IGCB · Isi 2 / 150
Abụ Ọma 2
1Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
2Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.
3Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.”
4Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị. Onyenwe anyị na-akwa ha emo.
5Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya.
6“Mụ onwe m eguzobela m eze m na Zayọn, ugwu m dị nsọ.”
7Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị: Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m; taa abụrụla m nna gị.
8Rịọọ m, aga m enye gị mba niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe nketa gị.
9Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha, tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.”
10Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche; ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa.
11Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe; jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
12Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya, ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu. Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya. Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org