbụ a gbasara nʼakụkụ ụzọ, na ọnya e siriAbụ 140:5
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 140:5Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela
Ntụnyere
- Devid: dịka onye dinta na-achọgharị ọkwa nʼelu ugwu1Sa 26:20
Amaokwu ndị ahụ
1Sa 26:20Ugbu a, ekwela ka ọbara m bụrụ ihe a wufuru nʼala dị anya, na-abụghị nʼihu Onyenwe anyị. Eze Izrel apụtala ịchọ akpị dịka m, otu dinta si achọgharị ọkwa nʼelu ugwu.”
- “na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ”Akw 3:52
Amaokwu ndị ahụ
Akw 3:52Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
- A napụtara “site nʼọnya nke onye osi ọnya”Abụ 91:3
Amaokwu ndị ahụ
Abụ 91:3Nʼezie, ọ ga-anapụta gị site nʼọnya nke onye osi ọnya na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.
Isi mmalite
Site na Nave’s Topical Bible (Orville J. Nave, 1896; ihe onwunwe ọha): a họọrọ isiokwu, mee ka ahịrị dị mkpụmkpụ ma tinye ha nʼokwu nke oge a, hapụ ahịrị nkọwa; e lelere amaokwu ọ bụla.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.