IGCB · Isi 59 / 150
Abụ Ọma 59
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Devid. Abụ miktam nke eji olu abụ “E bibikwala,” abụ. Mgbe Sọl zipụrụ ndị ikom ka e chee ụlọ Devid nche nʼihi igbu ya. O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m, chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m.
2Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe, zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ.
3Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m.
4Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m. Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m!
5Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gị onye bụ Chineke nke Izrel, kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela
6Nʼanyasị, ha na-alaghachi, na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
7Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta, okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha, ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?”
8Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị; ị na-akwa mba ndị a niile emo.
9O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike.
10Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị.
11O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa, wedakwaa ha nʼala.
12Ka e jide ha nʼime nganga ha, nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, na nʼihi okwu ọnụ ha. Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha,
13jiri iwe ọkụ repịa ha, repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, na Chineke na-achị Jekọb.
14Nʼanyasị ha na-alaghachi; na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta, mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
15Ha na-awagharị na-achọ nri, na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha.
16Ma aga m abụ abụ banyere ike gị, nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị; ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
17O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-adabere.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org