Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 87

IGCB · Isi 87 / 150

Abụ Ọma 87

1Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ. Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;

2Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb.

3Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; Sela

4“Aga m agụnye Rehab na Babilọn, dịka ndị na-asọpụrụ m, aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush, aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ”

5Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.”

6Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn.”

7Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org