IGCB · Isi 25 / 150
Abụ Ọma 25
1Abụ Ọma Devid. Ọ bụ na gị Onyenwe anyị ka m tụkwasịrị obi m.
2O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m.
3Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.
4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile.
5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị.
6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.
7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.
9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.
10Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.
11Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.
12Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.
13Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.
14Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.
15Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.
16Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.
17Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute.
18Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile.
19Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị.
20Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ
21Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.
22O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org