IGCB · Isi 131 / 150
Abụ Ọma 131
1Abụ nrigo, nke Devid. O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m, ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m; adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
2Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ; dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ, e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.
3Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org