Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 63

IGCB · Isi 63 / 150

Abụ Ọma 63

1Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.

2Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị.

3Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.

4Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.

5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.

6Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.

7Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.

8Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m.

9A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.

10A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi, ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.

11Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke; ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya, ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org