IGCB · Isi 60 / 150
Abụ Ọma 60
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu. O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike; i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.
2I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya; mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.
3I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.
4Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela
5Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
7Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
8Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
9Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
10Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
11Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
12Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org