Bible Explorer

Baịbụl › Abụ Ọma › 144

IGCB · Isi 144 / 150

Abụ Ọma 144

1Abụ Ọma nke Devid. Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m, onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.

2Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.

3O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?

4Mmadụ dị ka otu nkuume; ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.

5O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata; metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.

6Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile; gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha.

7Site nʼelu setịpụ aka gị; gbapụta m, napụtakwa m site nʼoke osimiri, site nʼaka ndị si mba ọzọ,

8ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.

9O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;

10gị onye na-enye ndị eze mmeri, onye na-agbapụta ohu ya Devid. Site na mma agha dị njọ

11gbapụta m; napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.

12Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha, ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma, ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị e ji achọ ụlọeze mma.

13Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri dị iche iche si nʼubi anyị. Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ, ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị;

14igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ. A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile, a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ, akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.

15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị; ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org