IGCB · Isi 133 / 150
Abụ Ọma 133
1Abụ nrigo, nke Devid. Lee ka o si bụrụ ihe dị mma na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!
2Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ, e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn, ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.
3Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn. Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya, ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org