Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 28

IGCB · Isi 28 / 150

Abụ Ọma 28

1Abụ Ọma Devid. Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku; gị bụ Oke nkume m, agbala m nkịtị. Ọ bụrụ na ị jụ ịza m, aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.

2Nụrụ arịrịọ m maka ebere dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, mgbe m chịlịri aka m abụọ elu nʼEbe gị Kachasị Nsọ.

3Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ, tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe, ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo, ma ha bu iro nʼime obi ha.

4Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha na omume ha kwesiri; kwụghachi ha maka ihe aka ha mere, ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.

5Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ, ọ ga-akwada ha nʼala, ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.

6Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.

7Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m; ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka. Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ, aga m ejikwa abụ m na-eto ya.

8Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya, ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ.

9Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị; buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org