Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 134

IGCB · Isi 134 / 150

Abụ Ọma 134

1Abụ nrigo. Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị.

2Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya ma toonu Onyenwe anyị.

3Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa site na Zayọn gọzie unu.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org