IGCB · Isi 27 / 150
Abụ Ọma 27
1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
2Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.
3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
5Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
6Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. Meere m ebere, zaa m.
8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
9Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m.
10Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, Onyenwe anyị ga-anabata m.
11Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị; duo m nʼụzọ kwesiri nʼihi ndị na-akpagbu m.
12Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.
13Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ.
14Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org